ISI NKE 60
Alaeze Nke Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi
E nwere otu abalị Eze Nebukadneza rọrọ nrọ na-atụ ụjọ. Nrọ ahụ mere ka obi ghara izu ya ike, o nweghịkwa ike ihi ụra. Ọ kpọrọ ndị na-emere ya anwansi, gwa ha, sị: ‘Kọwaaranụ m nrọ m rọrọ.’ Ha gwara ya, sị: ‘Eze, kọọrọ anyị ihe ị rọrọ ná nrọ.’ Ma, Nebukadneza sịrị ha: ‘Mba. Ọ bụ unu ga-akọrọ m ihe m rọrọ ná nrọ, ma ọ́ bụghị ya, m ga-egbu unu.’ Ha gwara ya ọzọ, sị: ‘Kọọrọ anyị ihe ị rọrọ ná nrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.’ Eze gwara ha, sị: ‘Unu niile na-achọ ịghọ m aghụghọ. Kọọrọnụ m ihe m rọrọ ná nrọ.’ Ha gwara eze, sị: ‘E nweghị onye dị ndụ nwere ike ịkọwara gị nrọ gị. E nweghị onye ga-emeli ihe a ị na-asị anyị mee.’
Nebukadneza were nnukwu iwe nke na o nyere iwu ka e gbuo ndị niile ma ihe. Ọ pụtara na a ga-egbukwa Daniel, Shedrak, Mishak, na Abednego. Daniel gwara eze ka o nyetụ ha oge. Ya na ndị enyi ya kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere ha aka. Gịnị ka Jehova mere?
Jehova si n’ọhụụ gosi Daniel ihe Nebukadneza rọrọ ná nrọ ma kọwaara ya ihe ọ pụtara. N’echi ya, Daniel gwara onye na-ejere eze ozi, sị: ‘Egbula onye ọ bụla n’ime ndị ma ihe. M ga-akọwara eze ihe ọ rọrọ ná nrọ.’ Ọ kpọọrọ Daniel gakwuru Nebukadneza. Daniel gwara eze, sị: ‘Chineke emeela ka ị mara ihe ga-eme n’ọdịnihu. Lekwa ihe ị rọrọ ná nrọ: Ị hụrụ otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ. E ji ọlaedo kpụọ isi ya, jiri ọlaọcha kpụọ obi ya na aka ya, jiri ọla kọpa kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya, jiri ígwè kpụọ ụkwụ ya, jirikwa ígwè na ụrọ kpụọ ala ala ụkwụ ya. E si n’otu ugwu wapụta otu nkume, ya akụọ n’ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ. Nkume a gweriri ihe ahụ a kpụrụ akpụ, ya
adịzie ka ntụ, ifufe efesasịa ya. Nkume ahụ ghọrọ nnukwu ugwu, gbasaakwa n’ebe niile n’ụwa.’Daniel gwaziri eze, sị: ‘Lekwa ihe nrọ gị pụtara: Ọ bụ alaeze gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ. Ọlaọcha ahụ bụ alaeze ga-achị ma ị chịchaa. A ga-enwekwa alaeze ọzọ ga-adị ka ọla kọpa, ọ ga-achịkwa ụwa niile. Alaeze ọzọ nke ga-achị ma nke ahụ chịchaa ga-esi ike ka ígwè. N’ikpeazụ, a ga-enwe alaeze nke ga-ekewa ekewa. Ọ ga-esi ike n’ebe ụfọdụ ka ígwè, gharakwa isi ike n’ebe ụfọdụ ka ụrọ. Nkume ahụ ghọrọ ugwu bụ Alaeze Chineke. Alaeze a ga-ebibi alaeze ndị a niile ma dịrị ruo mgbe ebighị ebi.’
Nebukadneza gburu ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala n’ihu Daniel. Ọ gwara Daniel, sị: ‘Ọ bụ Chineke gị mere ka ị mara nrọ a. O nweghị Chi dị ka ya.’ Nebukadneza egbughịzi Daniel. Kama, o mere ya onyeisi ndị niile ma ihe na onye na-achị ógbè niile dị na Babịlọn. Ị̀ hụla otú Jehova si zaa ekpere Daniel?
“Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn n’asụsụ Hibru.”—Mkpughe 16:16