IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Igbo
Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016052/univ/art/1102016052_univ_sqr_xl.jpg
lfb ihe ọmụmụ 42

ISI NKE 42

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Ọkpara Eze Sọl aha ya bụ Jonatan bụ dike n’agha. Devid kwuru na Jonatan na-efe ọsọ karịa ugo, dịkwa ike karịa ọdụm. Otu ụbọchị, Jonatan hụrụ ndị agha Filistia n’ugwu. Ha dị mmadụ iri abụọ. Ọ gwara onye na-eburu ya ngwá agha, sị: ‘Anyị ga-alụso ha agha ma ọ bụrụ na Jehova egosi anyị ihe àmà. Ọ bụrụ na ha asị anyị bịawa, anyị ga-amata na anyị kwesịrị ịlụso ha agha.’ Ndị agha Filistia tiri mkpu, sị: “Bịanụ lụso anyị agha.” N’ihi ya, Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha gbagooro n’ugwu lụso ha agha ma merie ha.

Jonatan gaara abụ eze ma nna ya nwụọ ebe ọ bụ ya bụ ọkpara. Ma, Jonatan ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel. N’agbanyeghị ya, o nwereghị ya anyaụfụ. Devid na Jonatan ghọrọ ezigbo enyi. Ha kwere ibe ha nkwa na ha ga na-enyere ibe ha aka ma na-agbachitere ibe ha. Jonatan nyere Devid uwe elu ya, mma agha ya, ụta ya, na ájị̀ ya iji gosi na ha abụrụla enyi.

Mgbe Devid na-agba ọsọ ka Sọl ghara igbu ya, Jonatan gakwuuru ya ma sị ya: ‘Dị ike ma nwee obi ike. Jehova ahọrọla gị ịbụ eze. Nna m makwa gbasara ya.’ Ị̀ ga-achọ inwe ezigbo enyi na-akpa àgwà ka Jonatan?

E nwere ihe karịrị otu ugboro Jonatan gaara anwụ maka na ọ chọrọ inyere Devid aka. Ọ ma na Eze Sọl nna ya chọrọ igbu Devid, n’ihi ya, ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na i gbuo Devid, i meela ihe ọjọọ n’ihi na o nweghị ihe o mere gị.’ Ihe a Jonatan kwuru were Sọl ezigbo iwe. Mgbe afọ ole na ole gachara, Sọl na Jonatan nwụrụ n’agha.

Mgbe Jonatan nwụrụ, Devid chọwara nwa Jonatan aha ya bụ Mefiboshet. Mgbe ọ chọtara ya, ọ gwara ya, sị: ‘M ga-elekọta gị ná ndụ gị niile n’ihi na nna gị bụ ezigbo enyi m mgbe ọ dị ndụ. Ị ga-ebi n’obí m, na-erikwa nri na tebụl m.’ Devid echefughị enyi ya Jonatan.

“Hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya. E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ ya maka ndị enyi ya.” ​—Jọn 15:12, 13