ISI NKE 46
A Matara Chi Nke Bụ́ Ezigbo Chi
E nwere ọtụtụ ndị eze ọjọọ chịrị alaeze Izrel dị ebo iri. Ma, Ehab so ná ndị eze kacha njọ chịrị ya. Ọ lụrụ nwaanyị ọjọọ na-efe Bel. Aha ya bụ Jezibel. Ehab na Jezibel mere ka ọtụtụ ndị Izrel fewe Bel, gbuokwa ọtụtụ ndị amụma Jehova. Gịnị ka Jehova mere? O zigara Ịlaịja onye amụma ka ọ gaa zie Ehab ozi.
Ịlaịja gwara Eze Ehab na mmiri agaghị ezo n’Izrel n’ihi ihe ọjọọ ọ na-eme. Ọkọchị kọrọ ihe karịrị afọ atọ, ihe ndị a kụrụ n’ubi emeghịkwa. Ihe a mere ka agụụ na-agụgbu ndị mmadụ. Jehova mechara ziga Ịlaịja ka ọ gaa hụ Ehab ọzọ. Eze Ehab agwa ya, sị: ‘Ị bụ onye nsogbu. Ọ bụ gị kpataara anyị nsogbu niile a.’ Ịlaịja asị ya: ‘Ọ bụghị m mere ka mmiri ghara izo. Ọ bụ gịnwa n’ihi na ị na-efe Bel. Anyị ga-amata Chi nke bụ́ ezigbo Chi. Gwa ndị Izrel na ndị amụma Bel ka ha bịa n’Ugwu Kamel.’
Mgbe mmadụ niile zukọrọ n’ugwu ahụ, Ịlaịja gwara ha, sị: ‘Kpebienụ onye unu ga-efe. Ọ bụrụ na Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya. Ọ bụrụkwanụ Bel, sowenụ ya. Anyị ga-eji ihe a mata Chi nke bụ́ ezigbo Chi. Ka ndị amụma Bel dị narị anọ na iri ise (450) kwadebe ihe ha ga-eji achụ àjà ma kpọkuo chi ha, mụnwa ga-akwadebekwa ihe m ga-eji achụ àjà ma kpọkuo Jehova. Chi nke ga-eji ọkụ repịa àjà ahụ, ọ bụ ya bụ ezigbo Chi.’ Ha niile kwetara ihe a o kwuru.
Ndị amụma Bel kwadebere ihe ha ga-eji achụrụ chi ha àjà. Ha si n’ụtụtụ kpọgide chi ha ruo n’ehihie, na-arịọ ya, sị: “Bel, za anyị!” Ebe ọ bụ na Bel azaghị ha, Ịlaịja jizi ha mewe ihe ọchị. Ọ sịrị ha: ‘Kpọsienụ ya ike. O nwere ike ọ na-ehi ụra, nke na e kwesịrị ịkpọte ya.’ Ndị amụma Bel kpọgidere ya ruo ná mgbede, ma ọ zaghị ha.
Ịlaịja dokwasịrị ihe o ji achụ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ya ma gbajuo ya mmiri. O kpeziri ekpere, sị: ‘Jehova, biko, mee ka ndị a mara na ọ bụ gị bụ ezi Chineke.’ Ozugbo ahụ, Jehova mere ka ọkụ si n’eluigwe bịa repịa àjà ya. Ndị
ahụ tiri mkpu, sị: “Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke!” Ịlaịja sịrị ha: ‘Unu ekwela ka ndị amụma Bel gbapụ!’ E gburu ndị amụma Bel dị narị anọ na iri ise (450) n’ụbọchị ahụ.Mgbe Ịlaịja hụrụ obere ígwé ojii si n’oké osimiri na-apụta, ọ gwara Ehab, sị: ‘Nnukwu mmiri na-aga izo. Kwadebe ụgbọ ịnyịnya gị, lawakwa.’ Eluigwe gbachiri, ifufe efewe, nnukwu mmiri amalitekwa izo. N’ikpeazụ, ọkọchị ahụ kwụsịrị. Ehab gbasiwere ịnyịnya ya ike. Ma, Jehova nyere Ịlaịja ike, ya agbara ọsọ gbafere ya. Ma, nsogbu Ịlaịja niile ọ̀ gwụla? Ka anyị chọpụta.
“Ka ndị mmadụ mara na aha gị bụ Jehova nakwa na ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18