Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 7
Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Eze Sọl na Eze Devid. Ihe ndị a kọrọ gbasara ha were ihe dị ka afọ iri asatọ. Mgbe Sọl ghọrọ eze, ọ dị umeala n’obi ma na-atụ egwu Chineke. Ma obere oge, ọ gbanwere, kwụsị ịna-erubere Jehova isi. Ihe a mere ka Jehova jụ ya. Ka oge na-aga, Jehova gwara Samuel ka o tee Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel. Sọl nweere Devid anyaụfụ ma gbaa mbọ ọtụtụ ugboro ka o gbuo ya. Ma, Devid emegwaraghị ya. Jonatan nwa Sọl ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ chịwa ndị Izrel. Ọ bụ ya mere o ji kwado Devid. Devid mere mmehie ndị jọgburu onwe ha, ma ọ nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-erubere Chineke isi.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 39
Eze Mbụ Chịrị Izrel
Chineke nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha. Ma, ha chọrọ eze ga na-achị ha. Samuel tere Sọl mmanụ ịbụ eze mbụ ha, ma Jehova mechara jụ Sọl. N’ihi gịnị?
ISI NKE 40
Devid na Golayat
Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị Izrel. Devid gosikwara ihe mere o ji kwesị ịbụ eze.