ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

Ben-hedad eze Siria nọgidere na-alụso ndị Izrel agha. Ma, mgbe ọ bụla ọ biawara ọgụ, Ịlaịsha onye amụma na-agwa eze Izrel. Ihe a na-eme ka ọ ghara inweta eze Izrel. N’ihi ya, Ben-hedad kpebiri na ọ ga-anwụde Ịlaịsha. Mgbe ọ chọpụtara na Ịlaịsha nọ n’obodo Dotan, o zigara ndị agha Siria ebe ahụ ka ha jide ya.

Ndị agha Siria bịara Dotan n’abalị. Mgbe chi bọrọ, onye na-ejere Ịlaịsha ozi pụtara n’èzí hụ ìgwè ndị agha gbara obodo ha gburugburu. Ezigbo ụjọ tụrụ ya, ya etie mkpu, sị: ‘Nna m ukwu, gịnị ka anyị ga-eme?’ Ịlaịsha gwara ya, sị: “Ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.” Ozugbo Ịlaịsha gwachara ya ihe a, Jehova mere ka onye na-ejere Ịlaịsha ozi hụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha ndị na-acha ọkụ ọkụ bụ́ ndị juru n’ugwu ndị gbara obodo ahụ gburugburu.

Mgbe ndị agha ahụ chọrọ ijide Ịlaịsha, o kpere ekpere, sị: ‘Jehova, biko mee ka ha kpuo ìsì.’ Ozugbo Ịlaịsha kpechara ekpere a, ndị agha ahụ amaghịzi ebe ha nọ n’agbanyeghị na ha ka na-ahụ ụzọ. Ịlaịsha gwara ha, sị: ‘Obodo a abụghị ebe unu na-aga. Soronụ m ka m duru unu gakwuru nwoke unu na-achọ.’ Ha sooro Ịlaịsha gaa Sameria, ebe eze Izrel bi.

Ndị agha ahụ mechara mata na ha nọzi na Sameria. Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaịsha, sị: “Ọ̀ bụ m gbuo ha?” ḷlaịsha ò ji ohere a sị ka e gbuo ndị a chọrọ igbu ya? Mba. Ịlaịsha sịrị: ‘Egbula ha. Nye ha nri ma hapụ ha ka ha laa.’ N’ihi ya, eze meere ha nnukwu oriri ma hapụ ha ka ha laa.

“Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.”​—1 Jọn 5:14