Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 56

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya ghọrọ eze Juda mgbe ọ dị afọ asatọ. N’oge ahụ, ndị obodo ya na-eme anwansi, na-efekwa arụsị. Mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ gbalịrị mụta otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, o bidoro ibibi arụsị na ebe niile a na-achụrụ arụsị àjà n’obodo ha. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na isii, ọ malitere ịrụzigharị ụlọ nsọ Jehova.

Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Hilkaya hụrụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. O nwere ike ịbụ Mozis dere akwụkwọ mpịakọta ahụ. Shefan bụ́ odeakwụkwọ eze wegaara Josaya akwụkwọ mpịakọta ahụ ma malite ịgụrụ ya ihe ndị dị na ya. Ihe Josaya nụrụ mere ka ọ mata na ndị obodo ya na-enupụrụ Jehova isi kemgbe ọtụtụ afọ. Eze Josaya gwara Hilkaya, sị: ‘Obi adịghị Jehova mma n’ebe anyị nọ. Gaa jụọ Jehova ihe anyị ga-eme. Jehova ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme.’ Jehova si n’ọnụ Họlda onye amụma nwaanyị gwa ha, sị: ‘Ndị Juda ahapụla m. Ha ga-ata ahụhụ maka inupụrụ m isi. Ma, ọ gaghị abụ n’oge Josaya dị ndụ n’ihi na o wedara onwe ya ala.’

Mgbe Eze Josaya nụrụ ihe a, ọ gara n’ụlọ nsọ ma kpọkọta ndị Juda niile. Ọ gụpụtaara ha Iwu Jehova. Josaya na ndị obodo ya kwere Jehova nkwa na ha ga-eji obi ha niile rubere ya isi.

O ruola ọtụtụ afọ ndị Juda na-emebeghị Ememme Ngabiga. Ma, mgbe Josaya gụtara n’Iwu ahụ na e kwesịrị ịna-eme ya n’afọ ọ bụla, ọ gwara ndị obodo ya, sị: ‘Anyị ga-emere Jehova Ememme Ngabiga.’ Josaya haziri ka a chụọrọ Jehova àjà, haziekwa ka e nwee ndị na-abụ abụ n’ụlọ nsọ. Ndị Juda niile meziri Ememme Ngabiga na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ruo ụbọchị asaa. Malite n’oge Samuel, e nwetụbeghị mgbe e mere ụdị Ememme Ngabiga a Josaya na ndị obodo ya mere. Josaya ejighị Iwu Chineke gwuo egwu. Ịmụ banyere Jehova ọ̀ na-atọ gị ụtọ?

“Okwu gị bụ oriọna nke na-enye ụkwụ m ìhè, bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105