ISI NKE 63
Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá
Ka oge na-aga, Belshaza ghọrọ eze Babịlọn. N’otu abalị, ọ kpọrọ otu puku (1,000) mmadụ bụ́ ndị ọnụ na-eru n’okwu na Babịlọn oriri. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha chịpụta iko ọlaedo ndị Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ Jehova. Belshaza na ndị ahụ ọ kpọrọ oriri malitere iji iko ndị ahụ na-aṅụ mmanya ma na-eto chi ha. Na mberede, ha hụrụ aka mmadụ nke malitere ide ihe n’ahụ́ ájá. E nweghịkwa onye nwere ike ịgụta ihe aka ahụ na-ede.
Ezigbo ụjọ bịara Belshaza, ya akpọọ ndị anwansi ya ma kwe ha nkwa, sị: ‘Onye ọ bụla ga-akọwara m ihe ihe ndị a e dere pụtara, m ga-eme ya onye nke atọ na-achị Babịlọn.’ Ha gbalịrị ka ha kọwaa ya, ma o nweghị onye n’ime ha nwere ike ịkọwa ya. Nne Belshaza batara ma gwaa ya, sị: ‘E nwere otu nwoke aha ya bụ Daniel, onye na-akọwara Nebukadneza nrọ ya. Ọ ga-akọwali ihe ndị a e dere.’
Daniel bịara n’ihu eze Belshaza, ya agwa ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe ndị a e dere ma kọwaa ha, m ga-enye gị ihe olu ọlaedo, meekwa gị onye nke atọ na-achị Babịlọn.’ Daniel sịrị ya: ‘Achọghị m onyinye gị, ma m ga-akọwara gị ihe okwu ndị a pụtara. Nebukadneza nna gị buliri onwe ya elu, ma Jehova wedara ya ala. Ị ma ihe niile mere ya. Ma, ị kparịrị Jehova, gaa were iko ọlaedo si n’ụlọ nsọ ya na-aṅụ mmanya. Ọ bụ ya mere Chineke ji dee okwu ndị a: Mini, Mini, Tikel, na Pasịn. Ihe okwu ndị a pụtara bụ na ndị Midia na ndị Peshia ga-emeri Babịlọn, ị gaghịzi abụ eze.’
Otú obodo Babịlọn dị mere ka o yie ka e nweghị onye ga-emerili ya. Nnukwu mmiri na nnukwu mgbidi gbara ya gburugburu. Ma, n’abalị ahụ Belshaza kpọrọ oriri ahụ, ndị Midia na ndị Peshia bịara lụso ha agha.
Saịrọs, Eze Peshia mere ka mmiri ahụ gbara Babịlọn gburugburu sọrọ gawa ebe ọzọ ka ndị agha ya nwee ike iji ụkwụ ruo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. Mgbe ha ruru, ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ mepere emepe. Ndị agha ahụ banyere n’ime obodo ahụ, merie ha, gbuokwa eze ha. Saịrọs maliteziri ịchị Babịlọn.Mgbe Saịrọs chịrị ihe dị ka otu afọ, o kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ka m rụghachi ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. Onye ọ bụla n’ime ndị ya chọrọ ịga nye aka rụghachi ya, nwere ike ịga.’ N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu laghachiri Jeruselem mgbe afọ iri asaa e bibiri Jeruselem gachara, otú Jehova kwere ná nkwa. Saịrọs chịghachiri iko ọlaedo na ọlaọcha na ihe ndị ọzọ Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ Chineke. Ị̀ hụrụ otú Jehova si jiri Saịrọs napụta ndị Juu?
“Babịlọn Ukwu ahụ adaala! Ọ daala! Ọ ghọọla ebe ndị mmụọ ọjọọ bi.”—Mkpughe 18:2