Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 2
Gịnị mere Jehova ji mee ka e nwee iju mmiri nke bibiri ndị ajọ omume n’oge ochie? Obere oge e kechara mmadụ, ọ bịara dị mkpa ka ha kpebie ma hà ga-eme ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị mma. Ụfọdụ ndị, dị ka Adam na Iv, na nwa ha Ken, họọrọ ime ihe na-adịghị mma. Mmadụ ole na ole, dị ka Ebel na Noa, họọrọ ime ihe dị mma. Ọtụtụ ndị malitere ime ihe ọjọọ nke na Jehova bibiri ndị niile na-eme ihe ọjọọ n’oge ahụ. Nkebi a ga-eme ka anyị mata na Jehova na-ahụ ma ànyị na-eme ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị mma. Ọ ga-emekwa ka anyị mata na e nweghị mgbe Jehova ga-ekwe ka ihe ọjọọ merie ihe ọma.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 3
Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi
Gịnị mere otu osisi dị n’ogige Iden ji pụọ iche? Gịnị mere Iv ji rie mkpụrụ ya?
ISI NKE 4
O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
Chineke nabatara àjà Ebel chụụrụ ya ma jụ nke Ken. Mgbe Ken hụrụ na Chineke jụrụ àjà ya, o were ezigbo iwe ma mee ihe jọgburu onwe ya.
ISI NKE 5
Ụgbọ Noa
Ndị mmụọ ozi ndị mere ihe ọjọọ lụrụ nwaanyị, mụọ ụmụ gbara ajọ dimkpa. Tigbuo zọgbuo bịara ju n’ụwa. Ma, Noa dị iche. Ọ hụrụ Jehova n’anya, na-erubekwara ya isi.
ISI NKE 6
Chineke Chebere Mmadụ Asatọ
Mmiri ahụ e ji bibie ụwa zoro ụbọchị iri anọ ehihie na abalị. Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Chineke mechara gwa ha pụta.

