ISI NKE 8
Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi
E nwere otu obodo a na-akpọ Ọọ. Ọ dị nso na Babel. Ndị bi n’obodo Ọọ anaghị efe Jehova, kama ha nwere ọtụtụ chi ha na-efe. Ma, e nwere otu nwoke bi n’obodo Ọọ nke na-efe Jehova. Aha ya bụ Ebreham.
Otu ụbọchị, Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.’ Chineke kwekwara ya nkwa, sị: ‘M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba, m ga-emere ọtụtụ mmadụ n’ụwa niile ihe ọma n’ihi gị.’
Ebreham amaghị ebe Jehova sịrị ya gaa, ma ọ tụkwasịrị Jehova obi. N’ihi ya, Ebreham na nwunye ya Sera, nna ya Tira, na Lọt, nwa nwanne ya mere ihe Jehova kwuru. Ha buuru ihe ha malite ogologo njem ahụ.
N’ihi ya, oleekwanụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa a?
Ebreham dị afọ iri asaa na ise mgbe ya na ndị ezinụlọ ya kwagara n’obodo ahụ Jehova chọrọ ka ha gaa. Aha obodo ahụ bụ Kenan. Ọ bụ n’obodo a ka Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-enye ụmụ gị ala a niile ị na-ahụ.’ Ma, Ebreham na Sera emeela agadi, ha amụtaghịkwa nwa ọ bụla.“Ọ bụ okwukwe mere Ebreham ji rube isi . . . wee gaa n’ebe Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ya. Ọ gawara, n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.” —Ndị Hibru 11:8