ISI NKE 61
Ha Akpọghị Isiala
Obere oge Nebukadneza rọchara nrọ nnukwu ihe ahụ a kpụrụ akpụ, o ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe. Ọ kwụwara ya na mbara ala Dura ma kpọọ ndị niile a ma ama n’obodo ya ka ha bịakọta n’ihu ihe ahụ ọ kpụrụ. Shedrak, Mishak, na Abednego sokwa na ndị ọ kpọrọ. Eze nyere iwu, sị: ‘Ozugbo unu nụrụ ụda opi, ụbọ akwara, na nnukwu ọjà, daanụ n’ala kpọọrọ ihe a m kpụrụ isiala. A ga-atụba onye ọ bụla na-adaghị n’ala kpọọ isiala ná nnukwu ọkụ a kwanyere.’ Ndị Hibru atọ a hà ga-akpọrọ ihe ahụ a kpụrụ akpụ isiala, ka hà ga na-efe naanị Jehova?
Eze gwaziri ndị na-akụ egwú ka ha kụwa egwú. Mgbe ndị niile nọ ebe ahụ nụrụ ụda egwú, ha dara n’ala kpọọrọ ihe ahụ isiala. Ma, Shedrak, Mishak, na Abednego akpọrọghị ihe ahụ isiala. Ụfọdụ n’ime ndị nọ ebe ahụ hụrụ ha ma gwa eze, sị: ‘Ndị Hibru atọ ahụ akpọrọghị ihe ahụ ị kpụrụ isiala.’ Nebukadneza nyere iwu ka a kpọta ha. Mgbe ha rutere, ọ sịrị ha: ‘M ga-enye unu ohere ọzọ ka unu kpọọrọ ihe a m kpụrụ isiala. Unu jụ, m ga-atụba unu n’ọkụ ahụ a kwanyere. E nweghị chi ga-anapụtali unu n’aka m.’ Ha gwara ya, sị: ‘Ọ baghị uru inyewe anyị ohere ọzọ. Chineke anyị ga-anapụtali anyị. Ma, ọ bụrụ na ọ napụtaghị anyị, eze, mara amara, na anyị agaghị akpọrọ ihe a ị kpụrụ isiala.’
Ezigbo iwe were Nebukadneza. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: ‘Meenụ ka ọkụ ahụ dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ dịbu.’ Ọ gwaziri ndị agha
ya, sị: ‘Keenụ ha agbụ ma tụba ha n’ime ọkụ.’ Ọkụ ahụ bịara dị ezigbo ọkụ nke na mgbe ndị agha ahụ bịara nso ka ha tụba ha n’ọkụ ahụ, ọkụ regburu ha ozugbo, ndị Hibru atọ ahụ adaba n’ime ọkụ ahụ. Ma, mgbe Nebukadneza lere anya n’ime ọkụ ahụ, ọ hụziri ụmụ nwoke anọ ka ha na-agagharị n’ime ya kama ịhụ ụmụ nwoke atọ. Ụjọ jidere ya, ya ajụọ ndị na-ejere ya ozi, sị: ‘Ọ́ bụghị ụmụ nwoke atọ ka anyị tụbara n’ọkụ? M na-ahụ ụmụ nwoke anọ, otu n’ime ha yikwara mmụọ ozi.’Nebukadneza gara nso n’ebe ahụ a kwanyere ọkụ, jiri olu dara ụda gwa ha, sị: ‘Pụtanụ, unu ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu!’ O juru onye ọ bụla nọ ebe ahụ anya ịhụ ka Shedrak, Mishak, na Abednego si n’ọkụ ahụ pụta n’enweghị ihe mere ha. Ọkụ ahụ ereghị ha n’ahụ́, o reghị ntutu isi ha, ma ọ bụ uwe ha. Ha esighịkwa anwụrụ ọkụ anwụrụ ọkụ.
Nebukadneza kwuziri, sị: ‘Chineke Shedrak, Mishak, na Abednego dị ukwuu. O zitere mmụọ ozi ya ma napụta ha. E nweghị chi dị ka Chi ha.’
Ị̀ ga na-erubere Jehova isi otú ndị Hibru atọ ahụ mere, ihe ọ sọkwara ya mee?
“Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.”—Matiu 4:10