IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Mmehie Eze Devid Mere

Igbo
Mmehie Eze Devid Mere
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016053/univ/art/1102016053_univ_sqr_xl.jpg
lfb ihe ọmụmụ 43

ISI NKE 43

Mmehie Eze Devid Mere

Mmehie Eze Devid Mere

Mgbe Sọl nwụrụ, Devid ghọrọ eze. Devid dị afọ iri atọ mgbe ahụ. Afọ ole na ole ọ chịwara, ọ nọ n’ụlọ elu ya n’abalị hụ otu nwaanyị mara mma. Devid chọpụtara na aha ya bụ Bat-shiba, nakwa na ọ bụ nwunye onye agha aha ya bụ Yuraya. Devid ziri ozi ka Bat-shiba bịa n’obí ya. Mgbe ọ bịara, ha kwara iko, Bat-shiba atụrụ ime. Devid gbalịrị izo ihe a o mere. Ọ gwara onyeisi ndị agha ya ka o ziga Yuraya n’ihu agha, ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ ma hapụ ya ebe ahụ laa azụ. E gburu Yuraya, Devid alụwazie Bat-shiba.

Ma Jehova hụrụ ihe ọjọọ a niile merenụ. Gịnị ka ọ ga-eme? Jehova ziri otu onye amụma aha ya bụ Netan ka ọ gaa hụ Devid. Netan gwara Devid, sị: ‘E nwere otu ọgaranya nwere ọtụtụ atụrụ, nweekwa otu ogbenye nwere naanị obere atụrụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọgaranya ahụ weere otu obere atụrụ ahụ ogbenye ahụ nwere.’ Mgbe Netan gwachara ya ihe a, Devid were iwe ma sị: ‘Ọgaranya ahụ kwesịrị ịnwụ.’ Netan gwaziri Devid, sị: ‘Ọ bụ gị bụ ọgaranya ahụ.’ Ihe a wutere Devid, ya agwa Netan, sị: “Emehiela m Jehova.” Mmehie a Devid mere wetaara ya na ezinụlọ ya ọtụtụ nsogbu. Jehova tara Devid ahụhụ, ma o gbughị ya n’ihi na o kwuru eziokwu ma dịrị umeala n’obi.

Devid chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ, ma Jehova họọrọ nwa ya nwoke aha ya bụ Solomọn ka ọ rụọ ya. Devid malitere ịkwadebere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ya. Ọ sịrị: ‘Ụlọ nsọ Jehova ga-ama ezigbo mma. Solomọn ka bụ nwata, ma m ga-enyere ya aka ịkwadebe ihe ndị ọ ga-eji arụ ya.’ Devid nyere nnukwu ego maka ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Ọ kpọtara ndị nwere nkà. O wetara ọlaọcha na ọlaedo, meekwa ka e si n’obodo Taya na Saịdọn bute osisi sida. Mgbe oge ọnwụ ya ruwere, o nyere Solomọn akwụkwọ kwuru otú a ga-esi rụọ ụlọ nsọ ahụ. Devid kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ihe ndị a m deere gị. Jehova ga-enyere gị aka. Atụla egwu. Nwee obi ike, bidokwa ọrụ.’

“Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya, ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.”​—Ilu 28:13