ISI NKE 88
E Jidere Jizọs
Jizọs na ndịozi ya ji ụkwụ si na Ndagwurugwu Kidrọn gaa n’Ugwu Oliv. Mgbe ahụ bụ n’ime ime abalị, ọnwa na-etikwa gbaa ebe niile. Mgbe ha ruru n’ogige Getsemeni, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Nọrọnụ n’ebe a, na-echenụ nche.” Jizọs hapụziri ha gatụ n’ihu n’ogige ahụ ma gbuo ikpere n’ala. Ọ nọ na-echegbu onwe ya, ya ekpee ekpere ma rịọ Jehova, sị: “Ka uche gị mee.” Jehova zigaziri mmụọ ozi ya ka ọ gbaa Jizọs ume. Mgbe Jizọs gaghachiri n’ebe ụfọdụ ndịozi ya nọ, ọ hụrụ ha atọ ka ha na-ehi ụra. Ọ gwara ha, sị: ‘Bilienụ. Ugbu a abụghị oge unu kwesịrị iji na-ehi ụra. Oge eruola ka e nyefee m n’aka ndị iro m.’
Obere oge, Judas kpọọrọ ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na osisi bịa n’ogige ahụ. Ọ ma ebe ọ ga-achọta Jizọs n’ihi na ha na-agakarị n’ogige a. Judas gwaburu ndị agha so ìgwè mmadụ ahụ na ya ga-eme ihe ha ga-eji mata onye bụ́ Jizọs. Ọ gakwuuru Jizọs ozugbo, sị ya: ‘Onye Ozizi, ndeewo,’ ma susuo ya ọnụ. Jizọs sịrị ya: ‘Ì ji isusu m ọnụ enyefe m n’aka ha?’
Jizọs gakwuuru ìgwè mmadụ ahụ ma jụọ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha asị ya: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.” Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ bụ m.” Mgbe o kwuru ihe a, ha lara azụ daa n’ala. Jizọs jụkwara ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha sịkwara: “Jizọs onye Nazaret.” Jizọs gwara ha, sị: ‘Agwara m unu na ọ bụ m. Hapụnụ ha ka ha laa.’
Mgbe Pita ghọtara ihe na-emenụ, ọ mịịrị mma agha bepụ Malkọs ntị. Malkọs bụ ohu nnukwu onye nchụàjà. Ma, Jizọs bitụrụ ntị nwoke ahụ aka ma gwọọ ya. Ọ gwaziri Pita, sị: ‘Mịghachi mma gị n’ọbọ. I jiri mma agha na-alụ agha, ị ga-esi ná mma agha nwụọ.’ Ndị agha ahụ jidere Jizọs kee ya agbụ
n’aka, ndịozi ya agbaa ọsọ. Ìgwè mmadụ ahụ kpọọrọ Jizọs gakwuru Anas, bụ́ onyeisi nchụàjà. Anas jụrụ Jizọs ọtụtụ ajụjụ ma ziga ya n’ụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Keyafas. Ma, gịnị meziri ndịozi Jizọs?“N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.”—Jọn 16:33