Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 83

Jizọs Enye Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri

Jizọs Enye Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri

Obere oge tupu e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32, ndịozi Jizọs si ebe ha gara ikwusa ozi ọma lọta. Ike gwụchara ha, Jizọs agwa ha ka ha banye n’ụgbọ mmiri gaa Betseida zurutụ ike. Ma, mgbe ụgbọ ha rutere n’akụkụ mmiri Betseida, Jizọs chọpụtara na ọtụtụ puku mmadụ sokwa ha gaa ebe ahụ. O weghị iwe n’agbanyeghị na ọ chọrọ ka ya na ndịozi ya naanị nọrọ zurutụ ike. Jizọs gwọrọ ndị ọrịa ha kpọtaara ya, malitekwa ịkụziri ha ihe. Ọ kụziiri ha banyere Alaeze Chineke malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede. Ma, mgbe o ruru mgbede, ndịozi ya bịakwutere ya ma gwa ya, sị: ‘Agụụ abịala ndị a. Gwa ha ka ha lawa, ka ha nwee ike gaa zụrụ ihe ha ga-eri.’

Jizọs gwara ndịozi ya, sị: ‘Ọ dịghị mma ka ha lawa, unu nye ha ihe ka ha rie.’ Ndịozi ya jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụtara ha nri?’ Filip, bụ́ otu n’ime ndịozi ya kwuru, sị: ‘Ọ bụrụgodị na anyị ji ego buru ibu, ọ gaghị ezu ịzụta nri ga-ezu ìgwè mmadụ a.’

Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Ogbe achịcha ole ka unu nwere?’ Andru zara ya, sị: ‘Anyị nwere ogbe achịcha ise na obere azụ̀ abụọ. Ọ gaghịdị ezu.’ Jizọs sịrị ha: ‘Nyenụ m ogbe achịcha ndị ahụ na azụ̀ abụọ ahụ.’ Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị iri ise, ụfọdụ adịrị otu narị. Jizọs weere achịcha na azụ̀ ndị ahụ lelie anya n’eluigwe ma kpee ekpere. Mgbe o kpechara ekpere, o nyere ha ndịozi ya, ha ekesaara ha ìgwè mmadụ ahụ. Ndị tara achịcha na azụ̀ ndị ahụ dị ụmụ nwoke puku ise, na ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị. Ha niile rijuru afọ. Mgbe ha richara, ndịozi Jizọs tụtụkọtara ihe ndị ha rifọrọ ka a ghara inwe ihe ọ bụla a ga-etufu. Ihe ha tụtụkọtara juru nkata iri na abụọ. Ihe a bụ ezigbo ọrụ ebube, ọ́ bụghị ya?

Ihe a Jizọs mere tọrọ ndị mmadụ ezigbo ụtọ nke na ha chọwara ime ya eze. Ma, Jizọs ma na oge Jehova ga-eme ya eze erubeghị. Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, ma gwa ndịozi ya ka ha gafee n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Galili. Ndịozi ya banyere n’ụgbọ gawa ebe ahụ, ya agawakwanụ n’ugwu naanị ya. Gịnị mere o ji gaa naanị ya? Ọ bụ na ọ chọrọ ịnọ naanị ya kpee ekpere. N’agbanyeghị na Jizọs nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ, ọ na-ewepụta oge mgbe niile kpee ekpere.

“Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi, kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi, bụ́ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu.”​—Jọn 6:27