IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4

Igbo
Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016134/univ/art/1102016134_univ_sqr_xl.jpg
lfb p. 38-39

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4

Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Josef, Job, Mosis, na ndị Izrel. Ha niile diri ọtụtụ nsogbu Ekwensu kpataara ha. E megburu ụfọdụ n’ime ha, tụọ ụfọdụ mkpọrọ, jiri ụfọdụ mere ndị ohu, gbuodị ụfọdụ. Ma, Jehova si n’ụzọ dị iche iche chebe ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta otú ndị ahụ fere Jehova si nwee okwukwe n’agbanyeghị ahụhụ ha tara.

Jehova ji Ahụhụ Iri ọ tara ndị Ijipt gosi na ya ka chi ha niile ike. Mee ka nwa gị ghọta otú Jehova si chebe ndị ya n’oge gara aga na otú o si echebe ndị ya n’oge anyị a.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 14

Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

Gịnị mere Josef ji taa ezigbo ahụhụ n’agbanyeghị na o mere ihe ziri ezi?

ISI NKE 15

Jehova Echefughị Josef

Ọ bụ eziokwu na Josef na nne na nna ya na ụmụnne ya ebighị nso, Chineke gosiri ya na ọ nọnyeere ya.

ISI NKE 16

Ònye Bụ Job?

Job rubeere Jehova isi, ma mgbe ihe siiri ya ike.

ISI NKE 17

Mosis Họọrọ Ife Jehova

E gbughị Mosis mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ n’ihi na nne ya katara obi zoo ya.

ISI NKE 18

Osisi Na-enwu Ọkụ

Gịnị mere ọkụ erepịaghị osisi ahụ na-enwu ọkụ?

ISI NKE 19

Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt

Fero kpataara ndị obodo ya nsogbu n’ihi na mpako mere ka ọ ghara ime ihe Jehova gwara ya.

ISI NKE 20

Ahụhụ nke Anọ Ruo nke Itoolu

Gịnị mere ahụhụ isii a ji dị iche n’atọ ndị nke mbụ?

ISI NKE 21

Ahụhụ nke Iri

Ahụhụ a gbawara ndị Ijipt obi nke na Fero, bụ́ onye dị mpako, kwetaziri ka ndị Izrel laa.

ISI NKE 22

Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie

Fero anwụghị mgbe Chineke tara ndị Ijipt ahụhụ iri. Ma, ọ̀ lanahụrụ ọrụ ebube a Chineke rụrụ n’Oké Osimiri Uhie?