Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4
Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Josef, Job, Mosis, na ndị Izrel. Ha niile diri ọtụtụ nsogbu Ekwensu kpataara ha. E megburu ụfọdụ n’ime ha, tụọ ụfọdụ mkpọrọ, jiri ụfọdụ mere ndị ohu, gbuodị ụfọdụ. Ma, Jehova si n’ụzọ dị iche iche chebe ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta otú ndị ahụ fere Jehova si nwee okwukwe n’agbanyeghị ahụhụ ha tara.
Jehova ji Ahụhụ Iri ọ tara ndị Ijipt gosi na ya ka chi ha niile ike. Mee ka nwa gị ghọta otú Jehova si chebe ndị ya n’oge gara aga na otú o si echebe ndị ya n’oge anyị a.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 14
Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
Gịnị mere Josef ji taa ezigbo ahụhụ n’agbanyeghị na o mere ihe ziri ezi?
ISI NKE 15
Jehova Echefughị Josef
Ọ bụ eziokwu na Josef na nne na nna ya na ụmụnne ya ebighị nso, Chineke gosiri ya na ọ nọnyeere ya.
ISI NKE 17
Mosis Họọrọ Ife Jehova
E gbughị Mosis mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ n’ihi na nne ya katara obi zoo ya.
ISI NKE 19
Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
Fero kpataara ndị obodo ya nsogbu n’ihi na mpako mere ka ọ ghara ime ihe Jehova gwara ya.
ISI NKE 21
Ahụhụ nke Iri
Ahụhụ a gbawara ndị Ijipt obi nke na Fero, bụ́ onye dị mpako, kwetaziri ka ndị Izrel laa.
ISI NKE 22
Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie
Fero anwụghị mgbe Chineke tara ndị Ijipt ahụhụ iri. Ma, ọ̀ lanahụrụ ọrụ ebube a Chineke rụrụ n’Oké Osimiri Uhie?

