ISI NKE 34
Gidiọn Meriri Ndị Midian
Ka oge na-aga, ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova, fewe chi ọzọ. Ruo afọ asaa, ndị Midian nọ na-ezuru anụ ụlọ ndị Izrel ma na-emebisị ihe ndị ha kụrụ n’ubi. Ndị Izrel na-ezo n’ọgba nakwa n’ugwu ka ndị Midian ghara ịna-enye ha nsogbu. Ha rịọrọ Jehova ka ọ zọpụta ha n’aka ndị Midian. N’ihi ya, Jehova zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa hụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Gidiọn. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Jehova ahọrọla gị ka ị bụrụ onye agha dị ike.’ Gidiọn jụrụ ya, sị: ‘Olee otú m ga-esi azọpụta ndị Izrel? O nweghị ihe m bụ.’
Olee otú Gidiọn ga-esi amara na Jehova ahọrọla ya? Gidiọn dowere ajị anụ n’ala ma gwa Jehova, sị: ‘N’ụtụtụ, ọ bụrụ na igirigi adaa n’ajị anụ a, ma ghara ịda n’ala a, m ga-ama na ị họrọla m ka m zọpụta ndị Izrel.’ N’ụtụtụ echi ya, igirigi dara n’ajị anụ ahụ ma ala niile adịrị kọrọ kọrọ. Ma, Gidiọn rịọrọ Jehova ka o mee ka naanị ajị anụ ahụ dịrị kọrọ kọrọ, ka igirigi daa n’ala ahụ niile. Mgbe Jehova zara Gidiọn ekpere ya, o doro ya anya na Jehova ahọrọla ya. Ọ kpọkọtara ndị agha ya ka ha gaa lụso ndị Midian agha.
Jehova gwara Gidiọn, sị: ‘M ga-eme ka ndị Izrel merie. Ma, ebe ọ bụ na ị kpọ ọtụtụ ndị agha, unu nwere ike iche na ọ bụ ike unu ka unu ji merie. Gwa onye ọ bụla ụjọ na-atụ ka ọ lawa.’ N’ihi ya, ndị agha dị puku iri abụọ na puku abụọ (22,000) lawara, ya afọdụ puku iri (10,000). Jehova gwaziri ya, sị: ‘Ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Kpọrọ ha gaa na mmiri ma gwa ha ka ha ṅụọ mmiri. Naanị ndị ị ga-ahapụ bụ ndị na-aṅụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa.’ Ọ bụ naanị narị ndị agha atọ (300) ṅụrụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa. Jehova gwara Gidiọn na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole a ga-emeri ndị agha Midian dị otu narị puku na puku iri atọ na puku ise (135,000).
Jehova gwara Gidiọn n’abalị ahụ, sị: ‘Oge eruola ka unu lụso ndị Midian agha.’ Gidiọn nyere ndị agha ya opi na nnukwu ite e tinyere ọwa ọkụ n’ime ha. Ọ gwara ha, sị: ‘Na-elenụ m anya, meenụ ihe m mere.’ Gidiọn fụrụ opi ya, kụrie ite ya, fegharịa ọwa ọkụ ya ma tie mkpu, sị: ‘Mma agha Jehova na nke Gidiọn!’ Narị mmadụ atọ (300) ahụ so ya mekwara otú ahụ. Ụjọ tụwara ndị Midian, ha agbasasịa. Ha malitere ịlụso ibe ha agha maka na ha amaghịzi ihe ha na-eme eme. Otú a ka Jehova si nyere ndị Izrel aka ọzọ, ha emerie ndị iro ha.
“Ike a abụghị nke anyị, kama, ọ bụ Chineke nyere ya anyị.”—1 Ndị Kọrịnt 4:7