ISI NKE 95

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

E nwere onye ngwọrọ na-anọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ na-arịọ arịrịọ. N’ehihie otu ụbọchị, ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ. Ọ rịọrọ ha, sị: ‘Biko, nyetụnụ m ego.’ Pita sịrị ya: ‘M ga-enye gị ihe karịrị ego. N’aha Jizọs, bilie jewe ije.’ Pita jidere ya aka ma selite ya, ya amalite ịga ije. Obi tọrọ ìgwè mmadụ ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ ọrụ ebube a. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Ma ihe a were ndị nchụàjà na ndị Sadusii ezigbo iwe. Ha jidere Pita na Jọn ma kpọrọ ha gaa n’ụlọikpe ndị Juu a na-akpọ Sanhedrin. Ha jụrụ ha, sị: ‘Ònye nyere unu ike unu ji gwọọ nwoke a?’ Pita zara ha, sị: ‘Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye unu gburu.’ Ndị isi okpukpe ahụ sịrị ha: ‘Kwụsịnụ ikwu gbasara Jizọs!’ Ma ndịozi ahụ kwuru, sị: ‘Anyị ga na-ekwu gbasara ya. Anyị agaghị akwụsị.’

Ozugbo a hapụrụ Pita na Jọn, ha gakwuuru ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ma kọọrọ ha ihe merenụ. Ha niile kpere ekpere ma rịọ Jehova, sị: ‘Biko, nyere anyị aka ka anyị kata obi na-ekwusa ozi ọma.’ Jehova nyere ha mmụọ nsọ ya, ha anọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-agwọ ndị ọrịa. Ọtụtụ ndị ọzọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ezigbo iwe were ndị Sadusii, ha ejide ndịozi Jizọs ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Jehova zigara mmụọ ozi ya n’abalị, ya agaa meghee ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ ma gwa ndịozi ahụ, sị: ‘Gaghachinụ n’ụlọ nsọ kụziwe ihe.’

N’ụtụtụ echi ya, a gwara ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ndị Juu, sị: ‘Ụlọ mkpọrọ ka kpọchiri akpọchi, ma ndị unu tụbara n’ime ya anọghịzi ebe ahụ. Ha nọ n’ụlọ nsọ na-akụziri ndị mmadụ ihe.’ Ha jidere ndịozi ahụ ọzọ, kpọgakwa ha n’ụlọikpe ahụ. Nnukwu onye nchụàjà sịrị ha: ‘Anyị gwara unu kwụsị ikwu banyere Jizọs. Ma Pita sịrị: “Anyị ga na-erubere Chineke isi karịa mmadụ.”

Ezigbo iwe were ndị isi okpukpe ahụ nke na ha chọwara igbu ndịozi Jizọs. Ma, otu onye Farisii aha ya bụ Gameliel biliri ọtọ ma sị ha: ‘Cheenụ ihe a nke ọma. O nwere ike ịbụ na Chineke nọnyeere ha. Ka ùnu chọrọ ịlụso Chineke ọgụ?’ Ha nabatara ihe ọ gwara ha. Ha pịara ndịozi ahụ ihe, gwa ha ọzọ ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, hapụzie ha ka ha lawa. Ma, ihe a emeghị ka ike gwụ ndịozi Jizọs. Ha katara obi na-ekwusa ozi ọma ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ ndị mmadụ.

“Anyị ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ.”​—Ọrụ Ndịozi 5:29