ISI NKE 29
Jehova Họọrọ Joshụa
Mosis eduola ndị Izrel ọtụtụ afọ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-anwụ. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ga-eduru ndị Izrel banye n’Ala Nkwa. Ma, m ga-eme ka ị hụ ya.’ Mosis gwaziri Jehova ka ọ họpụta onye ọzọ ga na-edu ndị Izrel. Jehova gwara ya, sị: ‘Gakwuru Joshụa gwa ya na ọ bụ ya ga-eduwezi ndị Izrel.’
Mosis gwara ndị Izrel na ya ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, gwakwa ha na Jehova ahọrọla Joshụa ka o duru ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ọ gwaziri Joshụa, sị: ‘Atụla egwu. Jehova ga-enyere gị aka.’ Obere oge Mosis kwuchara ihe a, ọ gbagooro n’Ugwu Nibo, Jehova egosi ya ala ahụ o kwere Ebreham, Aịzik, na Jekọb ná nkwa. Mosis nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri abụọ (120).
Jehova gwara Joshụa, sị: ‘Gafee Osimiri Jọdan, banye n’ala Kenan. M ga-enyere gị aka otú m nyeere Mosis. Gbalịa na-agụ Iwu m kwa ụbọchị. Atụla egwu. Ka obi sie gị ike. Na-eme ihe m gwara gị mee.’
Joshụa zipụrụ ndị nnyopụta abụọ ka ha gaa Jeriko. Anyị ga-amatakwu ihe mere ebe ahụ n’isi nke 30. Mgbe ha laghachiri, ha gwara Joshụa ka ha gawa Kenan. N’echi ya, Joshụa gwara ndị Izrel ka ha kwalie. Ọ gwara ndị nchụàjà ka ha buru igbe ọgbụgba ndụ bute ụzọ gawa n’Osimiri Jọdan. Osimiri a tojuru etoju mgbe ahụ. Ma, ozugbo ụkwụ ndị nchụàjà metụrụ n’osimiri ahụ, ọ kwụsịrị ịsọ asọ ma taa. Ndị nchụàjà ahụ gara guzoro n’etiti osimiri ahụ ruo mgbe ndị Izrel niile gafechara. Ì chere na ọrụ ebube a chetaara ndị Izrel ihe Jehova meere ha n’Oké Osimiri Uhie?
Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ. Ha nweziri ike ịrụ ụlọ nakwa obodo dị iche iche. Ha nwekwara ike ịkọ ugbo, kụọ osisi vaịn, nakwa osisi ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. N’eziokwu, ala ahụ bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
“Jehova ga na-edu unu mgbe niile, na-egbokwara unu mkpa unu n’ala kpọrọ nkụ.”—Aịzaya 58:11