Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6
Mgbe ndị Izrel mechara banye n’Ala Nkwa ahụ, ụlọikwuu ahụ bịara bụrụ ebe ha na-anọ efe Jehova ezigbo ofufe. Ndị nchụàjà na-akụziri ha Iwu Chineke, ndị ikpe ana-eduzi ha. Nkebi a gosiri na mkpebi mmadụ mere na ihe ọ na-eme nwere ike ịbara ndị ọzọ uru ma ọ bụ kpatara ha nsogbu. Onye Izrel ọ bụla kwesịrị irubere Jehova isi ma na-emere mmadụ ibe ya ihe ọma. Mee ka nwa gị ghọta otú Debora, Naomi, Joshụa, Hana, ada Jefta, na Samuel si baara ndị obodo ha uru. Meekwa ka ọ ghọta na ndị na-abụghịdị ndị Izrel, dị ka Rehab, Rut, Jeel, na ndị Gibiọn kpebiri ịkwado ndị Izrel n’ihi na ha ma na Chineke nọnyeere ha.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 30
Rehab Zoro Ndị Nnyopụta
Mgbidi Jeriko dakasịrị. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na ọ dị na mgbidi ahụ.
ISI NKE 31
Joshụa na Ndị Gibiọn
Joshụa rịọrọ Chineke, sị: “Anyanwụ, kwụrụ otu ebe.” Chineke ọ̀ zara ekpere a?
ISI NKE 32
Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi
Mgbe Joshụa nwụchara, ndị Izrel bidoro ikpere arụsị ma taa ezigbo ahụhụ. Jehova jizi onyeikpe bụ́ Berak, Debora onye amụma nwaanyị, na Jeel na ntu ya nyere ha aka.
ISI NKE 33
Rut na Naomi
Ụmụ nwaanyị abụọ di ha nwụrụ laghachiri Izrel. Otu n’ime ha aha ya bụ Rut, gara na-arụ ọrụ n’ubi Boaz, Boaz ahụ ya.
ISI NKE 34
Gidiọn Meriri Ndị Midian
Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike, ndị Izrel arịọ Jehova ka o nyere ha aka. Olee otú ndị agha Gidion dị ole na ole si merie ndị iro ha dị 135,000?
ISI NKE 35
Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke
Elkana na-akpọrọ Hana, Penina, na ụmụ ha aga efe Chineke na Shaịlo. Hana nọ ebe ahụ rịọ Chineke ka o nye ya nwa nwoke. Mgbe otu afọ gachara, ya amụọ Samuel.
ISI NKE 36
Nkwa Jefta Kwere
Olee nkwa Jefta kwere? Gịnị mere o ji kwe ya? Olee ihe ada Jefta mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?
ISI NKE 37
Jehova Gwara Samuel Okwu
Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị nwere ụmụ nwoke abụọ na-eje ozi n’ụlọikwuu. Ha anaghị erubere Chineke isi. Ma, Samuel dị iche. Otu abalị, Jehova gwara ya okwu.
ISI NKE 38
Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike
Chineke mere ka Samsịn sie ike iji na-alụso ndị Filistia agha. Ma, mgbe o mere mkpebi na-adịghị mma, ndị Filistia jidere ya.

