IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6

Igbo
Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016136/univ/art/1102016136_univ_sqr_xl.jpg
lfb p. 72-73

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6

Mgbe ndị Izrel mechara banye n’Ala Nkwa ahụ, ụlọikwuu ahụ bịara bụrụ ebe ha na-anọ efe Jehova ezigbo ofufe. Ndị nchụàjà na-akụziri ha Iwu Chineke, ndị ikpe ana-eduzi ha. Nkebi a gosiri na mkpebi mmadụ mere na ihe ọ na-eme nwere ike ịbara ndị ọzọ uru ma ọ bụ kpatara ha nsogbu. Onye Izrel ọ bụla kwesịrị irubere Jehova isi ma na-emere mmadụ ibe ya ihe ọma. Mee ka nwa gị ghọta otú Debora, Naomi, Joshụa, Hana, ada Jefta, na Samuel si baara ndị obodo ha uru. Meekwa ka ọ ghọta na ndị na-abụghịdị ndị Izrel, dị ka Rehab, Rut, Jeel, na ndị Gibiọn kpebiri ịkwado ndị Izrel n’ihi na ha ma na Chineke nọnyeere ha.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 29

Jehova Họọrọ Joshụa

Chineke gwara Joshụa ihe ndị ga-enyekwara anyị aka taa.

ISI NKE 30

Rehab Zoro Ndị Nnyopụta

Mgbidi Jeriko dakasịrị. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na ọ dị na mgbidi ahụ.

ISI NKE 31

Joshụa na Ndị Gibiọn

Joshụa rịọrọ Chineke, sị: “Anyanwụ, kwụrụ otu ebe.” Chineke ọ̀ zara ekpere a?

ISI NKE 32

Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi

Mgbe Joshụa nwụchara, ndị Izrel bidoro ikpere arụsị ma taa ezigbo ahụhụ. Jehova jizi onyeikpe bụ́ Berak, Debora onye amụma nwaanyị, na Jeel na ntu ya nyere ha aka.

ISI NKE 33

Rut na Naomi

Ụmụ nwaanyị abụọ di ha nwụrụ laghachiri Izrel. Otu n’ime ha aha ya bụ Rut, gara na-arụ ọrụ n’ubi Boaz, Boaz ahụ ya.

ISI NKE 34

Gidiọn Meriri Ndị Midian

Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike, ndị Izrel arịọ Jehova ka o nyere ha aka. Olee otú ndị agha Gidion dị ole na ole si merie ndị iro ha dị 135,000?

ISI NKE 35

Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke

Elkana na-akpọrọ Hana, Penina, na ụmụ ha aga efe Chineke na Shaịlo. Hana nọ ebe ahụ rịọ Chineke ka o nye ya nwa nwoke. Mgbe otu afọ gachara, ya amụọ Samuel.

ISI NKE 36

Nkwa Jefta Kwere

Olee nkwa Jefta kwere? Gịnị mere o ji kwe ya? Olee ihe ada Jefta mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?

ISI NKE 37

Jehova Gwara Samuel Okwu

Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị nwere ụmụ nwoke abụọ na-eje ozi n’ụlọikwuu. Ha anaghị erubere Chineke isi. Ma, Samuel dị iche. Otu abalị, Jehova gwara ya okwu.

ISI NKE 38

Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike

Chineke mere ka Samsịn sie ike iji na-alụso ndị Filistia agha. Ma, mgbe o mere mkpebi na-adịghị mma, ndị Filistia jidere ya.