ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Jehova kwere anyị nkwa, sị: ‘Ibe ákwá, ihe mgbu, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ agaghịzi adị. M ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha. A gaghịzi echeta ihe ọjọọ niile mere n’oge gara aga.’

Jehova mere ka Adam na Iv biri n’ogige Iden. Ọ chọrọ ka ha biri n’udo ma na-enwe obi ụtọ na ya. Ọ chọkwara ka ha na-efe Nna ha nke eluigwe nakwa ka ha mụọ ụmụ mụjuo ụwa. Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Ma, ihe a emeghị ka Chineke gbanwee ihe o bu n’obi. N’akwụkwọ a, anyị ahụla na Chineke na-emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa. Ọ ga-eji Alaeze ya gọzie ụwa niile, otú o kwere Ebreham ná nkwa.

N’oge na-adịghị anya, Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị ọjọọ niile agaghịzi adị. Onye ọ bụla ga na-efe naanị Jehova. Anyị agaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Ụbọchị ọ bụla anyị tetara ụra, ahụ́ ga-agbasi anyị ike, obi ana-atọkwa anyị ụtọ na anyị dị ndụ. Ụwa ga-aghọ paradaịs. Onye ọ bụla ga-enwe ezigbo nri ọ ga-eri na ezigbo ụlọ ọ ga-ebi. Ndị mmadụ ga na-adị obiọma, e nweghịzi onye ga na-eme ibe ya ihe ọjọọ. Anụ ọhịa agaghịzi na-atụ anyị ụjọ, anyị agaghịkwa na-atụ ha ụjọ.

Obi ga-atọgbu onye ọ bụla atọgbu mgbe Jehova ga-amalite ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Anyị ga-anabata ndị fere Chineke n’oge ochie, dị ka Ebel, Noa, Ebreham, Sera, Mosis, Rut, Esta na Devid. Ha ga-eso anyị mee ka ụwa bụrụ paradaịs. A ga na-enwe ọrụ ndị na-eme obi ụtọ anyị ga na-arụ mgbe niile.

Jehova chọrọ ka i biri na paradaịs. Ị ga-amatakwu ya karịa otú ị ma ya ugbu a. N’ihi ya, ka anyị gbalịa na-abịarukwu Jehova nso kwa ụbọchị, na-emekwa otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

“Jehova Chineke anyị, onye dị ike, i ruru eru ka ndị niile too gị ma sọpụrụ gị, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”​—Mkpughe 4:11