Samuel nke Mbụ 12:1-25

  • Okwu ikpeazụ Samuel gwara ndị Izrel (1-25)

    • ‘Unu esokwala chi ndị na-abaghị uru ọ bụla’ (21)

    • Jehova agaghị ahapụ ndị ya (22)

12  N’ikpeazụ, Samuel gwara ndị Izrel niile, sị: “Emeela m ihe niile unu gwara m, họpụtara unu eze ga na-achị unu.+  Ugbu a, unu enweela eze ga na-edu unu.+ Mụnwa emeela agadi. Isi achaakwala m awọ́. Unu na ụmụ m nọkwa.+ M sikwa na nwata duru unu ruo taa.+  Lekwanụ m. Nọrọnụ n’ihu Jehova nakwa n’ihu onye o tere mmanụ gwa m:+ Ehi ònye ka m kpụụrụ? Jakị ònye ka m kpụụrụ?+ Ònye ka m rigburu? Ònyekwa ka m chiri ọnụ n’ala? Ònye ka m naara aka azụ iji kpee ikpe arụrụala?+ Ọ bụrụ na o nwere, m ga-enyeghachi ya onye ahụ.”+  Ha asị: “I rigbughị anyị. I chighịkwa anyị ọnụ n’ala. Ọ dịghịkwa onye ị naara ihe ọ bụla.”  Ya asị ha: “Jehova bụ onye akaebe m, onye o tere mmanụ bụkwa onye akaebe m taa na unu kwuru na o nweghị ihe ọ bụla m naara unu.” Ha asị: “Ọ bụ onye akaebe gị.”  Samuel wee sị ndị Izrel: “Jehova bụ onye akaebe n’okwu a. Ọ bụ ya si n’aka Mosis na Erọn si n’Ijipt kpọpụta nna nna unu hà.+  Ugbu a, bịanụ nso ka m kpee unu ikpe n’ihu Jehova ma chetara unu ihe ọma niile Jehova meere unu na nna nna unu hà.  “Ngwa ngwa Jekọb kwatara Ijipt,+ nna nna unu hà malitere ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka,+ Jehova eziga Mosis+ na Erọn, ha esi n’Ijipt dute nna nna unu hà ka ha biri ebe a.+  Ma, ha chefuru Jehova bụ́ Chineke ha. Ọ bụ ya mere o ji nyefee ha+ n’aka* Sisera+ bụ́ onyeisi ndị agha Hezọ, nyefeekwa ha n’aka ndị Filistia+ nakwa n’aka eze Moab,+ ha ana-alụso ndị Izrel agha. 10  Ha wee malite ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka.+ Ha sịrị, ‘Anyị emehiela,+ n’ihi na anyị ahapụla Jehova fewe Bel+ na Ashtọret.+ Biko, napụta anyị n’aka ndị iro anyị, ka anyị jewere gị ozi.’ 11  Jehova wee si n’aka Jerubel+ na Bidan na Jefta+ na mụnwa bụ́ Samuel+ napụta unu n’aka ndị iro unu, ka obi ruo unu ala ebe unu bi.+ 12  Mgbe unu hụrụ na Nehash,+ eze ụmụ Amọn, abịala ịlụso unu agha, unu nọ na-asị m, ‘Anyị chọrọ eze ga na-achị anyị,’+ n’agbanyeghị na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Eze unu.+ 13  Ugbu a, lekwanụ eze unu nọ na-achọ, onye unu kwuru ka a họpụtara unu. Jehova ahọpụtarala unu eze ga na-achị unu.+ 14  Ọ ga-adị mma ma unu na-atụ egwu Jehova,+ na-efe ya,+ na-eme ihe o kwuru,+ gharakwa inupụ isi n’iwu Jehova. Ọ ga-adịkwa mma ma unu na eze na-achị unu na-eso Jehova bụ́ Chineke unu. 15  Ma ọ bụrụ na unu emeghị ihe Jehova kwuru, ma nupụrụ Jehova isi, Jehova ga-ata unu na nna unu hà ahụhụ.+ 16  Ugbu a, bịanụ nso ka unu hụ ihe dị ịtụnanya Jehova ga-eme n’ihu unu. 17  Ọ̀ bụ na oge a abụghị oge e ji ewe ọka wit n’ubi? M ga-arịọ Jehova ka o mee ka égbè eluigwe gbaa, meekwa ka mmiri zoo. Mgbe ahụ ka ọ ga-edo unu anya na ọ bụghị obere ihe ọjọọ ka unu mere n’anya Jehova mgbe unu kwuru ka a họpụtara unu eze.”+ 18  Samuel wee gwa Jehova, Jehova emee ka égbè eluigwe gbaa, meekwa ka mmiri zoo n’ụbọchị ahụ, nke na ezigbo ụjọ jidere ndị Izrel niile n’ihi Jehova na Samuel. 19  Mmadụ niile wee gwa Samuel, sị: “Rịọ Jehova bụ́ Chineke gị ka o meere ndị ohu gị ebere,+ n’ihi na anyị achọghị ịnwụ. Anyị emeela ihe ọjọọ mekwasị n’elu mmehie anyị niile, maka na anyị kwuru ka a họpụtara anyị eze.” 20  Samuel wee sị ndị Izrel: “Unu atụla egwu. N’eziokwu, unu emeela ihe ọjọọ. Ma, unu ahapụkwala iso Jehova,+ jirikwanụ obi unu niile na-efe Jehova.+ 21  Unu agakwala sowe chi+ ndị na-abaghị uru ọ bụla,+ ndị na-anaghịkwa anapụta mmadụ, n’ihi na ha agaghị abara unu uru ọ bụla. 22  Jehova agaghị ahapụ unu*+ n’ihi aha ya dị ebube,+ maka na Jehova ekpebiela na unu ga-abụ ndị ya.+ 23  O nweghịkwa ihe ga-eme ka m mehie Jehova, kwụsị ikpe ekpere maka unu. M ga na-akụzikwara unu ihe dị mma na nke ziri ezi. 24  Naanị ihe unu ga na-eme bụ ịtụ egwu Jehova,+ jirikwa obi unu niile na-efe ya,* n’ihi na o meerela unu ihe ndị dị ịtụnanya.+ 25  Ma ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya, a ga-ekpochapụ+ ma unu ma eze unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “resị ha.”
Na Hibru, “ndị ya.”
Ma ọ bụ “na-efe ya n’eziokwu.”