ISI NKE 68

Elizabet Mụrụ Nwa

Elizabet Mụrụ Nwa

Mgbe ihe karịrị narị afọ anọ (400) a rụziri mgbidi Jeruselem gachara, otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya na Elizabet nwunye ya biri n’ebe dị nso na Jeruselem. Ha alụọla ọtụtụ afọ, ma ha amụtabeghị nwa. Otu ụbọchị, mgbe Zekaraya nọ n’ebe dị nsọ n’ụlọ nsọ na-achụ àjà, otu mmụọ ozi aha ya bụ Gebriel pụtara n’ihu ya. Mgbe Zekaraya hụrụ ya, ụjọ tụrụ ya. Ma, Gebriel sịrị ya: ‘Atụla egwu. M bịara izi gị ozi ọma si n’aka Jehova. Elizabet nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Aha ya ga-abụ Jọn. Jehova ahọrọla ya ka ọ rụọrọ ya ọrụ pụrụ iche.’ Zekaraya jụrụ ya, sị: ‘Olee otú m ga-esi kweta ihe a i kwuru? Mụ na nwunye m akaala nká ịmụta nwa.’ Gebriel gwara ya, sị: ‘Chineke zitere m ka m zie gị ozi a. Ma, ebe ọ bụ na i kwetaghị ihe m gwara gị, ị gaghị ekwu okwu ruo mgbe a mụrụ nwa a.’

Zekaraya nọrọ n’ebe nsọ ahụ karịa ka ọ na-anọbu. N’ihi ya, mgbe o mechara pụta, ndị nọ n’èzí na-eche ya chọrọ ịma ihe merenụ. Ma, Zekaraya enweghị ike ikwu okwu. Naanị ihe ọ na-eme bụ iji aka ya na-agwa ha okwu. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ha ghọtara na e nwere ozi Chineke ziri ya.

Elizabet bịaziri dịrị ime ma mụọ nwa nwoke otú mmụọ ozi ahụ kwuru. Ndị ikwu ya na ndị enyi ya bịara ka ha hụ nwa ahụ. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ ya. Elizabet gwara ha, sị: ‘Aha ya bụ Jọn.’ Ha sịrị ya: ‘E nweghị onye ezinụlọ unu aha ya bụ Jọn. Gụọnụ ya Zekaraya, aha papa ya.’ Ma, Zekaraya dere n’ihe e ji ede ihe, sị: ‘Aha ya bụ Jọn.’ Ozugbo ahụ, Zekaraya malitere ikwu okwu. Akụkọ gbasara nwa ahụ gazuru Judia niile, ndị mmadụ nọkwa na-ajụ onwe ha, sị: ‘Gịnị ka nwa a ga-abụ ma o too?’

Chineke nyeziri Zekaraya mmụọ nsọ, ya ebuo amụma, sị: ‘Ka e too Jehova. O kwere Ebreham nkwa na ya ga-ezite Mezaya, onye nzọpụta, ka ọ napụta anyị. Jọn ga-abụ onye amụma, ọ ga-akwadebekwara Mezaya ụzọ.’

E nwekwara ihe ọma pụrụ iche meere Meri, onye ikwu Elizabet. Ka anyị chọpụta ihe ọ bụ n’isiokwu na-esonụ.

“N’anya ụmụ mmadụ, ihe a agaghị ekwe omume. Ma, ihe niile kwere Chineke omume.”​—Matiu 19:26