Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl

Akwụkwọ a ga-akọrọ gị otú Chineke si kee ihe, ihe ndị mere mgbe e kechara ihe ruo mgbe a mụrụ Jizọs, ya ejee ozi n’ụwa, ruokwa mgbe Alaeze Chineke ga-abịa.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Olee otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ a kụziere mmadụ ihe?

ISI NKE 1

Chineke Kere Eluigwe na Ụwa

Baịbụl kwuru na Chineke kere eluigwe na ụwa. Gịnị mere o ji buru ụzọ kee otu mmụọ ozi tupu ya ekee onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ?

ISI NKE 2

Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Chineke kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ma mee ka ha biri n’ogige Iden. Ọ chọrọ ka ha mụọ ụmụ, meekwa ka ụwa niile bụrụ paradaịs.

ISI NKE 3

Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi

Gịnị mere otu osisi dị n’ogige Iden ji pụọ iche? Gịnị mere Iv ji rie mkpụrụ ya?

ISI NKE 4

O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe

Chineke nabatara àjà Ebel chụụrụ ya ma jụ nke Ken. Mgbe Ken hụrụ na Chineke jụrụ àjà ya, o were ezigbo iwe ma mee ihe jọgburu onwe ya.

ISI NKE 5

Ụgbọ Noa

Ndị mmụọ ozi ndị mere ihe ọjọọ lụrụ nwaanyị, mụọ ụmụ gbara ajọ dimkpa. Tigbuo zọgbuo bịara ju n’ụwa. Ma, Noa dị iche. Ọ hụrụ Jehova n’anya, na-erubekwara ya isi.

ISI NKE 6

Chineke Chebere Mmadụ Asatọ

Mmiri ahụ e ji bibie ụwa zoro ụbọchị iri anọ ehihie na abalị. Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Chineke mechara gwa ha pụta.

ISI NKE 7

Ụlọ Elu Babel

Ụfọdụ ndị malitere ịrụ obodo na ụlọ elu ga-eru eluigwe. Gịnị mere Chineke ji mee ka ha sụwa asụsụ dị iche iche na mberede?

ISI NKE 8

Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi

Gịnị mere Ebreham na Sera ji hapụ ụlọ ha n’obodo Ọọ ma gaa na-ebi ebe dị iche iche na Kenan?

ISI NKE 9

Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa

Olee otú Chineke ga-esi mezuo nkwa ahụ o kwere Ebreham? Ọ̀ bụ Aịzik ka ọ̀ bụ Ishmel ka ọ ga-esi n’aka ya mezuo nkwa a?

ISI NKE 10

Cheta Nwunye Lọt

Chineke mere ka ọkụ na sọlfọ zo na Sọdọm na Gọmọra. Gịnị mere o ji bibie obodo ndị ahụ? Gịnị mere anyị ga-eji cheta nwunye Lọt?

ISI NKE 11

Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule

Chineke gwara Ebreham, sị: ‘Biko, kpọrọ nwa gị nwoke ị mụrụ naanị ya, gaa n’Ugwu Moraya jiri ya chụọrọ m àjà.’ Ebreham ọ̀ ga-emenụ ihe Chineke gwara ya mee?

ISI NKE 12

Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Aịzik na Ribeka mụrụ ejima. Ha bụ Ịsọ na Jekọb. E bu ụzọ mụọ Ịsọ, e kwesịrị inye ya ihe ruuru ọkpara. Gịnị mere o ji nye ya Jekọb n’ihi otu efere ofe?

ISI NKE 13

Jekọb na Ịsọ Kpeziri

Olee otú mmụọ ozi si gọzie Jekọb? Olee otú Jekọb na Ịsọ si kpezie?

ISI NKE 14

Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

Gịnị mere Josef ji taa ezigbo ahụhụ n’agbanyeghị na o mere ihe ziri ezi?

ISI NKE 15

Jehova Echefughị Josef

Ọ bụ eziokwu na Josef na nne na nna ya na ụmụnne ya ebighị nso, Chineke gosiri ya na ọ nọnyeere ya.

ISI NKE 16

Ònye Bụ Job?

Job rubeere Jehova isi, ma mgbe ihe siiri ya ike.

ISI NKE 17

Mosis Họọrọ Ife Jehova

E gbughị Mosis mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ n’ihi na nne ya katara obi zoo ya.

ISI NKE 18

Osisi Na-enwu Ọkụ

Gịnị mere ọkụ erepịaghị osisi ahụ na-enwu ọkụ?

ISI NKE 19

Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt

Fero kpataara ndị obodo ya nsogbu n’ihi na mpako mere ka ọ ghara ime ihe Jehova gwara ya.

ISI NKE 20

Ahụhụ nke Anọ Ruo nke Itoolu

Gịnị mere ahụhụ isii a ji dị iche n’atọ ndị nke mbụ?

ISI NKE 21

Ahụhụ nke Iri

Ahụhụ a gbawara ndị Ijipt obi nke na Fero, bụ́ onye dị mpako, kwetaziri ka ndị Izrel laa.

ISI NKE 22

Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie

Fero anwụghị mgbe Chineke tara ndị Ijipt ahụhụ iri. Ma, ọ̀ lanahụrụ ọrụ ebube a Chineke rụrụ n’Oké Osimiri Uhie?

ISI NKE 23

Nkwa Ndị Izrel Kwere Jehova

Ndị Izrel kwere Chineke nkwa pụrụ iche mgbe ha mara ụlọikwuu n’Ugwu Saịnaị.

ISI NKE 24

Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere

Ndị Izrel mere mmehie jọgburu onwe ya mgbe Mosis gara n’ugwu ka Chineke nye ya Iwu Iri ahụ.

ISI NKE 25

Ụlọikwuu A Ga-anọ Na-efe Chineke

Igbe ọgbụgba ndụ dị n’ụlọikwuu a pụrụ iche.

ISI NKE 26

Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ

Joshụa na Keleb dị iche na mmadụ iri ndị ọzọ so nyopụta ala Kenan.

ISI NKE 27

Ha Nupụụrụ Jehova Isi

E nwere ihe dị mkpa Detan, Abaịram, na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) na-aghọtaghị banyere Jehova.

ISI NKE 28

Jakị Belam Kwuru Okwu

Belam ahụghị onye jakị ya na-ahụ.

ISI NKE 29

Jehova Họọrọ Joshụa

Chineke gwara Joshụa ihe ndị ga-enyekwara anyị aka taa.

ISI NKE 30

Rehab Zoro Ndị Nnyopụta

Mgbidi Jeriko dakasịrị. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na ọ dị na mgbidi ahụ.

ISI NKE 31

Joshụa na Ndị Gibiọn

Joshụa rịọrọ Chineke, sị: “Anyanwụ, kwụrụ otu ebe.” Chineke ọ̀ zara ekpere a?

ISI NKE 32

Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi

Mgbe Joshụa nwụchara, ndị Izrel bidoro ikpere arụsị ma taa ezigbo ahụhụ. Jehova jizi onyeikpe bụ́ Berak, Debora onye amụma nwaanyị, na Jeel na ntu ya nyere ha aka.

ISI NKE 33

Rut na Naomi

Ụmụ nwaanyị abụọ di ha nwụrụ laghachiri Izrel. Otu n’ime ha aha ya bụ Rut, gara na-arụ ọrụ n’ubi Boaz, Boaz ahụ ya.

ISI NKE 34

Gidiọn Meriri Ndị Midian

Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike, ndị Izrel arịọ Jehova ka o nyere ha aka. Olee otú ndị agha Gidion dị ole na ole si merie ndị iro ha dị 135,000?

ISI NKE 35

Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke

Elkana na-akpọrọ Hana, Penina, na ụmụ ha aga efe Chineke na Shaịlo. Hana nọ ebe ahụ rịọ Chineke ka o nye ya nwa nwoke. Mgbe otu afọ gachara, ya amụọ Samuel.

ISI NKE 36

Nkwa Jefta Kwere

Olee nkwa Jefta kwere? Gịnị mere o ji kwe ya? Olee ihe ada Jefta mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?

ISI NKE 37

Jehova Gwara Samuel Okwu

Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị nwere ụmụ nwoke abụọ na-eje ozi n’ụlọikwuu. Ha anaghị erubere Chineke isi. Ma, Samuel dị iche. Otu abalị, Jehova gwara ya okwu.

ISI NKE 38

Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike

Chineke mere ka Samsịn sie ike iji na-alụso ndị Filistia agha. Ma, mgbe o mere mkpebi na-adịghị mma, ndị Filistia jidere ya.

ISI NKE 39

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Chineke nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha. Ma, ha chọrọ eze ga na-achị ha. Samuel tere Sọl mmanụ ịbụ eze mbụ ha, ma Jehova mechara jụ Sọl. N’ihi gịnị?

ISI NKE 40

Devid na Golayat

Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị Izrel. Devid gosikwara ihe mere o ji kwesị ịbụ eze.

ISI NKE 41

Devid na Sọl

Gịnị mere Sọl ji kpọọ Devid asị, oleekwa ihe Devid mere?

ISI NKE 42

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Nwa eze ghọrọ ezigbo enyi Devid.

ISI NKE 43

Mmehie Eze Devid Mere

Mkpebi na-adịghị mma Devid mere kpataara ya ọtụtụ nsogbu.

ISI NKE 44

Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova

Chineke meere Solomọn ihe ọ rịọrọ ya ma meere ya ọtụtụ ihe ọma.

ISI NKE 45

E Kewara Alaeze Izrel

Ọtụtụ ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova.

ISI NKE 46

A Matara Chi Nke Bụ́ Ezigbo Chi

Ònye bụ ezi Chineke? Ọ̀ bụ Jehova ka ọ̀ bụ Bel?

ISI NKE 47

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Ì chere na Chineke nwere ike ime ka obi sie gị ike ka Ịlaịja?

ISI NKE 48

A Kpọlitere Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ n’Ọnwụ

Ịlaịja rụrụ ọrụ ebube abụọ n’otu ụlọ.

ISI NKE 49

E Gburu Nwunye Eze Bụ́ Nwaanyị Ọjọọ

Jezibel kpara nkata ka o gbuo Nebọt iji nara ya ubi vaịn ya. Jehova kwụrụ ya ụgwọ ihe ọjọọ o mere.

ISI NKE 50

Jehova Nyeere Jehoshafat Aka

Mgbe ndị iro Juda bịara ịlụso ezigbo eze bụ́ Jehoshaphat ogụ, ọ rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka.

ISI NKE 51

Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka

Otu nwatakịrị nwaanyị Izrel gwara nne ya ukwu otú Jehova si e ji ike dị ukwuu o nwere agwọ ọrịa.

ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

Otú onye na-ejere Ịlaịsha ozi si mata na ‘ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.’

ISI NKE 53

Jehoyada Katara Obi

Otu onye nchụàjà na-efe Chineke katara obi gbuo otu eze nwaanyị ọjọọ.

ISI NKE 54

Jehova Nweere Jona Ndidi

Gịnị mere otu nnukwu azụ̀ ji loo onye amụma Chineke? Olee otú o si pụta n’afọ ya? Gịnị ka Jehova ji ihe a kụziere ya?

ISI NKE 55

Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya

Ndị iro Juda kwuru na Jehova agaghị anapụta ha. Ma ihe a ha kwuru abụghị eziokwu.

ISI NKE 56

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ asatọ. O nyekwaara ndị obodo ya aka ife Jehova.

ISI NKE 57

Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

Ihe onye amụma a bụ́ nwa okorobịa gwara ndị okenye Juda were ha ezigbo iwe.

ISI NKE 58

E Bibiri Jeruselem

Ndị Juda nọgidere na-ekpere arụsị. N’ihi ya, Jehova jụrụ ha.

ISI NKE 59

Ụmụaka Anọ Ndị Rubeere Jehova Isi

Ụmụaka si Juda kpebisiri ike na ha ga-erubere Jehova isi, ma mgbe ha nọ n’obí eze Babịlọn.

ISI NKE 60

Alaeze Nke Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi

Daniel kọwara ihe nrọ na-atụ ụjọ Nebukadneza rọrọ pụtara.

ISI NKE 61

Ha Akpọghị Isiala

Shedrak, Mishak, na Abednego akpọrọghị ihe eze Babịlọn ji ọlaedo kpụọ isiala.

ISI NKE 62

Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi

Nrọ Nebukadneza rọrọ gosiri ihe ga-eme ya.

ISI NKE 63

Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

Olee mgbe e dere ihe ndị a gbagwojuru ndị mmadụ anya n’ahụ́ ájá. Gịnịkwa ka ha pụtara?

ISI NKE 64

A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

Na-agwa Jehova okwu n’ekpere kwa ụbọchị ka Daniel.

ISI NKE 65

Esta Napụtara Ndị Obodo Ha

Ọ bụ eziokwu na Esta bụ onye mba ọzọ, bụrụkwa nwa na-enweghị nne na nna, o mechara bụrụ nwunye eze.

ISI NKE 66

Ezra Kụziri Iwu Chineke

Mgbe ndị Izrel gechara Ezra ntị, ha kwere Chineke nkwa pụrụ iche.

ISI NKE 67

Mgbidi Jeruselem

Nehemaya nụrụ na ndị iro ya chọrọ ịbịa mesie ha ike. Gịnị mere na ọ tụghị ụjọ?

ISI NKE 68

Elizabet Mụrụ Nwa

Gịnị mere e ji gwa di Elizabet na ọ gaghị ekwu okwu ruo mgbe nwunye ya mụrụ nwa?

ISI NKE 69

Gebriel Gara Hụ Meri

O ziri ya ozi gbanwere ndụ ya.

ISI NKE 70

Ndị Mmụọ Ozi Mere Ka A Mata na A Mụọla Jizọs

Mgbe ndị mmụọ ozi gwara ndị ọzụzụ atụrụ na a mụọla Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ gawara Betlehem ozugbo.

ISI NKE 71

Jehova Chebere Jizọs

Otu eze ọjọọ chọrọ ka e gbuo Jizọs.

ISI NKE 72

Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ

Olee ihe o mere nke juru ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ anya?

ISI NKE 73

Jọn Kwadebeere Jizọs Ụzọ

Jọn ghọrọ onye amụma mgbe o toro. Ọ gwara ndị mmadụ na Mezaya na-abịa. Gịnị ka ha mere mgbe ha nụrụ ihe ọ gwara ha?

ISI NKE 74

Jizọs Ghọrọ Mezaya

Olee ihe Jọn bu n’obi kwuo na Jizọs bụ Nwa Atụrụ Chineke?

ISI NKE 75

Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa

Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa ugboro atọ. Olee ọnwụnwa atọ ọ nwara ya? Olee ihe Jizọs mere?

ISI NKE 76

Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

Gịnị mere Jizọs ji chụpụ anụmanụ n’ụlọ nsọ ma kpuo tebụl ndị na-agbanwe ego ihu n’ala?

ISI NKE 77

Otu Nwaanyị Nke Bịara n’Olulu Mmiri

O juru otu nwaanyị Sameria anya na Jizọs na-agwa ya okwu. Gịnị mere o ji ju ya anya? Olee ihe Jizọs gwara ya nke ọ na-agwabeghị mmadụ ọ bụla?

ISI NKE 78

Jizọs Kwusara Ozi Ọma Alaeze Chineke

Jizọs gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” O mechara kụziere ndị na-eso ụzọ ya iri asaa otú e si ekwusa ozi ọma.

ISI NKE 79

Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube

Ebe ọ bụla Jizọs gara, ndị ọrịa na-abịakwute ya ka ọ gwọọ ha, ya agwọọ ha. Ọ kpọlitedịrị otu nwatakịrị nwaanyị n’ọnwụ.

ISI NKE 80

Jizọs Họọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Gịnị mere o ji họrọ ndịozi iri na abụọ? Ị̀ ma aha ha?

ISI NKE 81

Ihe Jizọs Nọ n’Elu Ugwu Kụzie

Jizọs kụziiri ìgwè mmadụ bịakwutere ya ihe ndị bara uru.

ISI NKE 82

Jizọs Kụziiri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere

Olee ihe ndị ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ?

ISI NKE 83

Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri

Gịnị ka ọrụ ebube a na-akụziri anyị banyere Jizọs na Jehova?

ISI NKE 84

Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri

Olee otú i chere obi dị ndịozi Jizọs mgbe ha hụrụ ọrụ ebube a?

ISI NKE 85

Jizọs Gwọrọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike

Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma n’ihe a o mere?

ISI NKE 86

Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ

Mgbe Jizọs hụrụ Meri ka ọ na-ebe ákwá, o bewekwara ákwá. Ma obere oge, obi malitere ịtọ ha ụtọ.

ISI NKE 87

Nri Anyasị Ikpeazụ Jizọs Riri

Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-eri nri anyasị ikpeazụ, ọ gwara ha ihe ndị dị mkpa ha ga na-eme.

ISI NKE 88

E Jidere Jizọs

Judas Iskarịọt kpọ ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na osisi bịa n’ogige Getsemeni ka ha jide Jizọs.

ISI NKE 89

Pita Gọnahụrụ Jizọs

Gịnị mere n’ogige ụlọ Keyafas? Gịnị mere Jizọs n’ime ụlọ Keyafas?

ISI NKE 90

Jizọs Nwụrụ na Gọlgọta

Gịnị mere Paịlet ji nye iwu ka e gbuo Jizọs?

ISI NKE 91

A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

Olee ihe ndị dị ịtụnanya merenụ mgbe e gbuchara Jizọs?

ISI NKE 92

Jizọs Pụtara n’Ihu Ndị Gara Igbu Azụ̀

Olee ihe Jizọs mere iji mee ka ha bịakwute ya?

ISI NKE 93

Jizọs Laghachiri Eluigwe

Ma tupu ya alaghachi eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iwu dị ezigbo mkpa.

ISI NKE 94

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

Olee ọrụ ebube mmụọ nsọ nyere ha ike ịrụ?

ISI NKE 95

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

Ndị isi okpukpe ndị gburu Jizọs na-achọzi ime ka ndị na-eso ụzọ ya kwụsị izi ozi ọma. Ma ha agaghị akwụsịli ha.

ISI NKE 96

Jizọs Họọrọ Sọl

Sọl bụ ezigbo onye iro Ndị Kraịst. Ma, ndụ ya ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.

ISI NKE 97

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs

Gịnị mere Chineke ji ziga Pita n’ụlọ nwoke a na-abụghị onye Juu?

ISI NKE 98

E Zisara Ozi Ọma n’Ọtụtụ Mba

Pọl onyeozi na ndị ya na ha so bidoro ikwusa ozi ọma n’obodo ndị dị anya.

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

Gịnị gbasara mmụọ ọjọọ, ala ọma jijiji, nakwa mma agha n’akụkọ a?

ISI NKE 100

Pọl na Timoti

Ha abụọ bụ enyi, ha rụkọkwara ọrụ ọnụ ruo ọtụtụ afọ.

ISI NKE 101

A Kpọgara Pọl Rom

Ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl onyeozi mgbe ọ na-aga ebe ahụ, ma o meghị ka ike gwụ ya.

ISI NKE 102

Mkpughe E Kpugheere Jọn

Jizọs mere ka Jọn hụ ọhụụ dị iche iche ndị gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Mkpughe e kpugheere Jọn gosiri otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka ihe dị mma n’ụwa.