ISI NKE 39
Eze Mbụ Chịrị Izrel
Jehova nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha, ma ndị Izrel chọrọ eze ga na-achị ha. Ha gwara Samuel, sị: ‘Mba ndị dị anyị nso nwechara ndị eze. Anyị chọkwara inwe eze ga na-achị anyị.’ Samuel ma na ihe a ha kwuru adịghị mma, n’ihi ya, o kpere ekpere gwa Jehova maka ya. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ka ha jụrụ. Ọ bụ mụnwa ka ha jụrụ. Gwa ha na ha ga-enweta eze, ma e nwere ọtụtụ ihe eze ahụ ga-agwa ha ka ha na-emere ya.’ N’agbanyeghị ihe a a gwara ha, ha sịrị: ‘Anyị achọghị ịma. Ihe anyị chọrọ bụ eze.’
Jehova gwara Samuel na otu nwoke aha ya bụ Sọl ga-abụ eze mbụ ha. Mgbe Sọl gara Rema ka ọ hụ Samuel, ọ wụrụ Sọl mmanụ n’isi, si otú ahụ họpụta ya ka ọ bụrụ eze.
Samuel mechara kpọkọta ndị Izrel ka o gosi ha eze ọhụrụ ha. Ma ha chọrọ Sọl, ha ahụghị ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ maka na ọ gara zoo n’ebe a kwasara ngwongwo. Mgbe ha mechara hụ ya, ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ha. Sọl kacha ndị niile nọ ebe ahụ ogologo, maakwa ezigbo mma. Samuel sịrị ha: ‘Leenụ onye Jehova họọrọ.’ Ndị Izrel gwara eze, sị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”
Mgbe Eze Sọl malitere ịchị, ọ na-ege Samuel ntị, na-erubekwara Jehova isi. Ma, o mechara gbanwee. Dị ka ihe atụ, eze ekwesịghị ịchụrụ Jehova àjà. Otu ụbọchị, Samuel gwara Sọl ka o chere ka ọ bịa, ma Samuel abịaghị ozugbo. N’ihi ya, Sọl ji aka ya chụọ àjà ahụ. Gịnị ka Samuel mere? Ọ gwara Sọl, sị: ‘I kwesịghị inupụrụ Jehova isi.’ Sọl ọ̀ mụtara ihe n’ihe a o mere?
Mgbe Sọl mechara gaa ịlụso ndị Amalek agha, Samuel gwara ya ka o gbuo ha niile. Ma, Sọl egbughị Eze Egag. Jehova gwara Samuel, sị: ‘Sọl ahapụla m, ọ naghịzi ege m ntị.’ Ihe a were
Samuel iwe, ya agwa Sọl, sị: ‘Ebe ọ bụ na ị kwụsịla irubere Jehova isi, ọ ga-ahọrọ onye ọzọ ka ọ bụrụ eze.’ Mgbe Samuel chọrọ ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe elu ya, uwe ahụ adọkapụ. Samuel gwaziri Sọl, sị: ‘Jehova anapụla gị alaeze otú a i si dọkapụ uwe a.’ Jehova ga-enye onye ga-ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi alaeze ahụ.“Ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà.”—1 Samuel 15:22