Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 9

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 9

Nkebi a ga-akọrọ anyị banyere ndị na-eto eto, ndị amụma, na ndị eze nwere ezigbo okwukwe na Jehova. Na Siria, otu nwatakịrị nwaanyị Izrel nwere okwukwe na onye amụma Jehova ga-agwọli Neeman. Obi siri Ịlaịsha onye amụma ezigbo ike na Jehova ga-anapụta ya n’aka ndị agha chọrọ igbu ya. Jehoyada Nnukwu Onye Nchụàjà chebere otu nwatakịrị nwoke aha ya bụ Jehoash ka nne nna ya bụ́ Atalaya ghara igbu ya n’agbanyeghị na ihe a o mere gaara akpatara ya ọnwụ. Eze Hezekaya tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-anapụta Jeruselem n’aka ndị Asiria. O kweghị achịliri ha aka elu n’agbanyeghị na ha nọ na-eyi ya egwu. Eze Josaya kpochapụrụ arụsị n’Izrel, mee ka ụlọ nsọ dịrị ọcha, meekwa ka ndị Izrel maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 51

Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka

Otu nwatakịrị nwaanyị Izrel gwara nne ya ukwu otú Jehova si e ji ike dị ukwuu o nwere agwọ ọrịa.

ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

Otú onye na-ejere Ịlaịsha ozi si mata na ‘ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.’

ISI NKE 53

Jehoyada Katara Obi

Otu onye nchụàjà na-efe Chineke katara obi gbuo otu eze nwaanyị ọjọọ.

ISI NKE 54

Jehova Nweere Jona Ndidi

Gịnị mere otu nnukwu azụ̀ ji loo onye amụma Chineke? Olee otú o si pụta n’afọ ya? Gịnị ka Jehova ji ihe a kụziere ya?

ISI NKE 55

Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya

Ndị iro Juda kwuru na Jehova agaghị anapụta ha. Ma ihe a ha kwuru abụghị eziokwu.

ISI NKE 56

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ asatọ. O nyekwaara ndị obodo ya aka ife Jehova.