Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Papa Gị na Mama Gị

Papa Gị na Mama Gị

NKEBI NKE 6

Papa Gị na Mama Gị

Papa gị na mama gị ahụla ihe ná ndụ. Ha enwetụla nsogbu ụmụ okoro na agbọghọ na-enwe, marakwa otú mgbanwe niile ha na-ahụ n’ahụ́ ha na-adị. N’eziokwu, ọ bụ ha ga-akacha enyere gị aka ugbu a ị na-eto eto. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka ọ̀ bụ ha so na-akpatara gị nsogbu, kama inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, i nwere ike inwe otu n’ime nsogbu ndị a:

Papa m na mama m na-abara m mba mgbe niile.

Ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya eriela papa m ma ọ bụ mama m ahụ́.

Papa m na mama m na-ese okwu mgbe niile.

Papa m na mama m ebikwaghị.

Isi nke 21 ruo nke 25 ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị a na ndị ọzọ.

[Foto juru ihu peeji nke 172 na nke 173]