Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Akpata Ego?

Olee Otú M Ga-esi Akpata Ego?

 ISI NKE 18

Olee Otú M Ga-esi Akpata Ego?

“Achọrọ m ego m ga-eji azụ ụgbọala.”—Sergio.

“Ọ na-amasị m ịga zụọ ihe.”—Laurie-Ann.

“E nwere ihe ndị mara ezigbo mma m chọrọ inweta; ma papa m na mama m agaghị azụtali ha.”—Mike.

O NWERE ike ịbụ otu ihe ahụ mere i ji chọọ ịkpata ego. Ma ọ bụ, ya abụrụ na ị chọrọ ịkpata ego ị ga-eji na-enyere ezinụlọ unu aka. A sịgodị na ị naghị enye aka n’ego a na-emefu n’ụlọ unu, ịzụrụ uwe ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị gị mkpa nwere ike ime ka ibu dịrị papa gị na mama gị mfe.

Ka o sina dị, ọ bụ ego ka ị ga-eji azụ ihe ị chọrọ ma ọ bụ ihe ezinụlọ unu chọrọ. Ọ bụ eziokwu na Jizọs kwere nkwa na  Chineke ga-enye ndị ‘bu ụzọ na-achọ Alaeze ya’ ihe na-akpa ha, Onye Kraịst kwesịrị ịrụ ọrụ iji nweta ihe o ji egbo mkpa ya. (Matiu 6:33; Ọrụ 18:1-3; 2 Ndị Tesalonaịka 3:10) Oleezi otú ị ga-esi na-akpata ego? Nke ka nke, olee ihe ị ga-eme ka ọ ghara igbochi gị ife Chineke?

Otú E Si Achọta Ọrụ

Ọ bụrụ n’ezie na e nwere ihe dị gị mkpa ị chọrọ ịzụ, ma papa gị na mama gị enweghị ego ya, i nwere ike ịchọ ọrụ ị ga-arụ rụta ego ga-ezuru gị ịzụrụ ya. Gwa papa gị na mama gị na ị chọrọ ịchọ ọrụ. Ihe ị chọrọ ime nwere ike ịtọ ha ụtọ. Ka e were ya na ha kwetara, ya abụrụkwa na o megideghị iwu obodo unu, e nwere ihe anọ ị ga-eme ga-enyere gị aka ịchọta ọrụ.

Gwa ndị mmadụ na ị na-achọ ọrụ. Gwa ndị agbata obi unu, ndị nkụzi gị, na ndị ikwu unu na ị na-achọ ọrụ. Ọ bụrụ na ọ na-eme gị ihere ịgwa ha, i nwere ike jụọ ha ụdị ọrụ ha rụrụ mgbe ha hà ka gị. Ka ị na-agwa ndị mmadụ na ị na-achọ ọrụ, otú ahụ ka ha ga na-agwa gị ebe a chọrọ ndị ọrụ.

Gaa ebe ọ bụla a chọrọ ndị ọrụ. Ọ bụrụ na ị gụta ebe a chọrọ ndị ọrụ n’akwụkwọ akụkọ, n’Ịntanet, ma ọ bụ na bọọdụ ịma ọkwa n’ụlọ ahịa, n’ụlọ akwụkwọ unu ma ọ bụ n’ebe ọzọ ọhaneze na-anọkarị, gaa ebe ahụ chọọ ọrụ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Dave kwuru, sị: “Otú ahụ ka m si chọta ọrụ. Mgbe m hụrụ ụlọ ọrụ ndị na-achọ ndị ọrụ n’akwụkwọ akụkọ, ezigaara m ha akwụkwọ m ji kọwaa ihe  m ga-arụli, kpọọkwa ha n’ekwe ntị.” Ọ bụrụ na ọ dabaghị, i nwere ike ịgwa onye na-ewe mmadụ n’ọrụ na o nwere ihe ị na-arụ nke ga-abara ụlọ ọrụ ya uru.

Dee akwụkwọ iji kọwaa ihe ị ga-arụli ma kesaa ya. Jiri akwụkwọ dee otú a ga-esi enweta gị, ihe ndị ị ma arụ na ọrụ ndị ị rụtụrụla. Ì chere na o nweghị ihe ị ga-ede? Chegodị echiche ọzọ. Ọ̀ dịtụla mgbe papa gị na mama gị mere njem, hapụrụ gị nwanne gị nke ị tọrọ ka i lekọta, ka ị̀ gatụla kuoro ndị ọzọ nwa? Ọ pụtara na ị na-eji ihe akpọrọ ihe. Ì nyetụrụla papa gị aka rụzie ụgbọala unu? Ma eleghị anya, ọ na-egosi na ị ma otú e si arụzi ihe. Ị̀ ma otú e si eji ígwè typewriter ede ihe ma ọ bụ otú e si eji kọmputa arụ ọrụ? Ka ì nwetara akara dị mma n’ụlọ akwụkwọ maka ịrụpụta ihe? Ihe ndị ahụ ka ndị ga-ewe gị n’ọrụ chọrọ. Denyechaa ha n’akwụkwọ i ji akọwa ihe ị ga-arụli. Nyezie ya ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ. Gwakwa ndị enyi gị na ndị ikwu gị ka ha nye ya onye ọ bụla ha ma na-achọ ndị ọrụ.

Na-arụ ọrụ aka. Chee echiche banyere ndị agbata obi unu. È nwere ihe ha chọrọ ka mmadụ na-eresị ha ma ọ bụ ọrụ ha chọrọ ka mmadụ na-arụrụ ha? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị na-enwe mmasị ịkpa ụmụ anụmanụ. I nwere ike ịzụrụ ụmụ ọkụkọ kpawa. Ha too, gị eree ha. Ma ọ bụ, ka e were ya na ị ma otú e si apị ngwá egwú. Ì nwere ike ịkụziri ya ndị ọzọ? Ihe ọzọ i nwere ike ịrụ bụ ọrụ ndị mmadụ na-anaghị achọkarị ịrụ, dị ka ịrụziri ndị mmadụ akpụkpọ ụkwụ. Ịrụ ọrụ aka ekwesịghị ime Onye Kraịst ihere. (Ndị Efesọs 4:28) N’eziokwu, ihe ga-enyere mmadụ aka ịrụ ọrụ aka bụ iji aka ya kpebie ịrụ ya, ịkpa ezi àgwà, na ịdị njikere ịrụ ya.

Cheta: Amalitela ọrụ ahụ n’ebughị ụzọ chọpụta ihe ọ ga-efu gị na ihe a na-arụ na ya. (Luk 14:28-30) Tupu ị malite, gị na papa gị na mama gị kwurịta  ya. Gị na ndị rụtụrụla ụdị ọrụ ahụ kwurịtakwa ya. À ga-achọ ka ị na-akwụ ụtụ isi? Ị̀ ga-enweta akwụkwọ ikike tupu ị rụwa ọrụ ahụ? Chọpụta ihe ndị a n’aka ndị ọchịchị ime obodo ebe unu bi.—Ndị Rom 13:1.

Hazie Ọrụ ahụ nke Ọma

Ka e were ya na ị chọrọ iji ígwè buru ọtụtụ ihe, dị ka akpa ụlọ akwụkwọ gị, bọl, nakwa akpa ihe oriri. Ọ bụrụ na i kekwasị ihe karịrị akarị n’ígwè ahụ, ị ga-ahụ na ọ ga na-ebu gị aka! Ọ bụ otu ihe ahụ ga-eme gị ma ị nara ọrụ ị na-agaghị arụli. Ọ bụrụ na i jiri oge gị niile, ike gị niile na uche gị niile na-arụ ọrụ ahụ mgbe a gbasara ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ịkpatara gị ọrịa ma ọ bụ mee ka ị daa n’ule. Nke ka nke, iji oge gị niile na-arụ ọrụ nwere ike ime ka o siere gị ike ịgachi ọmụmụ ihe na ozi ọma Ndị Kraịst anya, siekwara gị ike ịmụchi Baịbụl anya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Michèle kwetara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, agaghị m ọmụmụ ihe n’ihi na ike gwụrụ m mgbe m lọtara ụlọ akwụkwọ, gaa rụọkwa ọrụ ego.”

 Ekwela ka ego ị chọrọ inweta mee ka ị rụwa ọrụ ga na-ebu gị aka otú ahụ! Jizọs kwuru na ndị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ “ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) O kwukwara, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Maureen gere ntị na ndụmọdụ ahụ. O kwuru, sị: “Achọghị m iji oge m niile na-achụ ego. Ama m na ọ bụrụ na mụ ejiri oge m niile chụwa ego, ọ ga-emebi mmekọrịta mụ na Chineke.”

N’eziokwu, ná mba ụfọdụ, ndị na-eto eto ga-arụrịrị ọrụ ọtụtụ awa iji nyere ezinụlọ ha aka ịdị ndụ. Ma ọ bụrụ na ị nọghị n’ụdị ọnọdụ ahụ, ịrụ ọrụ ọtụtụ awa nwere ike ibu gị aka. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na nwa akwụkwọ na-arụ ọrụ ihe karịrị awa iri abụọ n’izu, nakwa na ọ ga-akpatara ya nsogbu karịrị uru ọ ga-erite. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ọ ka mma ka nwa akwụkwọ na-arụ ọrụ ihe na-akarịghị awa iri n’izu. Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru, sị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.”—Ekliziastis 4:6.

Chetakwa na, “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime ka i jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ife Chineke. (Mak 4:19)  N’ihi ya, ọ bụrụ na i kpebie ịrụ ọrụ ego ma unu gbasaa ụlọ akwụkwọ, hazie ya nke ọma ka ofufe Chineke bụrụ ihe ị ga-ebute ụzọ. Gwa Jehova Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka. Ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu i nwere, meekwa ka i mee ezigbo mkpebi na-agaghị emebi mmekọrịta gị na ya.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 21

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ̀ bụ gị na-achị ego gị, ka ọ̀ bụ ya na-achị gị? Chọpụta otú ị ga-esi na-achị ego gị.

AMAOKWU BAỊBỤL

Ihe na-agụ onye umengwụ, ma ọ dịghị ihe mkpụrụ obi ya nwere. Ma, a ga-eme ka mkpụrụ obi onye dị uchu maa abụba.Ilu 13:4.

NDỤMỌDỤ

Zigara ụlọ ọrụ dị iche iche akwụkwọ i ji akọwa ihe ị ga-arụli n’echeghị ka ha buru ụzọ kwuo na ha chọrọ ndị ọrụ.

Ị̀ MA NA . . . ?

N’ụfọdụ ebe, a naghị akpọsa ihe dị ka ọrụ itoolu n’ime ọrụ iri e nwere.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme iji mee ka ọ dịkwuoro m mfe ịchọta ọrụ bụ ․․․․․

Naanị awa ole m ga-eji na-arụ ọrụ bụ ․․․․․ n’izu ọ bụla.

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee ihe mere i ji chọọ ịkpata ego?

● Olee nsogbu ndị ị ga-enwe ma ị chọta ọrụ?

● Olee otú ị ga-esi mee ka ego ghara ime ka i leghara ofufe Chineke anya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 153]

“Ọ bụrụ na ọ bụ naanị inwe ihe na-eme gị obi ụtọ, ị gaghị enwe obi ụtọ. A ga-enwerịrị ihe ọhụrụ ị ga-achọ inwe. I kwesịrị ịmụta inwe obi ụtọ n’ihe i nwere.”—Jonathan

Igbe dị na peeji nke 155]

Mara Uru Ego Bara, Ahụla Ya n’Anya

Mma dị nkọ na-abara onye bụ́ aka ochie n’isi nri uru. Ma ọ bụrụ na onye na-amaghị otú e si eji mma ahụ ma ọ bụ onye na-anaghị akpachara anya ejiri ya, o nwere ike imerụ onwe ya ahụ́. Ego yiri mma dị nkọ. I jizie ya ejizi, ọ ga-abara gị uru. Ma ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, o nwere ike imerụ gị ahụ́! Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịhụ ego n’anya. Ụfọdụ ndị emebiela adịm ná mma ha na ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha, mebiekwa mmekọrịta ha na Chineke, n’ihi ịchụ ego. O meela ka ha jiri “ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Timoti 6:9, 10) Gịnị ka anyị ga-amụta na ya? Kpachara anya n’otú i si emefu ego. Mara uru ego bara, ma ahụla ya n’anya!

[Foto dị na peeji nke 153]

Ịrụ ọtụtụ ọrụ ga-eme ka o siere gị ike ileba anya n’ihe metụtara ofufe Chineke