Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

 ISI NKE 22

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

Kwuo ụfọdụ iwu e nyere n’ezinụlọ unu. ․․․․․

Ì chere na iwu niile e nyere n’ezinụlọ unu dị mma?

□ Ee □ Ee e

Olee iwu kacha esiri gị ike idebe?

 PAPA gị na mama gị nwere ike na-asị gị mee nke a, emela nke a. Ha nwere ike ịgwa gị mgbe ị ga-arụ ihe ndị nkụzi nyere gị ka ị rụọ n’ụlọ, ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ n’ụlọ, mgbe i kwesịrị ịlọta n’abalị, na iwu ndị ọzọ gbasara ekwe ntị, TV, na kọmputa. Ha nwekwara ike ịgwa gị ihe ndị ị ga na-eme n’èzí, dị ka ụdị àgwà i kwesịrị ịkpa n’ụlọ akwụkwọ na ụdị ndị enyi gị na ha ga na-akpa.

Ọ̀ na-adị gị ka iwu ndị ahụ anaghị ekwe gị megharịa ahụ́? O nwere ike ịdị gị otú ahụ ọ dị ndị na-eto eto ndị a:

“Iwu papa m na mama m nyere m banyere oge m ga na-alọta n’ụlọ n’abalị na-agbakasị m ahụ́! Obi anaghị adị mụ mma ma papa m na mama m gwa m ka m lọta mgbe ụmụaka ndị ọzọ ka nọ n’èzí n’abalị.”Allen.

“Ọ dịghị ihe na-ewe m iwe ka mmadụ ịchọ ịmata ndị mụ na ha na-ekwu okwu n’ekwe ntị. Ọ na-adị m ka à na-eme m ka taata!”Elizabeth.

“Ọ na-adị m ka papa m na mama m achọghị ka mụ na onye ọ bụla na-akpa, ka à ga-asị na ha achọghị ka m nwee ndị enyi!”Nicole.

Ọ bụ ezie na ndị na-eto eto na-adakarị iwu papa ha na mama ha nyere ha, ọtụtụ n’ime ha kwetara na e kwesịrị inwe ụfọdụ iwu n’ụlọ ka nsogbu ghara ịdị. Ma ọ bụrụ na iwu ndị ahụ dị mkpa, gịnị mere ụfọdụ n’ime ha ji akpasu mmadụ iwe?

“Abụghịzi M Taata!”

Ikekwe, ihe mere iwu ndị ahụ ji ewe gị iwe bụ na ọ na-adị gị ka à na-eme gị ka taata, ya adị gị ka ị gwa ha na ị bụghịzi taata. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na papa gị na mama gị na-ele iwu ndị ha na-enye gị anya dị ka ihe dị mkpa iji chebe gị nakwa iji kwadebe gị ịrụ ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ mgbe i toro.

Otú ọ dị, o nwere ike ịdị gị ka i tofeela iwu ndị a ka na-enye gị n’ụlọ. O nwekwara ike ịdị gị ka iwu ndị ahụ ekweghị gị megharịa ahụ́ otú ọ dị otu nwa agbọghọ aha ya bụ Brielle. O kwuru banyere papa ya na mama ya, sị: “Ha echefuola  kpamkpam ihe e kwesịrị imere onye há ka m. Ha anaghị achọ ka m kwuo echiche m, họrọ ihe masịrị m ma ọ bụ ghọọ dimkpa.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị otu nwa agbọghọ aha ya bụ Allison. O kwuru, sị: “O yiri ka papa m na mama m amaghị na m dị afọ iri na asatọ ugbu a, ọ bụghị afọ iri. Ha kwesịrị ịtụkwasịkwu m obi!”

Irube isi n’iwu ndị a na-enye gị n’ụlọ adịghị mfe, nke ka nke, ma o yie ka iwu a na-enye gị karịrị nke a na-enye ụmụnne gị. Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthew chetara ihe ndị mere mgbe ọ dị afọ iri na ụma. O kwuru banyere nwanne ya nwaanyị ọ tọrọ na nwa nwanne papa ya, sị: “Ihe ọ sọkwara ha ha mee, ọ dịghị ihe a na-eme ha!”

Ọ̀ Ka Mma Ka A Ghara Inye Gị Iwu?

O doro anya na o nwere ike na-agụsi gị agụụ ike ịnọrọ onwe gị ka papa gị na mama gị ghara inye gị iwu. Ma, ọ̀ ga-aka baara gị uru n’ezie ma ọ bụrụ na o nweghị iwu ọ bụla ha na-enye gị? I nwere ike ịma ụmụaka ibe gị ndị nwere ike ịlọta mgbe ọ bụla sọrọ ha n’abalị, jie ụdị ejiji ọ bụla masịrị ha, soro ndị enyi ha gaa ebe ọ bụla masịrị ha n’oge ọ bụla masịrị ha. Ma eleghị anya, papa ha na mama ha anaghị enwe efe ịma ihe ụmụ  ha na-eme. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, Baịbụl kwuru na isi otú ahụ azụlite ụmụaka agaghị eme ka ihe dịrị ha mma. (Ilu 29:15) Ihe mere ịhụnanya ji dị ụkọ n’ụwa taa bụ na ọtụtụ ndị na-eche naanị maka onwe ha, a zụlitekwara ha n’ezinụlọ papa na mama na-anaghị enye ụmụ ha iwu.—2 Timoti 3:1-5.

Kama ịchọwa ka ị dị ka ụmụaka a na-ahapụ ka ha mewe otú masịrị ha, gbalịa ghọta na ihe mere papa gị na mama gị ji enye gị iwu bụ na ha hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka ihe dịrị gị mma. Ebe ọ bụ na papa gị na mama gị ji ezi uche na-agwa gị ihe ị ga-eme, ha na-eṅomi Jehova Chineke, bụ́ onye gwara ndị ya, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”—Abụ Ọma 32:8.

Ma, o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka papa gị na mama gị hà na-enye gị ọtụtụ iwu. Olee otú ị ga-esi mee ka ha nyetụ gị ohere?

Ụdị Nkwurịta Okwu Bara Uru

Ma ị̀ chọrọ ka papa gị na mama gị nyekwuo gị ohere ma ọ bụ ka ị ghọta ihe mere ha ji nye gị iwu ndị ahụ, ihe ga-enyere gị aka bụ gị na ha ikwurịta okwu nke ọma. Ụfọdụ nwere ike ikwu, sị: ‘Agbalịala m ka mụ na ha kwurịta okwu, ma, o nweghị isi!’ Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kwesịrị imezikwu otú m si ekwu okwu?’ Nkwurịta okwu bụ ihe dị mkpa nke (1) ga-eme ka ndị ọzọ ghọta gị ma ọ bụ (2) mee ka ị ghọta ihe mere ha ekweghị eme ihe ị chọrọ. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọrọ ka papa gị na mama gị na-eme gị ka onye toro eto, i kwesịrị ịna-ekwu okwu ka onye toro eto. Olee otú ị ga-esi eme ya?

 Mụta ijide onwe gị. Njide onwe onye na-eme ka mmadụ na mmadụ na-ekwurịta okwu nke ọma. Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.” (Ilu 29:11) N’ihi ya, zere ịtamu ntamu, iji iwe agbachi nkịtị, na iwe iwe ka ụmụaka. N’eziokwu, i nwere ike chọọ ịkwachi ụzọ n’ike ma ọ bụ na-aga ije iwe iwe mgbe papa gị na mama gị na-ekweghị gị mee ihe ị chọrọ ime. Otú ọ dị, àgwà dị otú ahụ nwere ike ime ka ha nyekwuo gị iwu—ọ bụghị inyekwu gị ohere.

Gbalịa ghọta ihe papa gị na mama gị na-ekwu. Otu Onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ Tracy, bụ́ onye mama ya naanị zụrụ, kwuru, sị: “Ana m ajụ onwe m, sị, ‘Olee ihe mere mama m ji enye m iwu ndị a?’” Gịnị ka Tracy chọpụtara? O kwuru, sị: “Ọ chọrọ inyere m aka ka m bụrụ ezigbo mmadụ.” (Ilu 3:1, 2) Ọ bụrụ na ị ghọta ihe papa gị na mama gị bu n’obi, o nwere ike ime ka ị mata otú gị na ha ga-esi na-ekwurịta okwu nke ọma.

Dị ka ihe atụ, ka e were ya na papa gị na mama gị achọghị  ka ị gaa otu nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. Kama ịrụwa ha ụka, i nwere ike ịjụ ha, sị: “Ọ́ bụrụkwanụ na enyi m toro eto, bụ́ ezigbo mmadụ, esoro m?” Ma eleghị anya, ha agaghị ekwe gị gaa. Ma ọ bụrụ na ị ghọta ihe mere ha ji jụ, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịtụ aro ha ga-anabata.

Mee ka papa gị na mama gị tụkwasị gị obi. Ka e were ya na mmadụ ji ụlọ akụ̀ ụgwọ. Ọ bụrụ na onye ahụ akwụọ ụgwọ o ji n’oge, ụlọ akụ̀ ahụ ga-atụkwasị ya obi. Ha nwedịrị ike ịgbazinyekwu ya ego n’oge ọzọ. Otú ahụ ka ọ dị n’ezinụlọ. I kwesịrị ịsọpụrụ papa gị na mama gị. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ga-eme ka ha tụkwasị gị obi ugbu a—ọbụnadị n’obere ihe—ha nwere ike ịtụkwasịkwu gị obi n’oge ọzọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na ị na-enupụrụ ha isi mgbe niile, ya ejula gị anya na ha agaghị atụkwasịcha gị obi ma ọ bụkwanụ ha nwere ike nyowe ihe ọ bụla i mere enyo.

 Mgbe Ị Dara Iwu

Mee elu mee ala, ị ga-adarịrị iwu papa gị na mama gị nyere gị, ya bụ, mgbe ị na-arụghị ọrụ a gwara gị rụọ n’ụlọ, mgbe ị nọrọ ogologo oge na fon ma ọ bụ nọfee oge a gwara gị lọta n’abalị. (Abụ Ọma 130:3) Ị ga-akọwara ha ihe mere i ji daa iwu ahụ! Gịnị ka ị ga-eme ka nsogbu ghara ịka njọ?

Gwa ha eziokwu. Achọtala otu ihe kọọrọ ha. I mee otú ahụ, o nweghịzi ihe i kwuru ga-adị ha ka ọ̀ bụ eziokwu. N’ihi ya, gwa ha eziokwu nakwa otú ihe si mee. (Ilu 28:13) Emela ka à ga-asị na ihe i mere dị mma ma ọ bụ na ihe i mere abụghị oké ihe. Echefula na “azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.”—Ilu 15:1.

Rịọ mgbaghara. I kwesịrị igosi na ihu i mechuru ha, ọrụ i nyekwuru ha, na obi ọjọọ i mere ha wutere gị. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ha ghara imesi gị ike. Otú ọ dị, mwute ahụ kwesịrị isi gị n’obi.

 Buru ihe ọ bụla si na ya pụta. (Ndị Galeshia 6:7) Ihe mbụ i nwere ike ịchọ ime bụ ịjụ ntaramahụhụ a chọrọ inye gị, nke ka nke, ma ọ́ dị gị ka e kwesịghị inye gị ụdị ntaramahụhụ ahụ. Otú ọ dị, iburu ihe si n’ihe i mere pụta na-egosi na ị bụ dimkpa. Ihe kacha mma i nwere ike ime bụ ịgba mbọ ka papa gị na mama gị malite ịtụkwasị gị obi ọzọ.

N’ihe atọ ahụ e kwuru, dee nke i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya karịchaa. ․․․․․

Cheta na ọ bụ papa gị na mama gị kwesịrị ịgwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo banyere “ihe nna gị nyere n’iwu” nakwa “iwu nne gị.” (Ilu 6:20) Ka o sina dị, i kwesịghị iche na iwu papa gị na mama gị na-enye gị ga-emebiri gị ihe. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na ị na-erubere papa gị na mama gị isi, Jehova kwere nkwa na ‘ihe ga-agaziri gị’!—Ndị Efesọs 6:1-3.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BỤ ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 3

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya ò riela papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́? Mụta otú ị ga-esi die ya.

AMAOKWU BAỊBỤL

Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee gaziere gị.Ndị Efesọs 6:2, 3.

NDỤMỌDỤ

Ị chọọ ka papa gị na mama gị na-enyekwu gị ohere, ihe mbụ ị ga-eme bụ irube isi mgbe niile n’iwu ha nyere. Ọ bụrụ na ị na-erubere ha isi mgbe niile, ha nwere ike imere gị ihe ị chọrọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Nchọpụta e mere gosiri na ndị na-eto eto ndị papa ha na mama ha ji ịhụnanya na-eme ka e debe iwu ha nyere na-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ. Ha na-akakwa enwe obi ụtọ.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na m daa iwu papa m na mama m, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m ga-eme ka papa m na mama m tụkwasị m obi bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị nwere ike ime ka ọ dị ka papa gị na mama gị anaghị ekwe gị megharịa ahụ́ mgbe ụfọdụ?

Gịnị mere i ji ewe iwe mgbe ụfọdụ ma papa gị na mama gị nye gị iwu?

Olee otú ị ga-esi mee ka gị na papa gị na mama gị na-ekwurịta okwu nke ọma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 183]

“Mgbe ị bụ nwata, ị na-eche na ị ma ihe niile. N’ihi ya, mgbe papa gị na mama gị nyere gị iwu, o nwere ike iwe gị iwe. Ma iwu ha nyere gị bụ ka ihe dịrị gị mma.”—Megan

Igbe dị na peeji nke 186]

Ọ̀ Bụ n’Ezie Imelara Mmadụ Ihe?

Ọ̀ dịtụla mgbe ị jụrụ, sị: ‘Gịnị mere otú ndị papa na ndị mama si akpaso ụmụ ha niile àgwà anaghị abụ otu?’ Ọ bụrụ otú ahụ, chegodị echiche: Ọ dịchaghị mma ka papa gị na mama gị na-akpaso gị àgwà mgbe niile otú ha si akpaso ụmụnne gị. Ma, ajụjụ bụ, Hà na-egboro gị mkpa gị? Dị ka ihe atụ, mgbe ọ bụla ị chọrọ ka papa gị na mama gị nye gị ndụmọdụ ma ọ bụ nyere gị aka, hà na-enyere gị aka? Ọ bụrụ na ha na-enyere gị aka, ì kwesịrị ikwu na ha na-eleghara gị anya? Ebe ọ bụ na mkpa gị na nke ụmụnne gị abụghị otu, echela na papa gị na mama gị ga-akpaso gị àgwà otú ha si akpaso ụmụnne gị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Beth mechara ghọta ya otú ahụ. O kwuru, sị: “Mụ na nwanne m nwoke abụghị otu, otú e si akpaso anyị àgwà ekwesịghị ịbụ otu. M cheta mgbe m dị obere, ọ na-eju m anya ihe mere na aghọtaghị m ya otú ahụ mgbe ahụ.”

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 189]

Ebe M Dere Ihe

Gị na Papa Gị na Mama Gị Kwurịta Ya!

Isiokwu abụọ gara aga kwuru ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-abara gị mba mgbe niile ma na-enye gị ọtụtụ iwu. Ọ́ bụrụkwanụ na ọ dị gị ka hà na-abara gị mba mgbe niile ma ọ bụ na-enye gị ọtụtụ iwu, ma ọ bụkwanụ na-eme ha abụọ? Ị chọọ ka gị na ha kwurịta ya, olee otú ị ga-esi amalite?

Gakwuru ha mgbe obi dị gị mma na mgbe ọ na-enweghị oké ihe ha na-eme.

Gwa ha otú obi dị gị, ma ejila iwe ekwu ya. Kwanyere ha ezigbo ùgwù.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka papa gị na mama gị hà na-abara gị mba mgbe niile, i nwere ike ikwu, sị: “Ana m agbalịsi ike ime ihe dị mma, ma ọ na-esiri m ike ma ọ bụrụ na a na-abara mụ mba mgbe niile. Achọrọ m ka anyị kwurịta ya?”

Dee n’okpuru ebe a otú ga-esi malite ịgwa ya papa gị na mama gị.

․․․․․

NDỤMỌDỤ: Jiri ihe ndị e kwuru n’Isi nke 21 malite. Ma eleghị anya, papa gị na mama gị ga-achọ ka unu kwurịta ihe e kwuru n’isiokwu ahụ.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka papa gị na mama gị ekwechaghị gị megharịa ahụ́, i nwere ike ikwu, sị: “Achọrọ m ịkpakwu àgwà ọma ka unu nyetụkwuo m ohere ka oge na-aga. Olee àgwà unu chere m kwesịrị imezikwu?”

Dee n’okpuru ebe a otú ga-esi malite ịgwa ya papa gị na mama gị.

․․․․․

NDỤMỌDỤ: Gụghachi Isi nke 3 na Nwanne Akwụkwọ A E Bu Ụzọ Bipụta. Isiokwu ya bụ, “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ndị Mụrụ M Nyekwuo M Nnwere Onwe?” Dezie ajụjụ ndị i nwere ike inwe mgbe ị gụchara isiokwu a.

[Foto dị na peeji nke 184 na 185]

Irube isi n’iwu papa gị na mama gị yiri ịkwụ ụgwọ i ji n’ụlọ akụ̀—ka ị na-akwụ ụlọ akụ̀ ụgwọ n’oge, otú ahụ ka ha ga na-agbazinye gị ego