Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Achọ Ka M Zuo Okè?

Gịnị Mere M Ji Achọ Ka M Zuo Okè?

 ISI NKE 27

Gịnị Mere M Ji Achọ Ka M Zuo Okè?

Iwe ọ̀ na-ewe gị ma e nwee ihe ị dara n’ule?

□ Ee

□ Ee e

Ọ̀ na-adị gị ka o nweghị uru ị bara ma a baara gị mba n’ihe ọ bụla?

□ Ee

□ Ee e

Ọ̀ na-esiri gị ike gị na ndị mmadụ ịbụ enyi n’ihi na o nweghị onye na-emeta ihe otú ị chọrọ?

□ Ee

□ Ee e

Ọ BỤRỤ na ị zara ee n’otu ma ọ bụ karịa n’ajụjụ ndị ahụ, o nwere ike ịbụ na nsogbu gị bụ na ị na-achọ ka i zuo okè. I nwere ike ịjụ, sị: ‘Ò nwere ihe dị njọ ma mmadụ chọọ imetacha ihe niile?’ Mbanụ. Baịbụl jara onye “nwere nkà n’ọrụ ya” mma. (Ilu 22:29) Ma onye na-achọ ka o zuo okè na-emefe ihe okè.

Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Jason kwuru, sị: “N’afọ  ikpeazụ m n’ụlọ akwụkwọ, echere m na m daa ihe ọ bụla n’ule, ọ pụtara na abụghị m ezigbo nwa akwụkwọ. Ana m apịkwa ngwá egwú pịano. Ana m echebu na m kwesịrị ịpị ya otú ahụ ndị na-akụ egwú si apị ya.”

Ịchọ izu okè nwekwara ike ime ka mmadụ ghara ife Chineke nke ọma. Chegodị ihe nwere ike ime onye na-eto eto a na-ejikarị ama atụ. Ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-elekarị ya anya, o nwere ike na-eche na ya nọ ná nsogbu, na mmadụ niile na-enyocha ụkwụ ọ bụla ọ zọrọ n’ala. N’eziokwu, Ndị Kraịst niile na-erite uru n’aka ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ. Otú ọ dị, ịchọ izu okè n’ihe niile nwere ike ime ka onye na-eto eto ghara inwe ọṅụ n’ozi Chineke. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee, e kwesịrị inyere onye ahụ aka. Ma o nwere ike onye ahụ agaghị ekwu ka e nyere ya aka, na-eche na ya kwuo, ya emechuo ndị ji ya ama atụ ihu. O nwedịrị ike kwụsịchaa ịna-agbalị, na-eche, sị, ‘Ebe ọ bụ na o kweghị m omume imetacha ihe niile, oleezi uru ọ bara ịgbalịwa?’

Achọla Ka I Zuo Okè

Ndị na-achọ izu okè na-ebu n’obi na mmadụ ekwesịghị imejọ ihe ọ bụla. N’ezie, echiche ahụ abụghị eziokwu. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ọ gaghị ekwe onye ọ bụla n’ime anyị omume izucha okè. N’eziokwu, ọ bụrụ na i kweta na i nwere ike imetacha ihe niile, o yiri ikweta  na i nwere ike ịwụli elu, fewe ka nnụnụ. Otú ọ sọrọ gị kweresie ike na ị ga-efeli, o mekataghị mee eme n’ụwa!

Olee ihe ị ga-eme ka ị ghara iche na i kwesịrị izu okè? Megodị ihe ndị a:

Chebara ihe “ime nke ọma” pụtara echiche. Ị̀ na-adọlịgbu onwe gị ebe ị na-achọ ka ị bụrụ ọkaibe? Baịbụl kwuru na ụdị mgbalị ahụ yiri “ịchụso ifufe.” (Ekliziastis 4:4) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-achọ ịbụ “ọkaibe” enwebeghị ike ime ya. Ọ bụrụgodị na mmadụ aghọọ ọkaibe n’otu ihe, ọ gaghị egbu oge, onye ọzọ emewe ihe ahụ karịa ya. Ime nke ọma pụtara ime ihe i nwere ike ime—ọ bụghị ime karịa onye ọzọ.Ndị Galeshia 6:4.

Tụọ anya ihe ị ga-emeli. Ihe ị na-atụ anya ime kwesịrị ịbụ ihe i nwere ike ime, ọ bụghị ihe ị na-agaghị emeli. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya ime ihe karịrị gị, o nwere ike ịpụta na ị dịghị umeala n’obi, nakwa na ị na-ebuli onwe gị elu. Pọl onyeozi  nyere ezigbo ndụmọdụ, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.” (Ndị Rom 12:3) N’ihi ya, tụọ anya ihe ị ga-emeli. Gbanwee ihe ị na-atụ anya na ị ga-emeli. Gbalịa mee ike gị, ma achọla izu okè.

Na-achị ọchị! Gbalịa na-emetụ ihe ị na-amachaghị eme, dị ka ịpị ngwá egwú. N’eziokwu, ị ga-emejọ ya ọtụtụ ugboro. Ma, gbalịa ugbu a lee ihe ahụ i mejọrọ anya n’ụzọ ọzọ. Baịbụl  kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị.” (Ekliziastis 3:4) N’ihi ya, ọ ka mma ka ị chịfuo ya n’ọchị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-ahụ na imejọ ihe ga-enyere gị aka ịmụta ihe. N’eziokwu, o nwere ike siere gị ike ikweta na i mejọrọ ihe. Ma gbalịa ka ị ghara ichere onwe gị echiche ọjọọ ma ọ bụ na-akatọ onwe gị.

Echefula na ihe Jehova chọrọ n’aka anyị abụghị izu okè, kama ọ bụ ka anyị kwesị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. (1 Ndị Kọrịnt 4:2) Ọ bụrụ na ị na-agbalị ikwesị ntụkwasị obi, ị ga-enwe obi ụtọ n’ihe i nwere ike ime—n’agbanyeghị na i zughị okè.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọtụtụ ndị taa chere na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị dị mma. Olee otú ị ga-esi zere ya? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị ime ya?

AMAOKWU BAỊBỤL

E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.Ekliziastis 7:20.

NDỤMỌDỤ

Chee echiche ihe i kwesịrị ime ị na-emebeghị n’ihi na ị na-atụ ụjọ na ị gaghị emetacha ya. Kpebie ụbọchị ị ga-emecha ya.

Ị̀ MA NA . . . ?

Jehova zuru okè, ma ọ naghị atụ anya ka ndị mmadụ na-ezughị okè metachaa ihe niile. Ọ bụghị naanị na ọ ma ihe anyị na-agaghị emeli, kama ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli.

IHE M GA-EME!

Mgbe ọ bụla m katọwara onwe m, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na mụ akatọwa ndị ọzọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● N’ihe niile ị na-eme, ò nwere ebe ị na-atụkarị anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli? Ọ bụrụ na e nwere, olee ebe ọ bụ?

● Olee ebe Baịbụl kwuru hoo haa na Jehova anaghị atụ anya ka ndị ohu ya zuo okè?

● Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ na-agbara gị ọsọ ma ọ bụrụ na ị na-atụ anya ka mmadụ zuo okè?

● N’ọdịnihu, olee ihe ị ga-eme ma i mejọọ ihe?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 226]

“Ime ihe i nwere ike ime na ịchọ ka i metachaa ihe niile abụghị otu ihe; otu dị mma, ma nke ọzọ adịghị mma.”—Megan

Igbe dị na peeji nke 228]

Otú Ịchọ Izu Okè Si Emetụta Imeta Enyi

Ị̀ na-eze ndị mmadụ eze n’ihi na ha anaghị emeta ihe otú ị chọrọ? Ka ndị ezigbo mmadụ hà na-agbara gị ọsọ n’ihi na ihe ị chọrọ ka ndị ga-abụ enyi gị na-eme anaghị ekwe ha omume? Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Abụla onye ezi omume gabiga ókè, egosikwala na ị bụ onye maara ihe gabiga ókè. Gịnị mere ị ga-eji kpatara onwe gị mbibi?” (Ekliziastis 7:16) Otu ụzọ onye na-achọ ka mmadụ zuo okè si akpatara onwe ya mbibi bụ ime ka ndị gaara abụ ndị enyi ya gbawara ya ọsọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Amber kwuru, sị: “O nweghị onye chọrọ ka ya na onye na-akpasu ya iwe na-akpa. Ahụkwala m ebe ndị na-achọ ka mmadụ zuo okè na ezigbo ndị enyi ha tisara n’ihi ntakịrị ihe.”

[Foto dị na peeji nke 229]

Mmadụ ịgbalị imetacha ihe niile bụ iberiibe dị ka mmadụ ịchọ ife ka nnụnụ