Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ekwesịghị M Ile Foto Ndị Gba Ọtọ?

Gịnị Mere Ekwesịghị M Ile Foto Ndị Gba Ọtọ?

 ISI NKE 33

Gịnị Mere Ekwesịghị M Ile Foto Ndị Gba Ọtọ?

Ugboro ole ka ị na-ahụ foto ndị gba ọtọ na mberede?

□ Anaghị m ahụ ya

□ Ọ na-ara ahụ́

□ Mgbe niile

Olee ebe ị na-ahụkarị ya?

□ N’Ịntanet

□ N’ụlọ akwụkwọ

□ Na TV

□ N’ebe ọzọ

Gịnị ka ị na-eme ma ị hụ ya?

□ Ana m apụ ozugbo.

□ Ana m eletụ ya anya ka m mata otú ọ dị.

□ Ana m eleru ya anya, na-achọdị ọzọ.

 MGBE papa gị na mama gị hà ka gị, ndị chọrọ ile foto ndị gba ọtọ na-achọ ya achọ. Taa, ọ dị ka ọ̀ na-achụzi ndị mmadụ ọsọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu kwuru, sị, “Mgbe ụfọdụ n’Ịntanet, ọ na-abụ m na-achọ ihe, na-azụ ihe, ma ọ bụ sị ka m lee akwụkwọ ụlọ akụ̀ ziteere m, foto ndị gba ọtọ apụta na mberede!” Ọ na-eme eme. N’otu nchọpụta e mere, n’ime mmadụ iri bụ́ ndị na-eto eto dị agbata afọ asatọ na afọ iri na isii, mmadụ itoolu kwuru na ha ahụtụla foto ndị gba ọtọ n’Ịntanet n’amaghị ama—ọ na-abụkarị mgbe ha na-arụ ihe ndị nkụzi nyere ha ka ha rụọ n’ụlọ!

Ebe ọ bụ na foto ndị gba ọtọ juru ebe niile, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ dị njọ ile ya?’ Azịza ya bụ ee! Ile foto ndị gba ọtọ na-eme ka ndị e sere foto ha na ndị na-ele ya ree ùgwù ha. Ọ na-emekarị ka ndị mmadụ kwaa iko. Ma e nwere nsogbu ndị ọzọ ọ na-akpata.

Ile foto ndị gba ọtọ nwere ike iri mmadụ isi, kpatara ya nsogbu na-anaghị akwụsị akwụsị. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere otu nwoke aha ya bụ Jeff, bụ́ onye kwụsịrị ile foto ndị gba ọtọ. Mgbe afọ iri na anọ gachara, o kwuru, sị: “Mụ na ya ka na-alụ ọgụ kwa ụbọchị. N’agbanyeghị na ọ naghịzi agụsi m agụụ ike ile ya, ọ ka na-agụ m. M ka na-achọ ile ya. Ndị m lere ele apụbeghị m n’isi. A sị na m ma, agaraghị m amalitedị omume ọjọọ a. Mgbe m malitere ile ya, echere m na o nweghị ihe ọ ga-eme m. Ma, anya edoola m ugbu a. Ile foto ndị gba ọtọ na-emebi ihe. Ọ rụrụ arụ. Ọ na-ewedakwa ma ndị e sere foto ha ma ndị na-ele ya ala. N’agbanyeghị ihe ndị na-akwado ya nwere ike ikwu, o nwetụdịghị uru ọ bụla dị n’ile foto ndị gba ọtọ.”

 Tụlee Ihe Nwere Ike Ime Ka Ị Hụ Ya

Gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịhụ foto ndị gba ọtọ n’amaghị ama? Buru ụzọ tụlee ihe nwere ike ime ka ị hụ ya. Ò nwere ihe na-emekarị ka ị hụ ya? Tụlee ihe atụ ndị a:

Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe gị hà nwere ike iji kọmputa ma ọ bụ ekwe ntị zitere gị foto ndị gba ọtọ? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ka mma ịkagbu ozi ha n’emepeghị ya emepe.

Mgbe ị na-achọ ihe n’Ịntanet, ò nwere okwu ụfọdụ ọ̀ na-abụ i denye, gị enweta ozi na-agwa gị ka i mepee ebe ọzọ n’Ịntanet? Ọ bụrụ na ị ma na o nwere ike ime, ọ ga-eme ka ị kpachara anya nke ọma n’okwu ndị ị na-edenye mgbe ị na-achọ ihe.

N’okpuru ebe a, dee ihe ndị merela ka ị hụpere foto ndị gba ọtọ.

․․․․․

Ọ̀ dị ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịhụpere ya mgbe ọzọ? Ọ bụrụ na ọ dị, dee ihe i bu n’obi ime n’ebe a.

․․․․․

Ọ Bụrụ na O Riela Gị Isi

Ịhụ foto ndị gba ọtọ na mberede na ịkpachara anya na-ele ya abụghị otu. Ọ́ bụrụkwanụ na o riwela gị isi?  N’eziokwu, ịkwụsị ya adịghị mfe. Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na e ji eriri na-esighị ike kekọta gị aka abụọ. I nwere ike ịdọbi ya ma i mee ka ị̀ na-agbasa aka gị. Ma ọ́ bụrụkwanụ na ọ bụ eriri siri ike? Ịdọbi ya ga-esitụrụ gị ike. Ọ bụ ụdị ihe ahụ na-eme ndị na-ele foto ndị gba ọtọ mgbe niile. Ka ha na-elekwu ya, otú ahụ ka ọ na-ekekwu ha agbụ. Olee otú ị ga-esi akwụsị ile foto ndị gba ọtọ ma ọ bụrụ na o keela gị agbụ?

Ghọta na ile foto ndị gba ọtọ jọgburu onwe ya. N’eziokwu, foto ndị gba ọtọ bụ ihe Setan ji agbalị imebi ihe Jehova kere ka a na-akwanyere ùgwù. Ịghọta foto ndị gba ọtọ otú ahụ ga-enyere gị aka ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’—Abụ Ọma 97:10.

Cheta nsogbu ọ ga-akpatara gị. Ile foto ndị gba ọtọ na-eme ka di na nwunye tisaa. Ọ na-ere ùgwù ndị e sere  foto ha. Ọ na-emebikwa ùgwù onye na-ele ya. Baịbụl nwere ezigbo ihe mere o ji sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Dee ọdachi nwere ike ịdakwasị gị ma ọ bụrụ na ị na-ele foto ndị gba ọtọ.

․․․․․

Gị na anya gị gbaa ndụ. Job bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, sị: “Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwagbọghọ ọ bụla anya ọjọọ.” (Job 31:1, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe ụfọdụ i nwere ike ‘ikpebi’ ime bụ:

Agaghị m aga n’Ịntanet mgbe naanị m nọ n’ụlọ.

M nọrọ n’Ịntanet nweta ozi ma ọ bụ hụ ebe na-egosi omume rụrụ arụ, m ga-emechi ya ozugbo.

Ọ bụrụ na mụ elee ya ọzọ, m ga-agwa enyi m torola eto.

Ì nwere ike icheta otu ihe ma ọ bụ abụọ ọzọ ị ga-ekpebi ime, ga-eme ka ị ghara ile foto ndị gba ọtọ? I cheta, dee ha ebe a.

․․․․․

Tinye ya n’ekpere. Otu ọbụ abụ kpekuru Jehova  ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” (Abụ Ọma 119:37) Jehova Chineke chọrọ ka ị ghara ile ya. Ọ ga-enye gị ike ime ihe ziri ezi!—Ndị Filipaị 4:13.

Kọọrọ ya mmadụ. Ọ bụrụ na i nwee onye ị na-akọrọ ihe dị gị n’obi, ọ ga-enyere gị aka ịkwụsị omume ahụ. (Ilu 17:17) Dee aha onye torola eto obi ga-eru gị ala ịgwa ya.

․․․․․

Ka obi sie gị ike na i nwere ike ịkwụsị ile foto ndị gba ọtọ. N’eziokwu, mgbe ọ bụla ị na-eleghị ya, i nweela otu mmeri doro anya. Kọọrọ Jehova banyere mmeri ahụ, keleekwa ya maka ike o nyere gị. Ile foto ndị gba ọtọ bụ ọrịa. Na-echeta na ọ bụrụ na ị kwụsị ya, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11.

AMAOKWU BAỊBỤL

Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.Ndị Kọlọsi 3:5.

NDỤMỌDỤ

Hụ na kọmputa gị nwere ihe na-eme ka mmadụ ghara ịbanye n’ebe foto ndị gba ọtọ dị. Ọ bụrụkwa na onye ị na-amaghị ejiri kọmputa zitere gị ozi, apịla ebe ọ sịrị gị pịa.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na ara ile foto ndị gba ọtọ na-agba mmadụ, o yiri ara mmekọahụ ahụ gbara ndị mmụọ ọjọọ n’oge Noa.—Jenesis 6:2.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme ga-enyere m aka izere ebe e nwere foto ndị gba ọtọ bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee otú foto ndị gba ọtọ si emebi ihe e kwesịrị ịkwanyere ùgwù?

Olee otú ị ga-esi enyere nwanne gị ị tọrọ aka ma ọ bụrụ na ọ na-ele foto ndị gba ọtọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 278]

“Mgbe m na-amalitebeghị ịmụ Baịbụl, o siri ike ịhụ ụdị ọgwụ ike na-erighị m ahụ́. Ma n’ime ihe niile riri m ahụ́, nke kacha siere m ike ịkwụsị bụ ile foto ndị gba ọtọ. Ọ bụ naanị aka Jehova nyeere m mere ka m kwụsị ya.”—Jeff

[Foto dị na peeji nke 276]

Ile foto ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́—ka mmadụ na-ele ya, otú ahụ ka ọ na-esikwuru ya ike ịkwụsị ya