Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Arịakarị Ọrịa?

Gịnị Mere M Ji Arịakarị Ọrịa?

 ISI NKE 8

Gịnị Mere M Ji Arịakarị Ọrịa?

“Mgbe ị bụ nwata, ị na-eche na ị bụ anwụ anwụ. Ma, na mberede, ezigbo ọrịa emee ka anya doo gị. Ya adị gị ka ị̀ ghọọla agadi n’otu ntabi anya.”—Jason.

MGBE Jason dị afọ iri na asatọ, ọ chọpụtara na ya na-arịa ọrịa a na-akpọ kron, ya bụ, ọrịa afọ na-egbu mgbu, nke na-agwụ ike. O nwere ike ịbụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụkwanụ nwee nkwarụ. Ihe ọtụtụ ndị na-eme n’onwe ha nwere ike ịbụrụ gị ọgụ na mgba, ya bụ, ihe ndị dị ka iyiri uwe, iri nri ma ọ bụ ịga ụlọ akwụkwọ.

Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, o nwere ike ịdị gị ka à tụrụ gị mkpọrọ, n’ekweghị gị megharịa ahụ́. Owu nwere ike na-ama gị. I nwedịrị ike na-eche ma ì meela ihe were Chineke iwe ma ọ bụkwanụ ma Chineke ọ̀ na-anwa gị ọnwụnwa pụrụ iche iji mara ma ì kwesịrị ntụkwasị obi. Otú ọ dị,  Baịbụl kwuru, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ọrịa so n’ihe na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ ugbu a, “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” nwekwara ike ịbịakwasị anyị niile.—Ekliziastis 9:11.

Obi dị anyị ụtọ na Jehova Chineke kwere nkwa ụwa ọhụrụ nke ‘ọ na-adịghị onye bi na ya ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.”’ (Aịzaya 33:24) A ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, ka ha nwee ike ibi ndụ n’ụwa ọhụrụ ahụ. (Jọn 5:28, 29) Ma, ka ọ dịgodị, olee ihe kacha mma i nwere ike ime ugbu a?

Gbalịa ka i nwee olileanya. Baịbụl kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 17:22) Ụfọdụ nwere ike chee na mmadụ ịchị ọchị na inwe obi ụtọ mgbe ọ na-arịa ezigbo ọrịa abaghị uru ọ bụla. Ezigbo ọchị na ezi ndị enyi nwere ike ime ka obi ruo gị ala, meekwa ka ike ụwa ghara ịgwụ gị. N’ihi ya, chee echiche ihe ị ga-eme ka obi na-atọ gị ụtọ. Cheta na ọṅụ bụ otu n’ime àgwà e ji mara Chineke, o sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya. (Ndị Galeshia 5:22) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka iji ọṅụ na-edi ọrịa ahụ.—Abụ Ọma 41:3.

Nwee ihe mgbaru ọsọ ị ga-eruli. Baịbụl kwuru, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Ezi uche ga-enyere gị aka ka ị ghara iji ndụ gị na-egwuri  egwu ma ọ bụ na-eche na o nweghị ihe ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị, ịrụtụ ọrụ kwesịrị ekwesị nwere ike ime ka i nwetakwuo onwe gị. Ọ bụ ya mere e ji enwe ebe ụmụ okoro na agbọghọ ndị na-arịa ọrịa na-emega ahụ́ n’ụlọ ọgwụ. Ọtụtụ mgbe, mmega ahụ́ kwesịrị ekwesị ga-eme ka ị gbakee ngwa ngwa, meekwa ka ike ụwa ghara ịgwụ gị. Ihe dị mkpa ị ga-eme bụ ileru ọnọdụ gị anya nke ọma ma nwee ihe mgbaru ọsọ ị ga-eruli.

Mụta otú ị ga-esi na-akpaso ndị ọzọ àgwà. Gịnị ka ị ga-eme ma ndị ọzọ jiri ọrịa gị na-akọ gị ọnụ? Baịbụl kwuru, sị: ‘Etinyela obi gị n’okwu niile ndị mmadụ pụrụ ikwu.’ (Ekliziastis 7:21) Mgbe ụfọdụ, ihe kacha mma ị ga-eme bụ ịgbachi ha nkịtị. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ịna-akọ gị ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ahụ́ anaghị eru ndị mmadụ ala ma ị bịa ebe ha nọ n’ihi na ị na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ, gbalịa mee ka ahụ́ na-eru ha ala. I nwere ike ịsị onye ahụ: “Ị̀ ma ihe mere m ji anọ n’ígwè a? Ị̀ chọrọ ka m kọọrọ gị?”

Adala mbà. Mgbe Jizọs na-ahụsi anya, o kpekuru Chineke ekpere, tụkwasị ya obi ma lekwasị anya n’ọṅụ ọ ga-enweta n’ọdịnihu kama ilekwasị anya n’ihe mgbu ya. (Ndị Hibru 12:2) Ahụhụ ọ tara kụziiri ya ihe. (Ndị Hibru 4:15, 16; 5:7-9) Ọ nabatara enyemaka na agbamume e nyere ya. (Luk 22:43) O lekwasịrị anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ kama ilekwasị anya n’ahụhụ ọ na-ata.—Luk 23:39-43; Jọn 19:26, 27.

‘Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi’

N’agbanyeghị ụdị ọrịa ị na-arịa, echela na Chineke na-ele gị anya dị ka onye na-abaghị uru. Kama nke ahụ, Jehova weere ndị na-agbalịsi ike ime ihe na-atọ ya ụtọ dị ka ndị  dị oké ọnụ ahịa na ndị bara uru. (Luk 12:7) ‘Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi,’ obi dịkwa ya ụtọ ime ka ị na-ejere ya ozi, n’agbanyeghị na ị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ.—1 Pita 5:7.

N’ihi ya, ekwela ka ụjọ mee ka ị ghara ime ihe ị chọrọ ime na ihe i kwesịrị ime. Lekwasị Jehova Chineke anya mgbe niile ka o nyere gị aka. Ọ ma mkpa gị na otú obi na-adị gị. Ọ ga-enyekwa gị “ike karịrị ike nkịtị” nke ga-enyere gị aka idi ya. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ka oge na-aga, i nwere ike inwe ụdị olileanya otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Timothy nwere, bụ́ onye a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa oké ike ọgwụgwụ. O kwuru, sị: “Dị ka 1 Ndị Kọrịnt 10:13 si kwuo, Jehova agaghị ekwe ka anyị rịa ọrịa anyị  na-agaghị edili. Otú m si lee ya anya bụ na ọ bụrụ na obi siri onye kere m ike na m ga-edili ọrịa a, gịnị mere m ga-eji arụ ya ụka?”

Ọ Bụrụ na Onye Ị Ma Na-arịa Ọrịa

Ka e were ya na ahụ́ dị gị, ma ọ dị onye ị ma na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ. Olee otú ị ga-esi enyere ya aka? Ihe dị mkpa bụ igosi onye ahụ “ịhụnanya ụmụnna” ma na-enwe “obi ọmịiko.” (1 Pita 3:8) Gbalịa ka ị ghọta ahụhụ onye ahụ na-ata. Lee nsogbu onye ahụ anya otú o si ele ya, ọ bụghị otú i si ele ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nina, bụ́ onye nwere ọrịa yiri mkpumkpu azụ mgbe a mụrụ ya, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na adị m ntakịrị n’anya ma na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ, ụfọdụ ndị na-agwa m okwu ka nwatakịrị. Ọ na-eme m obi ọjọọ. Ma, ndị ọzọ na-anọ ọdụ agwa m okwu, ka m nwee ike na-ele ha anya n’ihu. Ọ na-eme m obi ụtọ!”

A sị ka e wepụ ọrịa ndị na-arịa ọrịa na-arịa, ị ga-aghọta na otú ahụ ị dị ka ha dị. Chegodị echiche, ihe ị gwara ha nwere ike ime ka ha ‘nweta onyinye ime mmụọ’! Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-abakwara gị uru, n’ihi na ọ ga-eme ka unu ‘gbarịta ibe unu ume.’—Ndị Rom 1:11, 12.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 13

AMAOKWU BAỊBỤL

N’oge ahụ, . . . ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:23, 24.

NDỤMỌDỤ

Mmadụ anaghị atụcha ihe ụjọ ma ọ mata ihe ọ bụ. N’ihi ya, gbalịa ka ị matakwuo banyere ọrịa gị. Jụọ dọkịta gị ihe na-edoghị gị anya.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihe mere i ji na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ abụghị na Chineke na-ata gị ahụhụ. Kama, ọ bụ n’ihi ezughị okè anyị niile ketara n’aka Adam.—Ndị Rom 5:12.

IHE M GA-EME!

Ka m ghara ịna-echegbu onwe m banyere ọrịa m ma ọ bụ nkwarụ m nwere, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe mgbaru ọsọ m ga-eruli bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na mmadụ agwa m okwu ọjọọ banyere ọnọdụ m, ihe m kwesịrị ime bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee otú ị ga-esi eji ihe ị mụtara n’isiokwu a nyere onye nwere nkwarụ ma ọ bụ onye ọrịa ya na-adịghị ala ala aka?

Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala, olee ihe ndị dị mma ị ga-echebara echiche ga-eme ka ị na-eme ihe bara uru n’agbanyeghị ọnọdụ gị?

Olee otú i si mara na mmadụ inwe nsogbu anaghị egosi na Chineke kpọrọ onye ahụ asị?

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 75]

DUSTIN, dị afọ 22, sịrị:

“Echetara m ákwá m bere mgbe mama m ku m, n’ihi na a gwara m na m ga na-anọzi n’ígwè ndị ngwọrọ. Adị m naanị afọ asatọ mgbe ahụ.

Ana m arịa ọrịa ọjọọ nke na-akụ ahụ́ gwoo gwoo. Ọ bụ onye ọzọ na-eyiwe m uwe, na-asa m ahụ́ ma na-enye m nri. Enweghị m ike iweli aka m. N’agbanyeghị nke ahụ, anaghị m anọ nkịtị, enwekwara m obi ụtọ. Enwere m ọtụtụ ihe mere m ji na-ekele Chineke. Ana m agachi ozi ọma anya, bụrụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ọ naghịdị adị m ka è nwere ihe mụ na ya na-alụ. N’ozi Jehova, e nwere ọrụ mmadụ ga na-arụ mgbe niile, nweekwa ihe mmadụ ga na-atụ anya ya. N’ikpeazụ, ana m atụ anya ụwa ọhụrụ Chineke bụ́ ebe m ‘ga-awụli elu dị ka oké ele.’“—Aịzaya 35:6.

[Igbe na Foto dị na peeji nke 75]

TOMOKO, dị afọ 21, sịrị:

“Mgbe m ka dị afọ anọ, dọkịta gwara m, sị: ‘A ga na-agba gị ọgwụ ọrịa shuga ruo mgbe ị ga-anwụ.’

Ọ naghị adịrị onye na-arịa ọrịa shuga mfe ime ka shuga ghara ịkarị akarị n’ọbara ya. Ọtụtụ mgbe, enweghị m ike iri ihe mgbe m chọrọ iri ihe, ma mgbe m na-achọghị iri ihe ka m kwesịrị iri ihe. Kemgbe ahụ, a gbaala m ihe dị ka ọnụ ọgwụ puku iri abụọ na ise. O meela ka e nwee ọtụtụ ebe na-anaghịzi afụ m ụfụ n’ụkwụ m na n’aka m. Ma, nne na nna m enyerela m aka ime ihe bara uru n’agbanyeghị ọnọdụ m. Ha na-enwe obi ụtọ na olileanya mgbe niile, ha kụzikwaara m iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Jehova na-enyere m aka mgbe niile. Mgbe ahụ́ m kwere m, amalitere m ịsụ ụzọ oge niile iji kelee Jehova.”

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 76]

JAMES, dị afọ 18, sịrị:

“Ndị mmadụ na-akparịkarị onye na-adịghị otú ndị ọzọ dị. N’eziokwu, adịghị m otú ndị ọzọ dị.

Ụdị akpụda m bụ enweghị atụ. Ndị mmadụ anaghị eji otú mmadụ dị egwu egwu. N’ihi ya, ana m agbalị igosi ha na abụghị m nwatakịrị nwere olu dimkpa. Kama ịnọ na-akwa ụwa, ana m elekwasị anya n’ụdị onye m bụ. Ndụ m na-atọ m ụtọ. Ana m amụ Baịbụl ma na-ekpeku Jehova ekpere ka o nyere m aka. Ndị ezinụlọ anyị na-agba m ume mgbe niile. Ana m atụ anya mgbe Chineke ga-ewepụ ọrịa niile. Ka ọ dịgodị, ewerela m onwe m otú m hụrụ ya, ma anaghị m ekwe ka ọ na-echu m ụra.”

[Igbe na Foto dị na peeji nke 76]

DANITRIA, dị afọ 16, sịrị:

“Mgbe ibulite otu iko mmiri bụụrụ m ọgụ na mgba, amatara m na nsogbu adịla.

Ana m arịa ọrịa na-akụrisị ahụ́. Ọrịa a adịghị mfe. Ebe m bụ onye na-eto eto, achọrọ m ịdị ka ibe m, ma ihe niile na-esiri m ike karịa mgbe mbụ. Ọ na-esidịrị m ike ihi ụra! Ma, achọpụtara m na site n’enyemaka Jehova, aga m emeli ihe m kwesịrị ime n’agbanyeghị nsogbu m. Arụdịrị m ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, tinyekwuo oge n’ịga ozi ọma. Ọ dịghị mfe, ma emere m ya. Ana m agbalị otú m nwere ike. Ana m ‘ege ahụ́ m ntị,’ na-eme ihe m ga-emeli. M chọọ ime ihe m na-agaghị emeli, mama m na-agwa m emela ya!”

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 77]

ELYSIA, dị afọ 20, sịrị:

“Anaara m agba onye mbụ na klas anyị. Ugbu a, ịgụ otu ahịrị okwu na-esiri m ike, ọ na-emekwa m obi ọjọọ mgbe ụfọdụ.

Oké ike ọgwụgwụ na-eme ka ọ na-esiri mmadụ ike ime ntakịrị ihe. Ibili n’ihe ndina anaghị ekwekarị m. Ma, anaghị m ekwe ka ọrịa m gbochie m ime ihe m kwesịrị ime. Ana m agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ọ bụrụgodị na ọ bụ amaokwu ole na ole ka m gụtaliri ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye ezinụlọ anyị gụụrụ m ya. Ana m ekele ndị ezinụlọ anyị nke ukwuu. Papa m jụdịrị ọrụ e nyere ya ná mgbakọ distrikti ka o nwee ike inyere m aka ịga mgbakọ ahụ. Ọ naghị ewe ya iwe. Ọ sịrị na ọrụ ga-akacha baara ya uru bụ ilekọta ezinụlọ ya.”

[Igbe na Foto dị na peeji nke 77]

KATSUTOSHI, dị afọ 20, sịrị:

“Na mberede, ụjọ na-abịa m, mụ etie mkpu, ahụ́ amawakwa m jijiji, na-emedị ka m kwatusịa ihe dị m gburugburu, ha akụwasịa.

Akwụkwụ na-adọ m kemgbe m dị afọ ise. Ọ na-adọ m ihe dị ka ugboro asaa kwa ọnwa. Ana m aṅụ ọgwụ kwa ụbọchị, nke na-eme ka ike na-agwụ m ngwa ngwa. Ma ana m agbalị iche banyere ndị ọzọ, ọ bụghị naanị banyere onwe m. N’ọgbakọ anyị, e nwere ndị ozi oge niile abụọ mụ na ha bụ ọgbọ, ha na-enyere m ezigbo aka. Mgbe m gụchara akwụkwọ, etinyekwuru m oge n’ije ozi ọma. Akwụkwụ na-enye mmadụ nsogbu kwa ụbọchị. Ma mgbe ọ bụla obi na-adịghị mụ mma, m na-agbalị hie ezigbo ụra. Chi bọọ, m na-enweta onwe m.”

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 78]

MATTHEW, dị afọ 19, sịrị:

“Ọ dịghị mfe ime ka ndị ọgbọ gị na-akwanyere gị ùgwù ma ọ bụrụ na ha lere gị anya na ị dịghị otú ha dị.

Ọ na-agụ m igwuri egwu, ma ọ naghị ekwe m. Ana m arịa ọrịa ụbụrụ, nke na-eme ka ịga ije na-esiri m ike. Anaghị m ekwe ka ihe m na-agaghị emeli na-echu m ụra. Ana m eme ihe m ga-emeli, dị ka ịgụ akwụkwọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe m na-anọ, obi eruo m ala n’echeweghị ihe ndị mmadụ ga-ekwu. Ihe ọzọ na-eme m obi ụtọ bụ na ama m na Jehova hụrụ m n’anya n’ihi ụdị mmadụ m bụ. N’eziokwu, anaghị m ele onwe m anya dị ka onye nwere nkwarụ. Ana m ele onwe m anya dị ka onye nwere nsogbu pụrụ iche ya na ya na-alụ.”

[Igbe na Foto dị na peeji nke 78]

MIKI, dị afọ 25, sịrị:

“M naara egwuri egwu. Ma ka m na-eto, o yiri ka m̀ ghọrọ agadi n’otu ntabi anya.

Enwere m oghere n’obi mgbe a mụrụ m. A chọpụtara ọrịa ahụ mgbe m ka na-eto eto. A wara m obi. Ọ bụ ezie na o ruola afọ isii, ọ naghị ara ahụ́ ike agwụ m, oké isi ọwụwa amalite ịwa m. N’ihi ya, ana m enwe ihe mgbarụ ọsọ m ga-eruli ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, ana m eje ozi oge niile, nke m na-arụkarị site n’ide akwụkwọ ozi na iji ekwe ntị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọzọkwa, ọrịa m enyerela m aka ịmụta àgwà ndị m na-anaghị akpabu, dị ka ogologo ntachi obi na ịdị obi umeala.”

[Foto dị na peeji nke 74]

Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, o nwere ike ịdị gị ka à tụrụ gị mkpọrọ,—ma Baịbụl kwere nkwa na ahụ́ ga-adị gị mma n’ọdịnihu