Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Nwoke na Nwaanyị Ga-eme, Ya Abụrụ Ịgafe Ókè?

Olee Ihe Nwoke na Nwaanyị Ga-eme, Ya Abụrụ Ịgafe Ókè?

 ISI NKE 4

Olee Ihe Nwoke na Nwaanyị Ga-eme, Ya Abụrụ Ịgafe Ókè?

Ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha . . .

Nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ ekwesịghị imetụ ibe ha aka mgbe ọ bụla n’agbanyeghị ebe ha nọ.

□ Eziokwu

□ Ụgha

E nwere ike ikwu na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwara iko n’agbanyeghị na ha enwebeghị mmekọahụ.

□ Eziokwu

□ Ụgha

Ọ bụrụ na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ anaghị adịda ibe ha aka, ha agaghị ahụli ibe ha n’anya.

□ Eziokwu

□ Ụgha

O DORO anya na i chebarala okwu a echiche ọtụtụ mgbe. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ọ dị onye gị na ya chọrọ ịlụ, o nwere ike isiri unu ike ịma ebe unu ga-akwụsị mgbe unu na-egosi ibe unu ịhụnanya.  Ka anyị leba anya n’ihe atọ ndị ahụ a chọrọ ka mmadụ zaa eziokwu ma ọ bụ ụgha, ma hụ otú Okwu Chineke ga-esi enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ bụ́, “Olee ihe nwoke na nwaanyị ga-eme, ya abụrụ ịgafe ókè?”

● Nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ ekwesịghị imetụ ibe ha aka mgbe ọ bụla n’agbanyeghị ebe ha nọ.

Ụgha. Baịbụl ekwughị na ọ dị njọ igosi ịhụnanya n’ụzọ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọrọ banyere nwa agbọghọ Shulem na nwa okorobịa na-azụ atụrụ, bụ́ ndị chọrọ ịlụ. Ha emeghị omume rụrụ arụ mgbe ha na-ele àgwà ibe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na e nwere oge ụfọdụ ha gosiri ibe ha ịhụnanya tupu ha alụọ. (Abụ Sọlọmọn 1:2; 2:6; 8:5) Taa, ụfọdụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ndị na-ele àgwà ibe ha nwekwara ike iche na ọ dịghị njọ ma ha gosi ibe ha ịhụnanya n’ụzọ ziri ezi mgbe ha bu n’obi ịlụ. *

Otú ọ dị, nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwesịrị ịkpachapụ nnọọ anya. Ha kwesịrị ịghọta na isusu ọnụ, mmakụ, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke na-akpali agụụ mmekọahụ nwere ike ime ka ha kwaa iko. Ọ naghị ara ọbụna ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi ahụ́ ichefu onwe ha ma kwaa iko.—Ndị Kọlọsi 3:5.

● E nwere ike ikwu na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwara iko n’agbanyeghị na ha enwebeghị mmekọahụ.

Eziokwu. Okwu Grik e si sụgharịta “ịkwa iko” (por·neiʹa) pụtara ọtụtụ ihe. Ọ pụtara ụdị mmekọahụ niile na-abụghị n’etiti di na nwunye, ya bụ, iji ihe e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị eme ihe na-ezighị ezi. N’ihi ya, ịkwa iko  apụtaghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ pụtakwara nwoke ma ọ bụ nwaanyị ịdịda ibe ha aka n’ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ.

Ọzọkwa, ọ bụghị naanị ịkwa iko ka Baịbụl kwuru na ọ dị njọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụ ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galeshia 5:19-21.

Gịnị bụ “adịghị ọcha”? Okwu Grik e si sụgharịta ya gụnyere ụdị ihe ọ bụla na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ n’okwu ma ọ̀ bụ n’omume. N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ amanye aka n’efe onye ọzọ yi, yipụ mmadụ efe ma ọ bụ dịdaa aka n’ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, dị ka n’ara, ọ bụ adịghị ọcha. Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ndị lụrụ nwaanyị kwesịrị ịdịda nwunye ha aka n’ara iji nwee obi ụtọ. (Ilu 5:18, 19) Ihere anaghị eme ụfọdụ ndị na-eto eto imebi iwu Chineke. Ha na-akpachara anya emefe ihe ókè, ma ọ bụkwanụ nwee ọtụtụ ndị ha na ha na-eme omume na-adịghị ọcha.

Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ime ihe Pọl onyeozi kpọrọ “omume rụrụ arụ.” Okwu Grik e si sụgharịta “omume rụrụ arụ” pụtara ‘ihe jọgburu onwe ya, ihe gabigara ókè, asọghị anya, na agụụ mmekọahụ  ịgba mmadụ ara.’ N’eziokwu, i kwesịghị ịghọ ‘onye mmehie ya na-adịghị ewute’ n’ihi imikpu onwe gị “n’omume rụrụ arụ iji anyaukwu na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.”—Ndị Efesọs 4:17-19.

● Ọ bụrụ na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ anaghị adịda ibe ha aka, ha agaghị ahụli ibe ha n’anya.

Ụgha. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ndị chọrọ ịlụ na-adịda ibe ha aka, ọ naghị eme ka ha dịkwuo ná mma dị ka ụfọdụ nwere ike iche. Kama, ọ na-eme ka ha ghara ịkwanyere ibe ha ùgwù, meekwa ka ha ghara ịtụkwasị ibe ha obi. Tụlee ihe mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Laura. O kwuru, sị: “Otu ụbọchị, onye chọrọ ịlụ m bịara n’ụlọ anyị mgbe mama m na-anọghị ya, sị na ya bịara ile TV. O bu ụzọ jide m aka. Ya anọtụ malite ibitụgharị m aka n’ahụ́. Obi akachaghị m ịsị ya hapụ m, n’ihi na echere m na iwe ga-ewe ya, ya asị na ya alawala.”

Gịnị ka i chere? Onye ahụ chọrọ ịlụ Laura ọ̀ hụrụ ya n’anya n’eziokwu, ka ihe ọ chọrọ ọ̀ bụ naanị igbo agụụ mmekọahụ na-agụ ya? Onye chọrọ ka gị na ya mee omume rụrụ arụ ò gosiri na ọ hụrụ gị n’anya n’ezie?

Mgbe nwa okorobịa na-enye nwa agbọghọbịa nsogbu ka o mee ihe megidere akọnuche ya na ọzụzụ o nwetara n’ọgbakọ Ndị Kraịst, nwa okorobịa ahụ na-emebi iwu Chineke, na-egosikwa na ọ hụghị nwa agbọghọ ahụ n’anya n’ezie n’agbanyeghị na o nwere ike ịsị na ya hụrụ ya n’anya. Ọzọkwa, nwa agbọghọbịa nke kwerenụ emebiela  onwe ya. Nke ka njọ bụ na o meela omume na-adịghị ọcha, ma eleghị anya ọ kwaala iko. *1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Kpebienụ Ebe Unu Na-agaghị Agafe

Ọ bụrụ na o nwere onye gị na ya chọrọ ịlụ, gịnị ka unu ga-eme ka unu ghara igosi ibe unu ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị? Ihe kacha mma bụ ibu ụzọ kpebie ebe unu na-agaghị agafe. Ilu 13:10 kwuru, sị: “Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” N’ihi ya, gị na onye ị chọrọ ịlụ kwuo ụdị ịhụnanya kwesịrị ekwesị unu ga na-egosi ibe unu. Ọ bụrụ na unu echere ruo mgbe agụụ mmekọahụ gụsiwara unu ike tupu unu ekpebie ya, o yiri ebe mmadụ cheere ruo mgbe ụlọ ya gbawara ọkụ tupu ya etinye ihe na-egosi na ụlọ achọwala ịgba ọkụ.

 N’eziokwu, ikwu ụdị ihe ahụ adịchaghị mfe, o nwere ike imenye ihere, nke ka nke, mgbe nwa okoro na nwa agbọghọ ka malitere ịkpa amalite. Ma, ikpebi ebe unu na-agaghị agafe ga-enyere unu aka ịgbara nsogbu ọsọ. Mkpebi ahụ unu ga-eme ga-adị ka ihe na-agba àmà mgbe ọkụ chọrọ ịgba n’ụlọ. Ọzọkwa, ụdị mkparịta ụka ahụ nwere ike igosi ma ihe ọ̀ ga-adabara unu ma unu lụọ. N’eziokwu, njide onwe onye, inwe ndidi, na achọghị ọdịmma onwe onye naanị bụ ihe ga-eme ka mmekọahụ na-atọ di na nwunye ụtọ.—1 Ndị Kọrịnt 7:3, 4.

N’ezie, idebe iwu Chineke adịghị mfe. Ma ị ga-atụkwasịli ndụmọdụ Jehova obi. A sị ka e kwuwe, o kwuru n’Aịzaya 48:17 na ya bụ “Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” Jehova chọrọ ka ihe dịrị gị mma!

[Foto dị na peeji nke 44]

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 24

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị abụghị ọrịa. Kama, ọ kacha mma. Ka anyị chọpụta ihe kpatara ya.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 15 Ná mba ụfọdụ, a na-ele nwa okoro na nwa agbọghọ na-abụghị di na nwunye anya ọjọọ ma ha gosi ibe ha ịhụnanya n’ihu ọha. Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịkpa àgwà ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—2 Ndị Kọrịnt 6:3.

^ par. 25 N’eziokwu, ihe e kwuru na paragraf a gbasara ma nwoke ma nwaanyị.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ —1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

NDỤMỌDỤ

Na-akpanụ n’ìgwè, ma ọ bụkwanụ hụnụ na onye ọzọ so unu. Unu anọla ebe ga-etinye unu ná nsogbu, dị ka naanị unu ịnọ n’ụgbọala a dọwara otu ebe ma ọ bụ n’ime ụlọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na i nwere onye i kwere nkwa ọlụlụ, e nwere ihe ndị gbasara naanị unu abụọ unu kwesịrị ikwurịta. Ma, okwu e kwuru iji kpalie agụụ mmekọahụ bụ adịghị ọcha, ma è kwuru ya n’ekwe ntị ma è ji ekwe ntị dee ya.

IHE M GA-EME!

Ka m nwee ike izere iji omume rụrụ arụ na-egwuri egwu, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na onye mụ na ya na-akpa anwaa ime ka anyị mee omume rụrụ arụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee ụdị egwuregwu ị ga-ekpebi na ị gaghị egwusa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị?

Kọwaa ihe dị iche n’ịkwa iko, adịghị ọcha na omume rụrụ arụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 46]

“Mụ na onye chọrọ ịlụ m agụọla isiokwu ndị dabeere na Baịbụl, bụ́ ndị kwuru banyere omume dị ọcha. Obi dị anyị ụtọ na isiokwu ndị ahụ enyerela anyị aka inwe akọnuche dị ọcha.”—Leticia

Igbe dị na peeji nke 44]

Ọ́ Bụrụkwanụ na Anyị Agafeela Ókè?

Ọ́ bụrụkwanụ na unu emeela omume rụrụ arụ? Aghọgbula onwe gị chee na naanị unu abụọ ga-edozili nsogbu ahụ. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ekpekuru m Chineke ekpere ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ime ya ọzọ. Mgbe ụfọdụ, anyị emeghị ya, ma ọtụtụ mgbe, anyị mere ya.” N’ihi ya, gwa ya papa gị na mama gị. Baịbụl nyekwara ezigbo ndụmọdụ, sị: “Kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ.” (Jems 5:14) Ndị Kraịst a bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ga-enye unu ndụmọdụ, dọọkwa unu aka ná ntị ka unu na Chineke nwee ike ịdịghachi ná mma.

[Foto ndị dị na peeji nke 47]

Ị̀ ga-echere ruo mgbe ụlọ gị gbawara ọkụ tupu gị etinye ihe na-egosi na ọkụ chọrọ ịgba n’ụlọ? N’ihi ya, echela ruo mgbe agụụ mmekọahụ riri unu isi tupu unu ekpebie ebe unu na-agaghị agafe