Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Enyi M Ji Kpasuo M Iwe?

Gịnị Mere Enyi M Ji Kpasuo M Iwe?

 ISI NKE 10

Gịnị Mere Enyi M Ji Kpasuo M Iwe?

“Kerry bụbu ezigbo enyi m. Anaara m akwọla ya kwa ụbọchị ma e mechie ọrụ, ebe ọ bụ na o nweghị ụgbọala. Ma obere oge, aghọtara m na ihe mere o ji nwee mmasị ka mụ na ya bụrụ enyi bụ naanị na ọ chọrọ irigbu m.

“Naanị ihe ọ na-eme ma ọ bata n’ụgbọala bụ iji ekwe ntị na-akpọ ndị mmadụ ma ọ bụ na-ezigara ha ozi. M buchaa ya n’ụgbọala, ọ naghị ekele m, ọ kwụsịkwara iweta ego o ji enye aka maka ịzụta mmanụ ụgbọala. Okwu ya niile na-abụkarị ịkatọ ndị ọzọ. Iwe malitere iwe m n’ihi otú m si die ihe niile ahụ ọ nọ na-eme kemgbe!

“Otu ụbọchị, eji m obiọma m gwa Kerry na agaghịzi m na-akwọla ya ma e mechie ọrụ. Kemgbe ahụ, ọ chọghịzi ka mụ na ya na-akpa. Nke ahụ mere ka o dokwuo m anya na ihe mere o ji chọọ ka anyị bụrụ enyi bụ uru ọ na-erite n’aka m. Ọ na-ewe m ezigbo iwe!”—Nicole.

ỤDỊ ihe ahụ nwere ike ime ndị bụ́ ezigbo enyi. Ị hụ ha taa, ha adị ka nnu na mmanụ; ị hụzie ha echi, ha anaghịzi atụpụrụ ibe ha ọnụ. Olee otú ndị bụbu ezigbo enyi jizi tisaa ngwa ngwa otú ahụ?

 ● Jeremy chere na ihe nwere ike ịkpata ya bụ ma ezigbo enyi mmadụ kwaga ebe dị nnọọ anya. O kwuru, sị: “Kemgbe enyi m kwapụrụ, ọ kpọtụbeghị m n’ekwe ntị, ọ na-ewe m iwe.”

● Kerrin chọpụtara na àgwà onye ya na ya bụ ezigbo enyi kemgbe afọ ise agbanweela. O kwuru, sị: “Omume ya na otú o si ekwu okwu were m ezigbo iwe. Ọ malitere ịkatọ m na ikwu okwu ọjọọ banyere ihe ndị dị mụ mkpa. Mgbe mụ na ya chọrọ ikpezi, o kwuru na m na-eme ka ọ̀ bụ naanị m bụ onye ezi omume nakwa na m na-agba ya mgba okpuru. O kwukwara na enyi mụ na ya abaghịrị ya uru!”

● Nke Gloria bụ na ya na enyi ya tisara na mberede n’enweghị ihe kpatara ya. O kwuru, sị: “Mgbe anyị malitere, ihe na-adabara mụ na ya. Ọ gwakwara m na ya weere m dị ka nwanne ya nwaanyị. Ma, na mberede, ọ kwụsịrị mụ na ya imekọ ihe. Ihe ọ na-ekwukwanụ kpatara ya enweghị isi na ọdụ.”

● Ihe seere Laura na Daria okwu bụ na Daria naara Laura nwa okorobịa chọrọ ịlụ ya. Laura kwuru, sị: “N’agbanyeghị na ọ ma na mụ na nwa okorobịa ahụ na-akpa, ha abụọ na-ekwu okwu n’ekwe ntị ruo ọtụtụ awa. Ezigbo enyi m  gbara m mgba okpuru, narakwa m onye chọrọ ịlụ m—ihe abụọ a mere otu mgbe!”

Gịnị Kpatara Ya?

Mmadụ niile na-emehie ihe. N’ihi ya, mara na otu ụbọchị, enyi gị ga-eme ihe ga-ewe gị iwe ma ọ bụkwanụ kwuo ihe ga-ewute gị. I chee echiche nke ọma, ị ga-echeta na e nweela mgbe ụfọdụ i mere ihe wutere ndị ọzọ. (Ekliziastis 7:22) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lisa kwuru, sị: “Anyị niile ezughị okè. E nwere mgbe ụfọdụ anyị ga-emejọ ibe anyị.” Ọ bụrụ na e see okwu n’ihi obere nghọtahie, e nwere ike iji obere mkparịta ụka dozie ya.

Ma ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka enyi na enyi tisaa anaghị abụ ihe mere otu mgbe, kama ọ na-abụ mgbe ihe ụfọdụ mewere, unu abụọ achọpụta na ihe anaghị adabara unu otú unu cheburu. Cheta na ka ị na-eto, ihe ndị na-amasịbu gị agaghịkwa amasị gị—otú ahụ ka ọ dịkwa enyi gị. Gịnị ka i nwere ike ime ma ị chọpụta na ihe anaghịzi adabara gị na enyi gị?

 Otú E Si Edozi Esemokwu Enyi na Enyi

Ọ̀ dịtụla mgbe otu n’ime uwe ndị ị na-enwekarị mmasị iyi dọkara? Gịnị ka i mere? Ị̀ tụfuru ya ka ì meziri ya? O doro anya na ihe ga-eme ka i mezie uwe ahụ ma ọ bụ tụfuo ya bụ otú ọ dọkaruru nakwa uru ọ baara gị. Ọ bụrụ na ị naghị eji uwe ahụ egwu egwu, o nwere ike ịbụ na ị gbalịrị hụ na ị dụchiri ya. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ otú ahụ ka gị na enyi gị nwere ike ime ma unu see okwu. Ihe ga-eme ka unu kpezie bụ ihe kpatara esemokwu ahụ na uru enyi ahụ baara unu. *

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a gwara gị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ihe were gị iwe, ihe ga-enyere gị aka idi ya bụ ime ihe e kwuru n’Abụ Ọma 4:4, bụ́ ebe sịrị: ‘Kwuo ihe ị chọrọ ikwu n’ime obi gị, n’elu ihe ndina gị, ma gba nkịtị.’ N’ihi ya, tupu gị na enyi gị etisaa, chee echiche nke ọma. Enyi gị ahụ ọ̀ kpachaara anya mee ihe o mere? Ọ bụrụ na o doghị gị anya, ọ́ kaghị mma ka i were ya na o bughị ihe ọjọọ n’obi? Ọtụtụ mgbe, i nwere ike iji ‘ịhụnanya kpuchie ọtụtụ mmehie.’—1 Pita 4:8.

 Ọ dịkwa mma ka i chee echiche ma ọ̀ dị otú i si kpata nsogbu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na enyi gị gwara mmadụ ihe ị na-achọghị ka ọ gwa onye ọ bụla, í cheghị na ọ gaara aka mma ka ị ghara ịgwadị enyi gị ihe ahụ? Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ ma ọ̀ bụ gị kparịrị onwe gị, ma eleghị anya site n’ikwu oké okwu ma ọ bụ okwu nzuzu. (Ilu 15:2) Ya bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Èkwesịrị m ịgbanwe otú m si ekwu okwu ka enyi m na-akwanyere m ùgwù?’

“Achọrọ M Ka Anyị Kwurịta Ihe Seere Anyị”

Ma, olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na i chere na ị gaghị ahapụli okwu ahụ otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịkacha mma ka gị na enyi gị ahụ kwurịta ya. Ma, agakwala mgbe iwe na-ewe gị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ewe oké iwe na-akpasu esemokwu, ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu dajụọ.” (Ilu 15:18) N’ihi ya, chere ruo mgbe obi dajụrụ gị tupu ị gawa idozi esemokwu ahụ.

 I mechaa gakwuru ya, cheta na ihe mere i ji gawa abụghị ka ‘i jiri ihe ọjọọ kwụọ ya ụgwọ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) Kama, ọ bụ ka gị na ya kpezie ma bụrụghachị enyi. (Abụ Ọma 34:14) N’ihi ya, ka ihe ị ga-ekwu si gị n’obi. I nwere ike ịsị, “Ọ dịtụla anya mụ na gị bụwara enyi. Achọrọ m ka anyị kwurịta ihe seere anyị.” Ọ bụrụ na ị mata ihe seere unu, o nwere ike ịdịrị gị mfe ime ka unu kpezie. A sịgodị na o kweghị atụpụrụ gị ọnụ, obi ga-eru gị ala na gbalịala ka gị na ya kpezie.

N’ikpeazụ, mara na n’agbanyeghị na “e nwere ndị enyi na-achọkarị ịkụrisị ibe ha,” e nwekwara “enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) N’eziokwu, ndị bụ́ ezigbo enyi nwekwara ike ise okwu mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na o mee, mee ihe ọ bụla i nwere ike ime ka gị na ya kpezie. N’ezie, ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike idozi esemokwu gị na ndị enyi gị, ọ na-egosi na ị ghọwala dimkpa.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 8

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ụfọdụ ndị ọgbọ gị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu n’Ịntanet ruo ọtụtụ awa. Olee ihe na-atọ ha ụtọ na ya?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 15 E nwere ụfọdụ ndị ị na-agaghị achọzi ka gị na ha bụrụ enyi. Ọ na-abụkarị ma ha kpawa àgwà Onye Kraịst na-ekwesịghị ịkpa.—1 Ndị Kọrịnt 5:11; 15:33.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.

NDỤMỌDỤ

Ekpebila ihe merenụ ngwa ngwa, buru ụzọ jụọ enyi gị.—Ilu 18:13.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ndị bụ́ ezigbo enyi na-enyetụ ibe ha ohere. (Ilu 25:17) Ma ọ bụrụ na mmadụ na-achọ ka ọ bụrụ naanị ya na enyi ya na-anọ mgbe niile, ha abụọ nwere ike itisa.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na m chọrọ ịgakwuru enyi m ka mụ na ya kwurịta ihe o mere m, ihe mbụ m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ọ bụrụgodị na ihe enyi m mere were m iwe, ihe m ga-eme ka udo dịrị bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị na-eme mgbe ụfọdụ ka enyi na enyi jiri nwayọọ tisaa?

Olee ụdị ihe enyi gị ga-eme gị gị eleghara ya anya, oleekwanụ ụdị ihe gị na ya kwesịrị ikwurịta?

Ọ bụrụ na enyi gị akpasuo gị iwe, olee ihe bara uru i nwere ike ịmụta?

Olee ihe ndị ị ga-elezi anya na-eme ka enyi gị ghara ịna-akpasukarị gị iwe?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 95]

“A sị nnọọ na m maara, agaaraghị m atụ anya ka ihe na-adabachara mụ na enyi m n’ihe niile. Agaara m egekwu ya ntị ma nyere ya aka, gharakwa ikwukarị okwu n’ihe ọ bụla o mejọrọ. Aghọtala m ugbu a na ụtọ enyi na enyi bụ ịgbakọ aka dozie nsogbu na ihe isi ike.”—Keenon

[Foto dị na peeji nke 94]

Okwu enyi na enyi sere dị ka uwe dọkara adọka—ma e nwere ike imezi ha abụọ