Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?

 ISI NKE 31

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?

Olee otú egwú dịruru gị mkpa?

□ Ọ dịghị mụ mkpa.

□ Ọ dị m ezigbo mkpa.

Olee mgbe ị na-ege egwú?

□ Mgbe m na-eme njem

□ Mgbe m na-amụ ihe

□ Mgbe niile

Olee ụdị egwú na-atọgbu gị atọgbu, n’ihi gịnịkwa?

 O YIRI ka inwe mmasị n’egwú dị mmadụ niile n’ọbara. Egwú dị ọtụtụ ndị na-eto eto mkpa. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Amber kwuru, sị: “Egwú dị m ezigbo mkpa. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na m na-akpọ egwú mgbe niile—mgbe m na-ehicha ụlọ, na-esi nri, na-aga ozi ma ọ bụ na-amụ ihe.”

Egwú abụghị ịpịgharị aka ná ngwá egwú ka ọ na-ada ụda, kama ọ bụ ihe e cheziri echiche kụọ, nke na-eru ndị mmadụ n’obi. Otú ahụ “okwu e kwuru n’oge ya si dị mma,” abụ a bụrụ n’oge kwesịrị ekwesị na-emekwa ka obi ruo mmadụ ala! (Ilu 15:23) Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Jessica kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ị ga na-eche na o nweghị onye ghọtara otú obi dị gị. Ma mgbe m gere egwú kacha atọ m ụtọ, m na-amata na ọ bụghị naanị m dara mbà n’obi.”

Ọ̀ Na-esere Unu Okwu, ka Ọ̀ Na-atọ Unu Ụtọ?

O doro anya na egwú na-atọ gị ụtọ nwere ike ọ gaghị atọ papa gị na mama gị ụtọ. Otu nwata nwoke na-eto eto kwuru, sị: “Papa m na-asị m, ‘Gbanyụọ ihe a na-eme ụ̀zụ̀! Ọ na-emechi m ntị!’” Ụdị ihe ahụ nwere ike gwụ gị ike, ya adị gị ka papa gị na mama gị hà na-akpara ihe na-adịghị ihe ọ bụ isiokwu. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Ingred jụrụ, sị: “Gịnị mere mgbe ha na-eto eto? Ọ̀ bụ na papa ha na mama ha echeghị na egwú ha adịghị mma?” O kwuziri, sị: “O yiri ka ndị dimkpa anaghị achọ ịma ihe ụwa na-akọ ugbu a. Ọ bụrụ na ha amata na egwú a na-akụ ugbu a na-atọ anyị ụtọ, ha agaghị na-enye anyị nsogbu!”

E kwesịrị ichebara ihe ahụ Ingred kwuru echiche. Dị ka ị ma, kemgbe ụwa, ihe na-amasị  ndị agadi dị iche n’ihe na-amasị ndị na-eto eto. Ma, nke ahụ apụtaghị na egwú kwesịrị ịna-esere ha okwu. Otú ị ga-esi eme ka egwú ghara isere gị na papa gị na mama gị okwu bụ ịmara ụdị egwú na-atọ gị na ha ụtọ. Ọ bụrụ na ha na-akwanyere ihe Baịbụl kwuru ùgwù, nke gị ka mma. N’ihi gịnị? N’ihi na Okwu Chineke ga-enyere gị na ha aka ịmara egwú na-adịghị mma na nke Onye Kraịst nwere ike ịhọrọ. Ka i nwee ike ime ya, i kwesịrị ichebara ihe abụọ dị mkpa echiche: (1) ihe a na-agụ n’egwú ahụ ị na-ege na (2) otú ị na-egeru egwú. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ajụjụ bụ́ . . .

Gịnị Ka A Na-agụ n’Egwú Ahụ?

Egwú dị ka nri. Iri ezigbo nri otú kwesịrị ekwesị ga-abara gị uru. Nke na-adịghị mma agaghị abara gị uru n’agbanyeghị otú i riruru ya. Ọ dị mwute na ọ bụ egwú ndị na-adịghị mma na-akacha atọ ndị mmadụ ụtọ. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Steve kwara arịrị, sị: “Gịnị mere e ji agụkarị ihe na-adịghị mma n’egwú ndị ahụ na-atọ ụtọ?”

Ọ bụrụ na ụda egwú ahụ na-atọ gị ụtọ, ì kwesịrị ichegbuwe onwe gị maka ihe a gụrụ na ya? Ka i nwee ike ịza ajụjụ ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka  m rie nsí, olee otú ọ ga-esi mee ka m rie ya? Ọ̀ ga-etinye ya ná mmanya gbara ụka, ka ọ̀ ga-etinye ya n’ihe na-atọ ụtọ?’ Job bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ, sị: “Ntị ọ́ dịghị anwale okwu dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe oriri?” (Job 12:11) N’ihi ya, kama ige egwú n’ihi na ụda ya na-atọ gị ụtọ, lee anya n’isiokwu ya na n’ihe e dere n’akwụkwọ egwú ahụ ka ị mata ihe a gụrụ na ya. Maka gịnị? Maka na ihe a gụrụ n’egwú ahụ ga-emetụta echiche gị na àgwà gị.

Ọ dị mwute na ihe a na-agụ n’ọtụtụ egwú ọgbara ọhụrụ taa na-akwado inwe mmekọahụ, ime ihe ike, na ịṅụ ọgwụ ike. Ọ bụrụ na i chee na ige ụdị ihe ahụ agaghị emetụta gị, ọ pụtara na “nsí” ahụ ejidela gị.

Kpebie Ihe Ị Ga-eme

Ndị ọgbọ gị nwere ike na-enyesi gị nsogbu ike ka i gewe egwú na-adịghị mma. Ndị na-agụ egwú na-agbalịkwa ime ka ndị mmadụ zụọ egwú ha. Ụlọ ọrụ redio, Ịntanet na TV emeela ka egwú bụrụ ihe e ji akpa ezigbo ego. A na-ego ndị bụ́ aka ochie n’ịkpọsà ngwá ahịa ka ha mee ka egwú ndị ahụ na-amasị gị.

Ma, ọ bụrụ na i kwe ka ndị ọgbọ gị ma ọ bụ ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ekpebiri gị ụdị egwú ị ga-ege, ọ pụtara na ị gaghị ejili aka gị ahọrọ nke dị mma. Ị ga-abụzi ohu  na-enweghị uche. (Ndị Rom 6:16) N’ụdị okwu ahụ, Baịbụl dụrụ gị ọdụ ka ị lụso echiche ụwa ọgụ. (Ndị Rom 12:2) N’ihi ya, i kwesịrị ịzụ ‘ikike nghọta gị azụ ka ị mata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Ndị Hibru 5:14) Olee otú ị ga-esi eji ikike nghọta gị kpebie ụdị egwú ị ga-ege? Chebara aro ndị a echiche:

Leruo mkpo ya anya. Ọtụtụ mgbe, naanị anya i lere mkpo egwú ga-eme ka ị mara ihe a gụrụ na ya. Ọ bụrụ na e sere ndị na-eme ihe ike, ndị gba ọtọ, ma ọ bụ ndị na-eme anwansi na ya, kpachara anya. O nwere ike ịbụ na ihe a gụrụ n’egwú ahụ adịghị mma.

Chebara ihe a gụrụ na ya echiche. Olee ihe a gụrụ n’egwú ahụ? Ị̀ chọrọ n’ezie ige ihe a gụrụ n’egwú ahụ ugboro ugboro ma ọ bụ na-agụghachi ya? Ihe a gụrụ n’egwú ahụ ò megidere ihe i kweere na ihe Baịbụl kụziri?—Ndị Efesọs 5:3-5.

Chọpụta ihe ọ na-eme mmadụ. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Philip kwuru, sị: “Achọpụtara m na ọtụtụ n’ime egwú m na-ege na-eme m obi ọjọọ.” N’eziokwu, ihe egwú na-eme ndị mmadụ dị iche iche. Ma olee otú egwú ị na-ege na-eme ka obi dị gị? Jụọ onwe gị, sị: ‘M gechaa  egwú ahụ, m̀ na-eche ihe na-adịghị mma? Àmụtawala m okwu rụrụ arụ ndị e ji gụọ egwú ahụ?’—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Chebara ndị ọzọ echiche. Olee otú egwú gị na-adị papa gị na mama gị? Jụgodị ha. Cheekwa echiche otú o nwere ike ịdị Ndị Kraịst ibe gị. Egwú ahụ ọ̀ ga-enye ụfọdụ n’ime ha nsogbu n’obi? Ọ bụrụ na ị gbanwee otú i si akpa àgwà n’ihi otú obi ga-adị ndị ọzọ, ọ na-egosi na ị ghọwala dimkpa.—Ndị Rom 15:1, 2.

Ọ bụrụ na ị jụọ onwe gị ajụjụ ndị ahụ, ị ga-enweli ike ịhọrọ egwú ga-eme gị obi ụtọ n’emebighị adịm ná mma gị na Chineke. Ma e nwere ihe ọzọ ị ga-echebara echiche.

Egwú Ò Riela M Isi?

Egwú dị mma bara uru otú ahụ nri dị mma bakwara. Otú ọ dị, ilu dị na Baịbụl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ̀ bụ mmanụ aṅụ ka i nwetara? Rachaa nke ga-ezuru gị, ka ị ghara ịrachabiga ya ókè wee gbọpụta ya.” (Ilu 25:16) A ma na mmanụ aṅụ bụ ọgwụ. Ma, ihe ọma e mebigara ókè adịghị mma. Gịnị ka ọ pụtara? E kwesịghị iribiga ihe ọma ókè.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eto eto na-ekwe ka egwú na-atụrụ ha ụka. Dị ka ihe atụ, nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Jessica e kwuru na mbụ kwuru, sị: “Ana m ege egwú mgbe niile, ọbụna mgbe m na-amụ Baịbụl. Agwara m papa m na mama m na ọ na-eme ka isi kpakọọ m ọnụ. Ma ha anaghị ekweta.” Ihe ahụ Jessica kwuru ọ̀ na-eme gị?

Olee otú ị ga-esi amata ma egwú ò riela gị isi? Jụọ onwe gị, sị:

Awa ole ka m na-eji ege egwú kwa ụbọchị? ․․․․․

Ego ole ka egwú na-eri m kwa ọnwa? ․․․․․

 Egwú m na-ege ọ̀ na-akpata nsogbu n’ezinụlọ anyị? Ọ bụrụ otú ahụ, dee otú i nwere ike isi kwụsị nsogbu ahụ. ․․․․․

Gbanwee Otú I Si Ege Egwú

Ọ bụrụ na ige egwú na-eri gị oge, i kwesịrị ikpebi mgbe ị ga-ege ya na mgbe ị na-agaghị ege ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-akwụnyekarị ihe e ji ege egwú ná ntị gị ma ọ bụ na-agbanye egwú mgbe ọ bụla ị lọtara, i nwere ike ịkwụsị ya.

N’eziokwu, ọ ga-adị mma ma i nwee oge ị na-agaghị agbanye egwú. I nwere ike iji oge ahụ na-amụ ihe. Nwa okorobịa ahụ aha ya bụ Steve e kwuru okwu ya na mbụ kwuru, sị: “Ị ga-amụtakwu ihe ma ọ bụrụ na ị gbanyeghị egwú.” Gbalịa gbanyụọ egwú mgbe ị na-amụ ihe, ka ị hụ ma ị̀ ga-aka aghọta ihe ị na-amụ.

I kwesịkwara inwe oge i ji agụ ma na-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, Jizọs Kraịst  na-aga ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị na-ekpe ekpere ma na-atụgharị uche. (Mak 1:35) Ebe ị na-anọ amụ ihe ọ̀ na-adị jụụ n’enweghị ihe na-enye gị nsogbu? Ọ bụrụ na ọ dịghị otú ahụ, o nwere ike ime ka ị ghara inwe ọganihu n’adịm ná mma gị na Chineke.

Mee Mkpebi Dị Mma

Egwú bụ onyinye Chineke nyere anyị, ma i kwesịrị ịkpachara anya ka ị ghara iji ya eme iberiibe. Emekwala ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marlene, bụ́ onye kwuru, sị: “Enwere m egwú m ma na m kwesịrị ịtụfu. Ma ọ na-atọ m ụtọ.” Chegodị ihe ọjọọ egwú ahụ na-adịghị mma ọ na-ege na-eme uche ya na obi ya! Ekwela ka ụdị ọnyà ahụ ma gị. Ekwela ka egwú mebie gị ma ọ bụ na-atụrụ gị ụka. Mgbe ị na-ahọrọ egwú, nọsie ike n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Kpekuo Chineke ekpere ka o duzie gị ma nyere gị aka. Ka ndị enyi gị bụrụ ndị kweere ihe i kweere.

Egwú nwere ike ime ka obi ruo gị ala. Ọ ga-eme ka owu ghara ịma gị mgbe naanị gị nọ. Ma egwú ahụ gụchaa, nsogbu gị ka nọkwa ebe ọ nọ. Egwú agaghị anọchili ezigbo ndị enyi. N’ihi ya, ekwela ka egwú bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Jiri ya na-enwe obi ụtọ, ma ekwela ka o rie gị isi.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

I kwesịrị ịtụrụ ndụ mgbe ụfọdụ. Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi eme ka ntụrụndụ baara gị ezigbo uru?

AMAOKWU BAỊBỤL

Ntị ọ́ dịghị anwale okwu dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe oriri?Job 12:11.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka papa gị na mama gị ghọta ihe mere i ji nwee mmasị n’egwú ị na-egekarị, gbalịa nwee mmasị n’ụfọdụ egwú ha na-enwe mmasị ige.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na ị naghị achọ ka papa gị na mama gị nụ ụdị egwú ị na-egekarị, o nwere ike igosi na egwú na-atọ gị ụtọ adịghị mma.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme ka egwú ghara iri m isi bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ụmụaka ibe m enyewe m nsogbu ka m gee egwú na-adịghị mma, ihe m ga-agwa ha bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere o ji dị mkpa ka i lezie anya n’ụdị egwú ị na-ege?

Olee otú ị ga-esi ama egwú dị mma na nke na-adịghị mma?

Gịnị ka ị ga-eme ka ụdị egwú dị iche iche na-atọ gị ụtọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 259]

“Mgbe ụfọdụ, anaghị m ama mgbe m gewere egwú m ma na ọ dịghị mma. Ana m agbanyụ ya ozugbo. Ma mụ agbanyụghị ya, m ga-achọwa ihe m ga-asị mere o ji dị mma.”—Cameron

 [Igbe na Foto ndị dị na peeji nke 258]

Mee Ka Ụdị Egwú Dị Iche Iche Na-atọ Gị Ụtọ

Ị̀ na-eri ụdị nri dị iche iche ugbu a karịa ndị i riri mgbe ị dị afọ ise? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na iri ụdị nri ndị ọzọ atọwala gị ụtọ. Otú ahụ ka egwú dị. Egela naanị otu ụdị egwú. Gbalịa na-ege ụdị egwú dị iche iche.

Otu ụzọ ị ga-esi eme ya bụ ịmụta ịpị ngwá egwú. Ọ bụghị naanị na ime ya ga-ara gị ahụ́ ma tọọ gị ụtọ, kama o nwere ike ime ka ị nụ ụdị egwú ndị ọzọ na-abụghị ndị ahụ a na-ere n’ahịa. Olee otú ị ga-esi ewepụta ohere mụọ ya? I nwere ike isi n’oge i ji ele TV ma ọ bụ egwu egwuregwu kọmputa wepụta oge. Legodị ihe ndị na-eto eto ndị a kwuru.

“Ịpị ngwá egwú na-atọ ezigbo ụtọ, ọ bụkwa ezigbo ụzọ ị ga-esi ekwu otú obi dị gị. Ịmụta otú e si eji ngwá egwú agụ abụ ndị ọhụrụ emeela ka ụdị egwú dị iche iche na-atọ m ụtọ.”—Brian, dị afọ iri na asatọ, na-akpọ ụbọ, na-eti ịgbà ma na-apị pịano.

“Ị chọọ ịmụta ịpị ngwá egwú, ị ga na-amụ ya mgbe niile. Ọ bụghịkwa mgbe niile ka ịmụ ya na-atọ ụtọ. Ma ị mụta ịpị otu ngwá egwú nke ọma, obi ga-atọ gị ụtọ na i mere ihe bara uru.”—Jade, dị afọ iri na atọ, na-akpọ ụbọ akwara.

“Ọ bụrụ na mụ enwee nsogbu n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ na obi adịghị mụ mma, ihe na-enyere m aka inweta onwe m bụ ịkpọ ụbọ. Obi na-atọ m ụtọ mgbe m na-akpọ egwú nke na-eme ka ahụ́ ruo m ala.”—Vanessa, dị afọ iri abụọ, na-akpọ ụbọ, na-apị pịano, na-egbukwa ọjà.

“Ana m echebu, sị: ‘O nweghị mgbe m ga-ama otú e si akpọ ụbọ dị ka ndị ọzọ.’ Ma anọgidere m na-amụ ya, obi na-atọ m ezigbo ụtọ ugbu a ma m jiri ụbọ m na-akpọ egwú m. O mekwara ka m na-akwanyekwuru ndị egwú ndị ọzọ ùgwù.”—Jacob, dị afọ iri abụọ, na-akpọ ụbọ.

[Foto dị na peeji nke 255]

Egwú dị ka nri. Iri ezigbo nri otú kwesịrị ekwesị ga-abara gị uru. Nke na-adịghị mma agaghị abara gị uru n’agbanyeghị otú i riruru ya