Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Mekwuo nke Ọma n’Ụlọ Akwụkwọ?

Olee Otú M Ga-esi Mekwuo nke Ọma n’Ụlọ Akwụkwọ?

 ISI NKE 13

Olee Otú M Ga-esi Mekwuo nke Ọma n’Ụlọ Akwụkwọ?

 KA E were ya na ị tọrọ atọ n’ime oké ọhịa gbara ọchịchịrị. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ìhè anaghị abata ebe ahụ n’ihi na osisi kpuchiri ebe niile. Ahịhịa tochiri ebe niile; ụzọ adịtụdịghị adị. Ị chọọ ịpụta, ị ga-ejirịrị mma na-asụpe ụzọ ị ga-esi.

Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ihe ha na-ahụ n’ụlọ akwụkwọ yiri ihe a a kọwara ebe a. A sị ka e kwuwe, o nwere ike ịdị gị ka à tụrụ gị mkpọrọ n’ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị, ya ruo n’abalị, ihe ndị nkụzi nyere gị ka ị rụọ n’ụlọ ejide gị ruo ọtụtụ awa. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ na-adị gị? N’ahịrị a dị ebe a, dee ihe unu na-amụ n’ụlọ akwụkwọ nke na-akacha esiri gị ike.

․․․․․

Ma eleghị anya, papa gị, mama gị na ndị nkụzi gị agwasiela gị ike ka ị gbalịsikwuo ike na ya. Ya bụrụ otú ahụ, ihe ha bu n’obi abụghị ime ka ihe siere gị ike! Naanị ihe ha chọrọ bụ ka i mee ihe niile i nwere ike ime. N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agwakata gị okwu, ya adịzie gị ka ọ̀ kaara gị mma ịkwụsị? Ọ bụrụ na i jiri ezi ngwá ọrụ, ị ga-asụpe ụzọ ná nsogbu ahụ yiri oké ọhịa. Olee ngwá ọrụ ndị ị ga-eji?

Ngwá ọrụ nke mbụ: Ile ịmụ ihe anya ọma. Ọ ga-esiri gị ike ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị na-ele ịmụ ihe anya ọjọọ. N’ihi ya, gbalịa ka i chebara ihe niile echiche. Pọl onyeozi bụ́ Onye Kraịst dere, sị: “Onye na-akọ ubi kwesịrị ịkọ ubi ma nwee olileanya, onye na-azọchakwa mkpụrụ kwesịrị ime otú ahụ ma nwee olileanya na ya ga-eri ya.”—1 Ndị Kọrịnt 9:10.

Ihe mere onye ọrụ ubi ji arụsi ọrụ ike bụ na o nwere olileanya na ọ ga-arụpụta ihe bara uru. Ma o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ịhụ uru ị ga-erite ma ị gbalịsie ike n’ihe ụfọdụ ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụghị ihe niile ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike iyi ihe baara gị uru—nke ka nke,  ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị mụọ ihe dị iche iche, ọ ga-eme ka ị ghọta ihe na-eme n’ụwa. Ọ ga-enyere gị aka ‘ịghọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ,’ mee ka i nwee ike ịgwa ndị si n’ebe dị iche iche okwu. (1 Ndị Kọrịnt 9:22) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-eme ka otú i si eche echiche ka mma, nke ga-emecha baara gị uru.

Ngwá ọrụ nke abụọ: Ile ike gị anya ọma. Ụlọ akwụkwọ nwere ike ime ka a mata ihe ị na-amadịghị na ị ga-emeli. Pọl deere Timoti, sị: “Mee ka onyinye Chineke nke dị n’ime gị . . . nwuo dị ka ọkụ.” (2 Timoti 1:6) O doro anya na a họpụtara Timoti ije ozi pụrụ iche n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma o kwesịrị iji ike Chineke nyere ya, ya bụ, “onyinye” o nyere ya, na-eme ihe bara uru, ka ọ ghara ịla n’iyi ma ọ bụ bụrụ ihe furu ọhịa. N’eziokwu, Chineke esighị n’eluigwe bịa nye gị nkà i ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ma, i nwere nkà dị iche na nke ndị ọzọ. Ụlọ akwụkwọ nwere ike inyere gị aka ịmata na i nwere nkà ị na-amabughị na i nwere, meekwa ka ọ ka mma.

Ejila aka gị egbu onwe gị site n’iche na o nweghị ihe ga-eme ka i mekwuo nke ọma. Ọ bụrụ na ị malite iche ihe na-adịghị mma banyere nkà i nwere, wepụ echiche ahụ n’obi gị ma chewe ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị mmadụ sịrị na Pọl  amaghị okwu ekwu, ma eleghị anya n’enweghị ezi ihe kpatara ya, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrịnt 10:10; 11:6) Pọl ma na e nwere ebe ya na-anaghị eme nke ọma. Ma, ọ makwa na e nwere ebe ya na-eme nke ọma.

Gịnwa kwanụ? Olee ebe ị na-eme nke ọma? Ọ bụrụ na o nweghị nke i chetara, jụgodị onye toro eto ị tụkwasịrị obi. Ụdị enyi ahụ nwere ike inyere gị aka ịmata ebe ị na-eme nke ọma nakwa otú ị ga-esi mee ka ọ baara gị uru.

Ngwá ọrụ nke atọ: Ịmụ ihe nke ọma. O nweghị otú mmadụ ga-esi na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ naghị amụsi ihe ike. Mee elu mee ala, i kwesịrị ịmụ ihe. N’ezie, e nwere ike e kwuwe okwu kwute “ịmụ ihe,” ụjọ abịa gị. Ma, cheta na ịmụ ihe bara uru. N’eziokwu, o nwere ike ịtọ gị ụtọ ma i tinyekwuo mgbalị.

Ma ọ bụrụ na ị ga na-amụ ihe nke ọma, i kwesịrị ịhazi oge gị ahazi. Chetakwa na ugbu a ị ka bụ nwa akwụkwọ, ịmụ ihe kwesịrị ịbụ ihe mbụ. N’ezie, Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge ịwụli elu.” (Ekliziastis 3:1, 4; 11:9) N’ihi ya, dị ka ọtụtụ ndị na-eto  eto na-eme, i nwere ike iwepụta oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ. * Ma Ekliziastis 11:4 dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-ele ifufe agaghị agha mkpụrụ; onye na-ele ígwé ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.” Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’amaokwu a? Buru ụzọ gụọ akwụkwọ tupu gị agawa igwuri egwu. Echegbula onwe gị—ị ga-enweta oge ị ga-eji mee ha abụọ!

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịrụ Ihe Ndị Nkụzi Nyere Gị Ka Ị Rụọ n’Ụlọ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ndị nkụzi nyere gị ka ị rụọ n’ụlọ karịrị akarị? O nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Sandrine, bụ́ onye France. Ọ sịrị: “Kwa abalị, ana m eji ihe ruru awa abụọ ma ọ bụ atọ arụ ihe ndị nkụzi nyere anyị ka anyị rụọ n’ụlọ,  m na-emekwa otú ahụ ná ngwụsị izu.” N’obodo ụfọdụ, ụmụ akwụkwọ na-eji ihe karịrị awa ole ahụ arụ nke ha. Olee otú ị ga-esi arụcha ha niile? Gbalịa mee ihe ndị a tụrụ aro ha na peeji nke 119.

Wepụ Ihe Nọchiiri Gị Ụzọ

Mgbe Pọl na-enye Timoti ndụmọdụ banyere inwe ọganihu n’ijere Chineke ozi, o deere ya, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Timoti 4:15) N’otu aka ahụ, ị gbalịsie ike, ndị mmadụ ga-ahụ ọganihu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ.

Cheta ihe atụ ahụ e ji malite isiokwu a. Ọ bụrụ na ị tọrọ atọ n’ime oké ọhịa, ị ga-achọ ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị, ya bụ, mma ị ga-eji asụpe ụzọ ị ga-esi apụta. Otú ahụ ka ụlọ akwụkwọ dị. Kama ikwe ka ihe papa gị na mama gị na ndị nkụzi gị chọrọ ka i mee gwụ gị ike, jiri ngwá ọrụ atọ ndị a kọwara n’isiokwu a mee ka i nwee ihe ịga nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ka ị na-emekwu nke ọma, obi ga-adị gị ụtọ na i ji ngwá ọrụ ndị ahụ rụọ ọrụ!

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 18

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na a na-achọ gị okwu, dị ka à ga-asị na nsogbu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ ezubeghị. Olee ihe ị ga-eme?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 13 Ị chọọ ịgụkwu banyere ntụrụndụ, gụọ Nkebi nke 8 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

Onye na-ele ifufe agaghị agha mkpụrụ; onye na-ele ígwé ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.Ekliziastis 11:4.

NDỤMỌDỤ

Mgbe ị na-amụ ihe, buru ụzọ lebatụ anya n’ihe ị chọrọ ịmụ, ka ị mata ihe ị na-aga ịmụ. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ, gbalịa ichepụta ajụjụ ndị e nwere ike inweta azịza ha n’isiokwu nke ọ bụla. Gụzie ihe ị chọrọ ịmụ, chọọ ebe bụ́ azịza ha. N’ikpeazụ, lee ma ị̀ ga-echeta ihe ị gụrụ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ịghọ aghụghọ ule nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ịtụkwasị gị obi, meekwa ka ị ghara ịmụta ihe n’agụmakwụkwọ gị. Nke ka nke, ọ ga-emebi adịm ná mma gị na Chineke.—Ilu 11:1.

IHE M GA-EME!

N’ule ọzọ m ga-ele, m chọrọ inwe ․․․․․ n’ihe ọmụmụ:

Ihe m ga-agbalịsi ike ime nke ga-enyere m aka imekwu nke ọma n’ihe ọmụmụ ahụ bụ: ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere ihe ọmụmụ a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere i ji kwesị ịgbalịsi ike n’ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ?

● Olee oge ga-akara gị mma iji na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ na-arụ ihe ndị nkụzi nyere gị rụọ n’ụlọ?

● N’ụlọ unu, olee ebe kacha mma ị ga-anọ na-agụ akwụkwọ, na-arụkwa ihe ndị nkụzi nyere gị rụọ n’ụlọ?

● Olee otú ị ga-esi mee ka egwuregwu na ntụrụndụ ghara ime ka ị daa n’ule?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 117]

“M na-ahụ na ọ na-eme ndị ọgbọ m. Otú ha si na-amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ bụkwa otú ha si amụ ihe metụtara ofufe Chineke. Ndị na-amụtaghị otú e si amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ anaghị enwecha mmasị n’ọmụmụ Baịbụl onwe onye.”—Sylvie

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 119]

Chọta ebe ị ga-anọ na-amụ ihe. O kwesịrị ịbụ ebe ihe ọ bụla na-agaghị adọpụ gị uche. Ya kwe gị, buru tebụl. Gbanyụọ TV.

Buru ụzọ mee ihe ndị ka mkpa. Ebe ọ bụ na ụlọ akwụkwọ ị na-aga dị mkpa, kpebisie ike na ị gaghị agbanye TV ma ọ bụrụ na ị rụchabeghị ihe ndị nkụzi nyere gị ka ị rụọ n’ụlọ.

Asịla mgbe e mere. Kwuo kpọmkwem mgbe ị ga-arụ ihe ndị nkụzi nyere gị ka ị rụọ n’ụlọ, jisie ike rụọ ya mgbe ahụ.

Depụta usoro ị ga-eji arụ ya. Kpebie nke ị ga-ebu ụzọ rụọ, nke ga-eso ya, na ndị ọzọ. Dee ha niile n’akwụkwọ, deekwa oge ị ga-eji rụọ nke ọ bụla. Kagbuo nke ọ bụla ị rụchara.

Ị rụtụ, gị ezurutụ ike. Ị rụkata, isi gbawa gị ghara ghara, kwụsị zurutụ ike. Ma ngwa ngwa i zuchara ike, laghachi n’ihe ị na-arụ.

Ka obi sie gị ike na ị ga-eme nke ọma. Cheta na ihe na-emekarị ka nwa akwụkwọ na-eme nke ọma bụ ịgụsi akwụkwọ ike, ọ bụchaghị inwe isi akwụkwọ. Ị ga-emeli nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Gbalịsie ike, ọ ga-abara gị uru.

[Foto dị na peeji nke 116]

E nwere ike iji ịga ụlọ akwụkwọ tụnyere ịsụpe ụzọ ị ga-esi apụta n’oké ọhịa—ma ị ga-emeli ha abụọ ma i jiri ezigbo ngwá ọrụ