Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Eji Ego M Na-eme Ihe Bara Uru?

Olee Otú M Ga-esi Eji Ego M Na-eme Ihe Bara Uru?

 ISI NKE 19

Olee Otú M Ga-esi Eji Ego M Na-eme Ihe Bara Uru?

Ugboro ole ka ọ na-adị gị ka i nweghị ego ga-ezuru gị ịzụ ihe ị chọrọ ịzụ?

□ O nweghị mgbe ọ bụ

□ Mgbe ụfọdụ

□ Ọtụtụ mgbe

Ugboro ole ka ị na-azụ ihe ị na-ejighị ego ya?

□ O nweghị mgbe ọ bụ

□ Mgbe ụfọdụ

□ Ọtụtụ mgbe

Ugboro ole ka ị na-azụ ihe na-adịghị gị mkpa, n’ihi na e rere ya ọnụ ala?

□ O nweghị mgbe ọ bụ

□ Mgbe ụfọdụ

□ Ọtụtụ mgbe

Ọ̀ NA-ADỊ gị ka ị naghị enwe ego na-ezuru gị ịzụ ihe ị chọrọ ịzụ? I nwere ike iche, sị, ‘A sị nnọọ na m ji ego, m gaara azụ ekwe ntị ahụ m chọrọ ịzụ. A sị nnọọ na m na-enwetakwu ego, m gaara azụ akpụkpọ ụkwụ ahụ m chere  na m kwesịrị ịzụ.’ Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike inwe ụdị nsogbu ahụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joan nwere. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị enyi m na-akpọ m ka m soro ha gaa mefuo oké ego. Achọrọ m ka mụ na ndị enyi m na-anọkọ, na-ekpori ndụ. Ọ dịghị onye ọ na-atọ ụtọ ịsị, ‘Unu ewela iwe, m gaghị agali n’ihi na ejighị m ego.’”

Kama ịnọ na-echegbu onwe gị banyere ego ị na-enweghị, í cheghị na ọ ka mma ịmụta otú ị ga-esi jiri ego i nwere na-eme ihe bara uru? I nwere ike ịsị ka i chere ruo mgbe naanị gị ga-ebi tupu gị amụwa otú e si eji ego eme ihe bara uru. Ma chegodị echiche, Ị̀ ga-amaba n’osimiri n’ebughị ụzọ mụta otú e si egwu mmiri? Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ịgbalịwa ịmụta otú e si egwu mmiri mgbe mmiri bu ya na-aga, ọ ga-aka mma ka onye ahụ buru ụzọ mụtatụ otú e si egwu mmiri tupu ya amaba n’osimiri!

N’otu aka ahụ, oge kacha mma ị ga-eji mụta otú e si eji ego eme ihe bara uru bụ mgbe gị na papa gị na mama gị ka bi, mgbe ị na-amalitebeghị ịkpa afọ gị. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ego bụ ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ma naanị ihe ga-eme ka ego chebe gị bụ ma ị kpachara anya n’otú i si emefu ya. Ime otú ahụ ga-eme ka obi sikwuo gị ike, meekwa ka papa gị na mama gị na-akwanyere gị ùgwù.

Mụta Ihe Ndị Dị Mkpa

Ị̀ jụtụla papa gị na mama gị ihe ilekọta ezinụlọ na-efu? Dị ka ihe atụ, ị̀ ma ego ole e ji akwụ ụgwọ ọkụ, azụta mmanụ ọkụ, na mmiri kwa ọnwa, ma ọ bụkwanụ ego ole e ji elekọta ụgbọala, azụ nri,  ma ọ bụ akwụ ụgwọ ụlọ? Cheta na i so ná ndị a na-emefuru ego ahụ niile. Ị gaa biri naanị gị, ọ bụ gị ga na-akwụ ụgwọ ndị ahụ. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma ị mata ego ole i nwere ike iji na-egbo mkpa gị. Gwa papa gị na mama gị ka ha gosi gị akwụkwọ ụfọdụ ha ji kwụọ ụgwọ ndị ahụ, geekwa ha ntị nke ọma mgbe ha na-akọrọ gị otú ha si hazie ego ha na-enweta iji na-akwụ ụgwọ ndị ahụ.

Otu ilu dị na Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka, ọ bụkwa onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.” (Ilu 1:5) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anna gwara papa ya na mama ya ka ha nye ya ezi ntụziaka. O kwuru, sị, “Papa m kụziiri m otú e si eme atụmatụ mmefu ego n’ezinụlọ, gwakwa m na ọ dị ezigbo mkpa idekọ ego ezinụlọ na-emefu.”

Mama Anna kụziiri ya ihe ndị ọzọ bara uru. Anna kwuru, sị, “Ọ kụziiri m na mmadụ chọọ ịzụ ihe, ọ bara ezigbo uru ikwe ihe ọnụ n’ebe dị iche iche. Mama m nwere ike iji ntakịrị ego zụta ihe ga-eju gị anya.” Olee uru ihe ndị a baara Anna? O kwuru, sị: “O meela ka m mara otú m ga-esi na-emefu ego m. M na-akpachara anya n’otú m si emefu ego. O meela  ka obi na-eru m ala n’ihi na anaghị m eji ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ.”

Chọpụta Ebe Ihe Na-esiri Gị Ike

N’eziokwu, ịkpachara anya n’otú i si emefu ego dị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme, nke ka nke, ma ọ bụrụ na a na-enye gị ego mmachi akpa ma ọ bụ na ị na-arụta ego mgbe ị ka bi n’ụlọ unu. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere ike ịbụ na ọ bụ papa gị na mama gị na-akwụ ọtụtụ ụgwọ ndị e kwesịrị ịkwụ. N’ihi ya, o nwere ike ịfọ nke nta ka ọ bụrụ na ị na-emefu ego gị niile otú ọ bụla ị chọrọ. Imefu ego na-atọ ụtọ.

Ma i nwere ike inweta nsogbu ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ gị enyewe gị nsogbu ka i mefuo ego karịrị akarị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Ellena kwuru, sị: “Ịzụ ihe na-atọgbu ndị ọgbọ m atọgbu. Mgbe ọ bụla m so ha pụọ, ọ na-adị anyị ka ọ̀ bụ iwu na anyị ga-emefu ego ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ.”

Ndị mmadụ na-achọkarị ịdị ka ndị enyi ha. Ma, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-eso ndị enyi m emefu ego n’ihi na m nwere ego, ka ọ̀ bụ n’ihi na m na-asọ ha anya?’ Ọtụtụ ndị na-emefu ego ka ndị enyi ha na ndị ibe ha na-akwanyere ha ùgwù. Ha na-agbalị ime ka ndị ọzọ too ha n’ihi ihe ha nwere, ọ bụghị n’ihi ụdị ndị ha bụ. Ụdị àgwà ahụ nwere ike ịkpatara gị ezigbo nsogbu ego, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ị ga-agbazi ego i ji azụ ihe. Olee otú ị ga-esi mee ka ụdị ihe ahụ ghara ime gị?

Kpachara Anya n’Otú I Si Emefu Ego

Kama ịgbaziri ego aghara aghara ma ọ bụ zụfuchaa ego gị niile otu ugboro, ọ́ gaghị aka mma ime ihe Ellena mere?  O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m so ndị enyi m pụọ, m na-ebu ụzọ kpebie ego ole m ga-emefu. A kwụọ m ụgwọ, m na-akwụnye ya n’ụlọ akụ̀ ozugbo. Naanị ihe m na-ewepụ bụ ego ole m chọrọ iji azụ ihe n’ebe ahụ anyị chọrọ ịga. Achọpụtakwara m na m gawa ịzụ ihe, ọ kaara mụ mma iso naanị ndị enyi m bụ́ ndị na-akpachara anya n’otú ha si emefu ego, ndị ga-agbakwa m ume ikwe ihe ọnụ n’ebe dị iche iche nakwa ka m ghara ịzụ ihe ọ bụla m hụrụ.”

Lee aro ndị ọzọ nwere ike ịbara gị uru ma ọ bụrụ na ị ga-agbazi ego.

● Na-edekọ ego ole ị gbaziiri ma jiri nlezianya lee ma ọ̀ bụkwa ihe dị n’akwụkwọ e dere ụgwọ i ji.

● Kwụọ ego ị gbaziiri ozugbo i nwetara ego. Ya kwe gị, kwụchaa ha niile.

● Kpachara anya n’otú i si agbazi ego. Ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ ka ị ga-agbazinara ego.

● Agbazila ego ị ga-akwụrụ ọmụrụ nwa. Ịgbazite ụdị ego ahụ nwere ike ime ka obi ghara iru gị ala.

● Ekwela ka onye ọzọ were aha gị gbaziri ego, ya bụrụgodị enyi gị.

Inwekwu ego ọ̀ ga-eme ka nsogbu ị na-enwe n’imefu ego laa? O nwere ike ọ gaghị eme! Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na ị na-anya ụgbọala ị na-agaghị akwụsịli, ma ọ bụ  ọ bụrụ na ị na-emechi anya ma ị nyawa ụgbọala, ịgbanyekwu mmanụ ụgbọala n’ụgbọala gị ọ̀ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe iru ebe ị na-aga n’udo? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị mụtaghị otú e si eji ego eme ihe bara uru, inwetakwu ego agaghị agwọta nsogbu gị.

I nwere ike iche na ị na-eji ego gị eme ihe bara uru. Ma jụọ onwe gị, sị: ‘Ego ole ka m mefuru n’ọnwa gara aga? Gịnị ka m ji ya mee?’ Ó doghị gị anya? Lee aro ụfọdụ ga-enyere gị aka iji ego gị na-eme ihe bara uru.

1. Dee ya ede. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’otu ọnwa, dee ego i nwetara na ụbọchị i nwetara ya. Dee ihe ọ bụla ị zụrụ na ego ole ị zụrụ ya. Ọnwa gwụ, gbakọọ ego ole i nwetara na ego ole i mefuru.

2. Dee otú ị ga-esi emefu ego gị. Lee anya na  chaatị dị na peeji nke 163. Na kọlụm nke mbụ, dee  ego ole ị na-atụ anya inweta n’otu ọnwa. Na kọlụm nke abụọ, dee otú ị chọrọ isi mefuo ego gị; were ihe ndị ahụ i dere na nke mbụ mere ihe atụ. Ka ọnwa na-aga, dee na kọlụm nke atọ ego ole i mechara mefuo na nke ọ bụla n’ime ihe ndị i bu n’obi ime. Deekwa ego niile i mefuru ị na-ebughị n’obi imefu.

3. Gbanwee otú i si emefu ego. Ọ bụrụ na ego ị na-emefu n’ihe ụfọdụ karịrị ego ole i bu n’obi imefu, ya emee ka ị na-eji ụgwọ, gbanwee otú i si emefu ego. Kwụọ ụgwọ i ji. Kpachara anya n’otú i si emefu ego.

Ego bara ezigbo uru ma e jiri ya na-eme ihe kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, n’ọtụtụ obodo, ịkpata ego na iji ego eme ihe bara uru dị mkpa ná ndụ. Ma, gbalịsie ike ka ị na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthew kwuru, sị: “Ego bara uru, ma ọ bụghị ya bụ ihe kacha mkpa. Mmadụ ekwesịghị iji ya kpọrọ mkpa, chefuo ezinụlọ ya ma ọ bụ Jehova.”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ezinụlọ unu ọ̀ dara ogbenye? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi jiri ọnọdụ gị mee ihe ga-akacha baara gị uru?

AMAOKWU BAỊBỤL

Ego bụ ihe nchebe; ma ihe ihe ọmụma ji ka mma bụ na amamihe na-echebe ndị nwe ya ndụ.Ekliziastis 7:12.

NDỤMỌDỤ

Ị chọọ ịga ahịa, buru ụzọ dee ihe ị chọrọ ịzụ. Were naanị ego ole ị ga-eji azụ ihe ndị ahụ, zụọkwa naanị ihe i dere.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na ị gbaziri puku naịra abụọ, kweta na ị ga na-akwụ ọmụrụ nwa narị naịra atọ na iri asaa, ọ bụrụ na ị kwụghị ya ruo otu afọ, ọmụrụ nwa ya ga-abụzi puku naịra anọ, narị anọ na iri anọ.

IHE M GA-EME!

Otú m ga-esi akpachara anya n’imefu ego bụ ․․․․․

M chọọ ịgbaziri ego, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere i ji kwesị ịmụta otú ị ga-esi jiri ego gị na-eme ihe bara uru mgbe gị na papa gị na mama gị ka bi?

● Gịnị nwere ike ime ka o siere gị ike iji ego gị na-eme ihe bara uru?

● Olee ụzọ ụfọdụ ị ga-esi jiri ego gị na-enyere ndị ọzọ aka?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 162]

“M dee otú m ga-esi emefu ego m ede, anaghị m emefu oké ego, anaghịkwa m azụ ihe na-adịghị mụ mkpa.”—Leah

Igbe dị na peeji nke 158]

Gịnị Ka Ego Gị Na-ekwu Banyere Gị?

Gịnị ka ị na-eji ego gị eme? Ọ bụrụ na ị na-eji ego gị enyere ndị ọzọ aka mgbe niile, i ji ego gị egosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi, ọ bụghị naanị ikwu ya n’ọnụ. (Jems 2:14-17) Ọ bụrụ na i ji ego gị enye onyinye mgbe niile iji kwado ezi ofufe, i ji ‘ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa na-asọpụrụ Jehova.’ (Ilu 3:9) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị na-eji ego gị egbo naanị mkpa onwe gị, gịnị ka ego gị na-ekwu banyere gị?

 [Chaatị na Foto ndị dị na peeji nke 163]

 Ebe M Dere Ihe

Otú M Ga-esi Na-emefu Ego M Kwa Ọnwa

Depụta ihe a!

Ego Ole M Ga-enweta

EGO MMACHI AKPA

ỌRỤ NWA OGE

IHE NDỊ ỌZỌ

Ngụkọta

₦․․․․․

Ego Ole M Ga-emefu

NRI

․․․․․

UWE

․․․․․

EKWE NTỊ

․․․․․

NTỤRỤNDỤ

․․․․․

ONYINYE AFỌ OFUFO

․․․․․

EGO M DEWERE

․․․․․

IHE NDỊ ỌZỌ

․․․․․

Ngụkọta

₦․․․․․

Ego Ole M Mefuru

NRI

․․․․․

UWE

․․․․․

EKWE NTỊ

․․․․․

NTỤRỤNDỤ

․․․․․

ONYINYE AFỌ OFUFO

․․․․․

EGO M DEWERE

․․․․․

IHE NDỊ ỌZỌ

․․․․․

Ngụkọta

₦․․․․․

[Foto dị na peeji nke 160]

Imefu ego aghara aghara dị ka imechi anya mgbe ị na-anya ụgbọala