Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Ntụrụndụ M Kwesịrị Inwe?

Olee Ụdị Ntụrụndụ M Kwesịrị Inwe?

 ISI NKE 32

Olee Ụdị Ntụrụndụ M Kwesịrị Inwe?

Kanye akara n’eziokwu ma ọ bụ n’ụgha n’okwu ndị a.

Baịbụl kwuru na . . .

Ọ dịghị mma igwu egwuregwu.

□ Eziokwu □ Ụgha

A na-amụta ihe ọjọọ na fim niile nakwa n’ihe niile a na-egosi na TV.

□ Eziokwu □ Ụgha

Ihe ọ bụla bụ́ ịgba egwú adịghị mma.

□ Eziokwu □ Ụgha

 KA E were ya na ngwụsị izu eruola. Ị rụọla ezigbo ọrụ n’izu a. Unu agbasaala ụlọ akwụkwọ. Ị rụchaala ọrụ ị na-arụ n’ụlọ. Ma, ike agwụbeghị gị. Ọ bụ uru ịbụ onye na-eto eto baara gị. (Ilu 20:29) Ma, ihe ị chọrọ ime ugbu a bụ ịtụrụ ndụ.

Ụmụaka ibe gị nwere ike na-eche na Baịbụl kwuru na i kwesịghị ịtụrụ ndụ, ya bụ na ọ naghị ekwe gị kporie ndụ. Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Ka anyị tụlee ihe ndị ahụ a gwara gị kanye akara na ha, ka anyị chọpụta ihe Baịbụl kwuru banyere ịtụrụ ndụ.

Ọ dịghị mma igwu egwuregwu.

Ụgha. Baịbụl kwuru na ‘ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’ (1 Timoti 4:8) Okwu Grik e si sụgharịta “ọzụzụ” n’amaokwu ahụ Pọl dere pụtara ‘inweta ọzụzụ dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ́,’ ya bụ, imega ahụ́. Taa, e nwere ọtụtụ egwuregwu dị mma e nwere ike iji atụrụ ndụ, dị ka ịgba ọsọ n’elu snoo, ịgba ígwè, ịgba mwe mwe ọsọ, ịkụ tenis, ịkụ baseball, ịgba bọl, ịkụ volleyball, na egwuregwu ndị ọzọ.

Ọ̀ pụtara na mmadụ ekwesịghị ịkpachara anya? Tụlegodị ihe a na-ekwu n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ahụ. Mgbe Pọl onyeozi na-edere nwa okorobịa bụ́ Timoti akwụkwọ, o kwuru, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru; ma nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe niile, ebe o nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a, na ndụ nke gaje ịbịa.” Okwu Pọl na-echetara anyị na ime ihe dị Chineke mma mgbe niile kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Otú ị ga-esi eme ka ịsọpụrụ Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị—ọbụna mgbe ị na-ahọrọ ụdị egwuregwu ị ga-egwu—bụ ịjụ onwe gị ajụjụ atọ a:

1. Mmadụ ò nwere ike imerụ ezigbo ahụ́ n’ụdị egwuregwu a? Ekwela ka ihe ndị ọzọ na-ekwu ma ọ bụ otú ndị na-eto eto ndị ọzọ si ekwu okwu ọma banyere ya megharịa gị anya. Chọpụta nke bụ́ eziokwu. Dị ka ihe atụ, chọpụta  ihe ndị a: Mmadụ ole na-emerụ ahụ́ na ya? Olee ihe mmadụ ga-eme ka ọ ghara imerụ ahụ́? Ka mmadụ ghara imerụ ahụ́ n’egwuregwu ahụ, olee ihe ọ ga-eji egwu ya na ihe o kwesịrị ịma banyere ya? Ọ bụ ezie na o siri ike ịhụ egwuregwu a na-anaghị emerụ ahụ́ na ya, ihe e kwo egwu egwuregwu a ọ̀ bụ ka a hụ onye na-agaghị emerụ ahụ́ ma ọ bụ onye na-agaghị anwụ?

Ndụ bụ onyinye Chineke nyere anyị. Iwu o nyere ndị Izrel kwuru ihe a ga-eme onye gburu mmadụ na mberede. (Ọpụpụ 21:29; Ọnụ Ọgụgụ 35:22-25) O mere ka ndị Chineke na-akpachapụ anya n’ihe ha na-eme. (Diuterọnọmi 22:8) Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịkwanyere ndụ ùgwù otú ahụ.

2. Ndị mụ na ha ga-egwu egwuregwu a hà bụ ezigbo mmadụ? Ọ bụrụ na ị ma otú e si egwu egwuregwu, ụmụaka ibe gị na ndị nkụzi gị nwere ike inye gị nsogbu ka ị banye n’òtù egwuregwu ụlọ akwụkwọ unu. O nwere ike ịgụsi gị agụụ ike ịbanye n’òtù a. Otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Mark kwuru, sị: “Ihe papa m na mama m mere m adịghị mma. Ha gwara m abanyela n’òtù egwuregwu ụlọ akwụkwọ anyị.” Ma, kama inye papa gị na mama  gị nsogbu ka ha kwe gị ka i mee ihe ị chọrọ ime, ihe ị ga-echebara echiche bụ: Ọ bụ mgbe a gbasara ụlọ akwụkwọ ka a na-amụ egwuregwu ma ọ bụ na-egwu ya. Ọ bụrụ na ị na-emeta ya, obi ga-adị gị mma itinyekwu oge. Ọ bụrụ na ị naghị emeta ya, ị ga-achọ iwepụtakwu oge mụọ ya. Ọzọkwa, ndị òtù egwuregwu na-aghọ ezigbo enyi mgbe ha na-aṅụrị ọṅụ mmeri ha nwetara, obi na-ajọkwa ha njọ mgbe e meriri ha.

Ugbu a, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ ejiri oge m na-egwu egwuregwu ga-eme ka mụ na ndị na-eto eto bụ́ ndị ụwa bụrụ ezigbo enyi, ọ̀ ga-eme ka m na-akpa ezi àgwà?’ (1 Ndị Kọrịnt 15:33) ‘Ọ bụrụ na m chọrọ ịbanye n’òtù egwuregwu, olee ihe m ga-achụli n’àjà?’

3. Awa ole na ego ole ka egwuregwu ahụ ga-eri m? Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị “chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Ọ bụrụ na ị chọrọ ige ntị na ndụmọdụ ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Egwuregwu a ọ̀ ga-eri m oge m chọrọ iji arụ ihe ndị nkụzi nyere m ka m rụọ n’ụlọ ma ọ bụ oge m ji eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke? Ego ole ka ọ ga-efu m? M̀ ga-akwụli ya?’ Ịza ajụjụ ndị ahụ ga-enyere gị aka ibute ihe ndị dị mkpa ụzọ.

 A na-amụta ihe ọjọọ na fim niile nakwa n’ihe niile a na-egosi na TV.

Ụgha. Baịbụl nyere Ndị Kraịst iwu ka ha ‘jisie ihe dị mma aka ike’ ma ‘zere ụdị ajọ omume niile.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:21, 22) Ọ bụghị fim niile na ihe niile a na-egosi na TV megidere ihe ahụ Baịbụl kwuru. *

N’eziokwu, ịga lee fim bụ otu ụzọ mmadụ na ndị enyi ya nwere ike isi tụrụ ndụ. Otu nwa agbọghọ onye South Africa aha ya bụ Leigh kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere fim m chọrọ ịga lee, ana m akpọ otu enyi m n’ekwe ntị, anyị agwa ya ndị enyi anyị ndị ọzọ.” Ọ bụ ha na-abụkarị ndị mbụ ga-ele fim ahụ a ga-egosi. Ha lechaa, papa ha na mama ha ejiri ụgbọala bịa buru ha gaa ebe a na-ere nri, ha niile erie nri.

O nwere ike ịbụ na fim na TV bụ ihe ọgbara ọhụrụ, ma ha nọchiri anya ihe a na-eme mgbe ochie, ya bụ, ịkọ akụkọ. Jizọs ma otú e si akọ akụkọ na-eru ndị mmadụ n’obi. Dị ka ihe atụ, akụkọ ọ kọrọ banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na-eme ka ndị mmadụ nwee ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-akụzikwara anyị otú e si akpa àgwà ọma.—Luk 10:29-37.

Taa, ndị na-eme fim na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-akpa àgwà. Ha na-agbalị ime ka ndị na-ele fim na-akpa àgwà ka ndị ha hụrụ na fim, ọ bụrụgodị na ndị ahụ bụ ndị omekome ma ọ bụ ndị arụrụala chọrọ ịchị ọchịchị n’ike. Ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, i nwere ike na-atụ anya ka ihe dịrị onye arụrụala ahụ mma, na-ekwu n’obi  gị na ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme dị mma! Olee otú ị ga-esi ezere ọnyà a?

Mgbe ị na-ahọrọ fim ma ọ bụ ihe a na-eme na TV, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ ga-eme ka m mụta inwe obi ọmịiko?’ (Ndị Efesọs 4:32) ‘Ka ọ̀ ga-eme ka m na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi dakwasịrị onye ọzọ?’ (Ilu 17:5) “Ọ̀ ga-eme ka o siere m ike ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’?” (Abụ Ọma 97:10) ‘Ọ̀ ga-eme ka m kwado “ndị ọjọọ”?’—Abụ Ọma 26:4, 5.

Ihe a na-egosi mgbe a na-akpọsa fim na ihe e kwuru banyere ya nwere ike ime ka ị mata ihe dị na ya. Ma emela ka onye iberiibe ‘kweta okwu niile.’ (Ilu 14:15) N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ahụ e kwuru banyere fim bụ ihe onye ọzọ chere. Ndị na-akpọsa fim nwekwara ike ilezi anya zoo ebe e mere ihe na-adịghị mma. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Connie kwuru, sị: “Achọpụtara m na ọ bụrụ na ị mata ndị mere fim, ị ga-amata ihe e nwere ike ime na ya.”

 Ụmụaka ibe gị bụ́ Ndị Kraịst, ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ, nwere ike ịma ma fim ị chọrọ ile ọ̀ dị mma. Ma cheta na ndị mmadụ na-agwakarị ndị ọzọ ihe tọrọ ha ụtọ na fim ha lere. Ọ ga-adị mma ka ị jụọ ma è nwere ihe na-adịghị mma na fim ahụ. Kpọọ okwu aha. Dị ka ihe atụ, jụọ ma è nwere ebe e gosiri ndị na-eme ihe ike, ndị na-enwe mmekọahụ ma ọ bụ ndị na-eme anwansi na ya. I nwekwara ike ịjụ papa gị na mama gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vanessa kwuru, sị: “Ana m ajụ papa m na mama m ihe ha chere. Ọ bụrụ na ha ekwuo na ọ dị mma, mụ agaa lee ya.”

Mata na ikpebi fim ma ọ bụ ihe a na-egosi na TV ị ga-ele abụghị okwu egwuregwu. N’ihi gịnị? N’ihi na ntụrụndụ ị họọrọ ga-eme ka a mata ihe dị gị n’obi, meekwa ka a mata ihe dị gị mkpa. (Luk 6:45) Ụdị fim ị na-ahọrọ na-egosi ụdị ndị enyi na-amasị gị, ụdị okwu ị na-ekwu, na otú i si ele mmekọahụ anya. N’ihi ya, na-ahọ ha ahọ!

Ihe ọ bụla bụ́ ịgba egwú adịghị mma.

Ụgha. Mgbe ndị Izrel gafere Oké Osimiri Uhie ma gbanahụ ndị agha Ijipt, Miriam du ụmụ nwaanyị Izrel n’ịgba egwú mmeri. (Ọpụpụ 15:20) Ọzọkwa, n’ilu Jizọs tụrụ banyere nwa mmefu, ihe e ji na-aṅụrị ọṅụ mgbe nwa mmefu ahụ lọtara bụ ‘iti egwú na ịgba egwú.’—Luk 15:25.

Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. N’ọtụtụ obodo, ma ụmụaka ma ndị toro eto na-agba egwú mgbe ndị ikwu na ibe zukọrọ.  Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Ọ bụ ezie na Baịbụl ekwughị na ịkpọ obere oriri dị njọ, o kwuru na “oriri oké mkpọtụ” adịghị mma. (Ndị Galeshia 5:19-21) Aịzaya onye amụma dere, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịga chọọ mmanya na-egbu egbu, ndị na-anọ ruo mgbe chi jiri ka mmanya wee mee ka ahụ́ nwuru ha ọkụ! Une na ụbọ akwara na obere ịgbà na ọjà, na mmanya na-adị n’oriri ha; ma ha adịghị ele anya n’ihe Jehova na-eme.”—Aịzaya 5:11, 12.

A ṅụrụ “mmanya na-egbu egbu,” kụọkwa egwú na-ada oké ụda ná nnọkọ ndị ahụ. Ha na-amalite n’isi ụtụtụ ruo mgbe chi jiri. Chetakwa àgwà ndị bịara nnọkọ ahụ kpara—ha mere ka à ga-asị na Chineke adịghị! Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji kwuo na nnọkọ ndị ahụ adịghị mma.

Ọ bụrụ na a kpọọ gị ka ị bịa nnọkọ a ga-agba egwú na ya, jụọ onwe gị, sị: “Ole ndị ga-abịa ya? Olee ụdị ndụ ha na-ebi? Ònye ka nnọkọ ahụ ga-adị n’isi? Ònye ga-ahụ  na ihe niile a ga-eme gara n’usoro? Papa m na mama m hà kwere ka m gaa? Olee ụdị egwú a ga-agba ebe ahụ?’ E ji ọtụtụ n’ime ụzọ ndị mmadụ si agba egwú akpali agụụ mmekọahụ. Ọ bụrụ na ị gbaa ụdị egwú ahụ ma ọ bụ lee ya, ọ̀ ga-eme ka ị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ’?—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

Ọ́ bụrụkwanụ na a kpọrọ gị ka ị bịa gbaa egwú n’ebe a na-eri oriri na nkwari n’abalị? Tụlee ihe otu onye na-eto eto aha ya bụ Shawn kwuru. Mgbe ọ na-aghọbeghị Onye Kraịst, ọ na-ejekarị ebe a na-agba egwú. O kwuru, sị: “Egwú a na-akụ ebe ahụ na egwú a na-agba na ya rụrụ arụ, ọtụtụ ndị na-aga ebe ahụ nwere ihe ha bu n’obi.” Shawn kwuru na ihe ha bu n’obi bụ isi ebe ahụ kpọrọ onye ha na ya ga-enwe mmekọahụ. Shawn gbanwere echiche ya mgbe ya na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl. Gịnị ka o kwuru? Ọ sịrị: “Ebe ahụ abụghị maka Ndị Kraịst.”

Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịkpachara Anya?

Olee mgbe i chere ọ na-adị mfe ịlụso onye agha ọgụ—ọ̀ bụ mgbe ọ nọ n’ihu agha ka ọ̀ bụ mgbe ya na ndị enyi  ya na-atụrụ ndụ? N’eziokwu, ọ bụ mgbe ọ na-atụrụ ndụ ka ọ na-echefu onwe ya, ya adị mfe ịlụso ya agha. N’otu aka ahụ, mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ, ị na-akpachara anya ịkpa ezi àgwà. Ị na-elezi anya a dịghị ama ama. Ọ bụzi mgbe gị na ndị enyi gị na-atụrụ ndụ ka ọ kacha dịrị mfe ịrata gị ime ihe na-adịghị mma.

Ụfọdụ ụmụaka ibe gị nwere ike ịchị gị ọchị n’ihi na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru banyere ntụrụndụ. Ụfọdụ ndị na-eto eto papa ha na mama ha bụ Ndịàmà Jehova nwekwara ike inye gị nsogbu. Ma, akọnuche ndị dị otú ahụ dị ka ihe a dara ígwè ọkụ. (1 Timoti 4:2) Ha nwere ike na-akpọ gị onye iberiibe ma ọ bụ onye oké ezi omume. Ma kama ime ihe ụmụaka ibe gị chọrọ n’ihi nsogbu ha na-enye gị, ‘nwee ezi akọnuche.’—1 Pita 3:16.

Ihe dị mkpa abụghị ihe ụmụaka ibe gị na-eche banyere gị, kama ọ bụ ihe Jehova na-eche banyere gị! Ọ bụrụ na ndị enyi gị na-enye gị nsogbu n’ihi na ị na-eme ihe akọnuche gị gwara gị, i kwesịrị ịchọ ndị enyi ọzọ. (Ilu 13:20) Cheta na, mee elu mee ala, ọ dị gị n’aka ịhụ na ị kpara ezi àgwà i kpebiri na ị ga na-akpa—ọbụna mgbe ị na-atụrụ ndụ.—Ilu 4:23.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 37

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Foto ndị gba ọtọ juru ebe niile ugbu a, kakwa mfe ile ya karịa mgbe mbụ. Olee otú ị ga-esi zere ọnyà a?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 22 Gụkwuo banyere ile TV na nwanne akwụkwọ a e bu ụzọ bipụta, isi nke 36.

AMAOKWU BAỊBỤL

Ṅụrịa ọṅụ, nwa okorobịa, jeekwa ije dị ka ihe dị gị n’obi si dị nakwa dị ka ihe anya gị na-ahụ si dị. Kama mara na ezi Chineke ga-ekpe gị ikpe n’ihi ihe ndị a niile.Ekliziastis 11:9.

NDỤMỌDỤ

Jụọ papa gị na mama gị ma hà ga-ewepụta oge kwa ọnwa ka mmadụ niile nọ n’ezinụlọ unu tụrụtụ ndụ mgbe a na-agbanyeghị TV.

Ị̀ MA NA . . . ?

Egwú na ịgba egwú so n’ihe ndị dị mkpa ndị Izrel ji fee Chineke ezi ofufe.—Abụ Ọma 150:4.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na a kpọrọ m ka m soro òtù egwuregwu ụlọ akwụkwọ anyị nke na-egwu egwuregwu mgbe a gbasara ụlọ akwụkwọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na fim mụ na ndị enyi m na-ele adịghị mma, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji zere egwuregwu e nwere ike imerụ ezigbo ahụ́ na ya?

Olee otú ị ga-esi amata ma fim ị chọrọ ile ọ̀ dị mma?

Olee otú ị ga-esi akọwa ụdị ịgba egwú dị mma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 269]

“Ịgba egwú na-atọ m ụtọ, ma amụtala m na ige ntị na ndụmọdụ papa m na mama m bara uru. Anaghị m ekwe ka ịgba egwú rie m isi.”—Tina

[Foto dị na peeji nke 268]

Ọ bụ mgbe onye agha na-atụrụ ndụ ka ọ na-echefu onwe ya, ya adị mfe ịlụso ya agha, ọ bụkwa mgbe ị na-atụrụ ndụ ka ọ dị mfe ịrata gị ime ihe na-adịghị mma