Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ezinụlọ Anyị Dara Ogbenye?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ezinụlọ Anyị Dara Ogbenye?

 ISI NKE 20

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ezinụlọ Anyị Dara Ogbenye?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Gregory bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. O nweghị ike ịzụta uwe ma ọ bụ ihe ndị dị ka redio na TV ụmụaka ibe ya bi n’Ala Bekee na-azụ. Ọnọdụ ya malitere iwe ya ezigbo iwe, ya achọwa ịkwaga Austria. Ì chere na Gregory dara ogbenye?

□ Ee □ Ee e

N’otu obodo dị n’ebe ndịda Africa, e nwere otu onye na-eto eto aha ya bụ Loyiso. Ya na ndị ezinụlọ ya bi n’ụlọ akịrịka dị n’otu ime ime obodo. Ọ na-abụ Loyiso hụ ndị ọzọ na-eto eto bi n’otu obodo dị nso mepere emepe—ebe e nwere ihe ndị dị ka mmiri pọmpụ na ọkụ eletrik—ya adị ya ka ya bụrụ ha. Ị̀ ga-asị na Loyiso dara ogbenye?

□ Ee □ Ee e

Ị GA-AHỤ na okwu a bụ́ “ogbenye” apụtaghị otu ihe n’obodo niile. Dị ka ihe atụ, Gregory nwere ike iche na ya bụ ogbenye ọnụ ntụ. Ma, ọ bụ ọgaranya ma e jiri ya tụnyere Loyiso. I kwesịrị icheta na n’agbanyeghị otú ị daruru ogbenye, e nwere ike nwee ndị ị ka mma. Ma, ọ bụrụ na i nweghị uwe mara mma ị ga-eyi gaa ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na unu enweghị mmiri pọmpụ, o nwere ike ọ gaghị abara gị ezigbo uru ma a gwa gị na e nwere ndị ị ka mma.

Ụfọdụ ndị na-eto eto a mụrụ n’ezinụlọ dara ogbenye  na-eche na ha abaghị uru. N’ihi ya, ha na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike iji chefuo ọnọdụ ha. Otú ọ dị, ime ụdị ihe ahụ anaghị eme ka ihe ka mma. Ndị na-aṅụ oké mmanya na-achọpụta na ‘mmanya na-ata nnọọ dị ka agwọ, ọ na-atanyekwa elò dị nnọọ ka ajụala.’ (Ilu 23:32) Otu nwata nwaanyị onye South Africa aha ya bụ Maria bi n’ezinụlọ dara ogbenye nke nwere naanị nne. O kwuru, sị: “Mmadụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike iji chefuo ụwa ya na-akpata nsogbu karịrị aka ọ na-enye.”

Ma eleghị anya, ị gaghị aṅụwa oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike iji chefuo nsogbu gị, ma o nwere ike ịdị gị ka ụwa gị ọ̀ gwụla. Olee ihe ga-enyere gị aka? E nwere ike iji ndụmọdụ dị na Baịbụl tụnyere ihe e ji atọpụ mmadụ n’agbụ, mee ka onye ahụ nwee olileanya. Ka anyị hụ otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka.

Chebara Ihe Ndị Dị Mma I Nwere Echiche

Otu ihe dị mkpa ga-enyere gị aka bụ ilekwasị anya n’ihe ndị i nwere, ọ bụghị n’ihe ndị ị na-enweghị. Otu n’ime ihe bara ezigbo uru karịa ego bụ ezinụlọ ebe e nwere ịhụnanya! Otu ilu dị na Baịbụl kwuru, sị: “Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.” (Ilu 15:17) Enyemaka “òtù ụmụnna dum” na-enye ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst bụ ihe kacha baa uru ha nwere.—1 Pita 2:17.

I nwekwara ike gbalịa ile ihe ndị i nwere anya n’ụzọ ka mma. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na i bighị n’ezigbo ụlọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i bi n’ụlọ akịrịka. Ma eleghị anya, ị na-eyi uwe ochie dị nkịkara ma ọ bụ nke a kwachiri akwachi. O nwekwara ike na-agụ gị agụụ iri ụdị nri dị iche iche na-edozi  ahụ́. Ma, ọ̀ bụ uwe mara mma na ụlọ ndị oké ozu ga-eme ka i mee ihe dị Chineke mma? Ọ̀ bụ iri nri dị oké ọnụ ga-eme ka ị dịrị ndụ ma nwee ahụ́ ike? Mbanụ. Pọl onyeozi mụtara ihe bara uru na nke a. Ọ maara otú ịba ọgaranya na ịda ogbenye na-adị. (Ndị Filipaị 4:12) Olee ihe ọ mụtara na ya? Ọ sịrị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:8.

Otu nwoke onye South Africa aha ya bụ Eldred bụ́ onye a mụrụ n’ezinụlọ dara ogbenye kwuru, sị: “Anyị ghọtara na ihe siiri ezinụlọ anyị ike, nakwa na anyị enweghị ike inweta ihe niile anyị chọrọ.” Eldred kwuru na mgbe o yigburu traụza o ji aga ụlọ akwụkwọ, naanị ihe mama ya na-eme bụ ịkwachi ya mgbe ọ bụla ọ dọkara! Eldred kwuru, sị: “E ji ya na-akọ m ọnụ, mụ edie ya. Ma ihe dị mkpa bụ na uwe anyị na-adị ọcha, anyị anaghịkwa agba ọtọ.”

Na-akwanyere Onwe Gị Ùgwù

Otu nwata nwoke dị afọ iri na otu aha ya bụ James na nwanne ya nwaanyị na mama ha bi ná mkpọkọrọ ụlọ dị nso na Johannesburg dị na South Africa. Ha bụ ogbenye ọnụ ntụ. N’agbanyeghị nke ahụ, James ka nwere ihe bara uru, ya bụ, oge ya na ume ya. Ọ na-atọkwa ya ụtọ iji ha enyere ndị ọzọ aka. Ná ngwụcha izu ọ bụla, ọ na-aga enye aka  n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ebe ha bi. Ọrụ ahụ mere ka James jiri oge ọ gaara eji anọrọ nkịtị na-arụ ọrụ, meekwa ka obi na-atọ ya ụtọ na ya na-arụ ihe bara uru, nke mere ka a na-akwanyere ya ùgwù. O kwuru, sị: “M rụchaa ọrụ n’ụbọchị ọ bụla n’ebe ahụ anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, obi na-atọ m ezigbo ụtọ!”

Ọrụ ọzọ bara uru bụ ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Matiu 24:14) Ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ahụ mgbe niile. Ọrụ ahụ ha na-arụ na-eme ka ndị ọzọ nwee olileanya maka ndụ ka mma n’ọdịnihu, na-emekwa ka a na-akwanyere ha ùgwù. N’eziokwu, a naghị akwụ ha ụgwọ n’ọrụ a. Ma, cheta ozi Jizọs ziri Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ dị na Smeana n’oge ochie. Ha dara nnọọ ogbenye. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha, sị: “Amaara m mkpagbu gị na ogbenye ị dara—ma  ị bara ọgaranya.” N’ikpeazụ, ebe ọ bụ na ha nwere okwukwe n’ọbara Jizọs wụsara, ha ga-aba ezigbo ọgaranya, ya bụ, inweta okpueze bụ́ ndụ anwụghị anwụ.—Mkpughe 2:9, 10.

Nwee Olileanya

I nwere ike ime ka gị na Jehova dị ná mma ma ị̀ bara ọgaranya ma ị̀ dara ogbenye. Baịbụl kwuru, sị: “Ọgaranya na ogbenye ezutewo. Onye kere ha niile bụ Jehova.” (Ilu 22:2) Ihe ahụ Baịbụl kwuru enyerela ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eto eto aka idi ogbenye. Ha ghọtara na ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ abụghị akụnụba, kama ọ bụ ime Jehova Chineke enyi, bụ́ onye ọ na-atọ ụtọ ka ndị niile chọrọ ife ya ofufe bụrụ ndị enyi ya. Chineke nyere anyị olileanya maka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ndị mmadụ na-agaghị ada ogbenye.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

Ka ọ dịgodị, jiri ihe i nwere na-eme ihe bara uru. Nwee olileanya. Kpakọọrọ onwe gị akụ̀ ime mmụọ. (Matiu 6:19-21) Were ịda ogbenye dị ka nsogbu ị ga-emerili!

AMAOKWU BAỊBỤL

Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.Luk 12:15.

NDỤMỌDỤ

Agbala chaa chaa, aṅụla sịga, aṅụbigala mmanya ókè. Ọ bụrụ na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ unu na-eme ihe ndị ahụ, esola ha. Ị kpaa ezi àgwà, ha nwere ike iṅomi gị.

Ị̀ MA NA. . . ?

Ọ bụrụ na i mee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka obi na-atọ gị ezigbo ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ gị.—Ndị Filipaị 4:12, 13; 1 Timoti 6:8; Ndị Hibru 13:5.

IHE M GA-EME!

Ihe ndị bara uru m nwere bụ ․․․․․

Otú m ga-esi eji ihe ndị ahụ nyere ndị ọzọ aka bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere “ogbenye” apụtaghị otu ihe n’obodo niile?

● Gịnị mere mmadụ ịṅụ ihe ndị ka ọgwụ ike na mmanya iji chefuo ụwa ya ji bụrụ iberiibe?

● Olee ihe ndị bara uru ị ga-eme ga-enyere gị aka idi ogbenye?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 168]

“Ọ bụ eziokwu na ọ dị m ka ogbenye ọ̀ tụrụ m mkpọrọ, ama m na iso òtù ọjọọ ma ọ bụ ịga zuo ohi agaghị eme ka nsogbu m kwụsị. Taa, ọtụtụ ndị ọgbọ m mere ihe ndị ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma ọ bụ bụrụ ndị na-abaghị uru n’obodo, ndị aṅụrụma na ndị na-aṅụ ọgwụ ike.”—George

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 164]

Ebe M Dere Ihe

M̀ Kwesịrị Ịkwaga Mba Ọzọ?

Ụfọdụ ndị na-eto eto chọrọ ịkwaga mba ọzọ gaa kpata ego ha ga-eji nyere onwe ha ma ọ bụ ezinụlọ ha aka. Ndị ọzọ na-aga ka ha gaa mụta asụsụ mba ahụ, gụkwuo akwụkwọ ma ọ bụ ka ha gbaara nsogbu dị n’obodo ha ọsọ. Ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst akwagala obodo ọzọ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ikpebi ịkwaga mba ọzọ abụghị obere ihe. N’ihi ya, i kwesịghị ime ya n’ebughị ụzọ chebara ya echiche. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwaga mba ọzọ, gụọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a e dere ebe a, ma tụgharịa uche na ha. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị ahụ, ma dee ihe ị zara ná mpempe akwụkwọ. Kpee ekpere maka ya ma kpebie ihe ị ga-eme.

□ Olee akwụkwọ ikike ndị m kwesịrị inweta?—Ndị Rom 13:1.

□ Ego ole ka ịkwaga mba ọzọ ga-efu m?—Luk 14:28.

□ Gịnị ka m na-arụ ugbu a na-egosi na m ga-elekọtali onwe m ma m kwaga ebe ahụ?—Ilu 13:4.

□ Olee ndụmọdụ ndị dimkpa bitụrụla ná mba ọzọ nyerela m?—Ilu 1:5.

□ Gịnị ka papa m na mama m chere banyere ya?—Ilu 23:22.

□ Olee ihe mere m ji chọọ ịkwaga mba ọzọ? —Galeshia 6:7, 8.

□ Ọ bụrụ na mụ na ndị ọzọ ga-ebi, hà ga-agba m ume iji ofufe Chineke kpọrọ ihe?—Ilu 13:20.

□ Olee nsogbu nwere ike imebi omume ọma m na adịm ná mma mụ na Chineke? Oleekwa ihe nwere ike imerụ m ahụ́ n’ebe ahụ?—Ilu 5:3, 4; 27:12; 1 Timoti 6:9, 10.

□ N’eziokwu, olee uru m chere m ga-erite ma m kwaga mba ọzọ?—Ilu 14:15.

[Foto dị na peeji nke 167]

Ndụmọdụ dị na Baịbụl yiri ihe a ga-eji atọpụ gị n’agbụ, mee ka i nwee olileanya