Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?

Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?

 ISI NKE 11

Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?

Olee ụdị nkwurịta okwu na-amasị gị?

□ Nke a na-ekwu ihu na ihu

□ Nke a na-ekwu n’ekwe ntị

□ Nke a na-eji kọmputa ekwurịta

Olee ndị ọ na-akacha adịrị gị mfe gị na ha ikwurịta okwu?

□ Ụmụ klas unu

□ Ndị ezinụlọ unu

□ Ndị Kraịst ibe gị

Olee ebe i chere ahụ́ na-aka eru gị ala ma ị na-ekwu okwu?

□ N’ụlọ akwụkwọ

□ N’ụlọ

□ N’ọmụmụ ihe ọgbakọ

LEE anya n’ihe ị zara n’ajụjụ nke mbụ ahụ. Ị̀ zara na iji kọmputa agwa mmadụ okwu na-akara gị mma karịa ịgwa mmadụ okwu ihu na ihu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, na-agbalịkwa ka ha ghara itisa. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Elaine kwuru, sị: “Ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ịmata ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa, ya bụ, ndị ha na-enweghị ike ịmata ma a sị na Ịntanet adịghị.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Tammy kwuru ihe ọzọ mere o ji atọ ndị mmadụ ụtọ ịmata ndị mmadụ n’Ịntanet. O kwuru, sị: “N’Ịntanet, ụdị onye ị gwara ndị mmadụ na ị bụ ka ha ga-ewere. Mgbe gị na ha na-ekwu okwu ihu na ihu, ọ bụrụ na otú ị dị adịghị ha mma, ọ dịghị ihe i nwere ike ime banyere ya.”

Ugbu a, lee anya n’ihe ị zara n’ajụjụ nke abụọ na nke atọ. Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ahụ́ na-eru gị ala mgbe gị na ụmụ klas unu na-ekwurịta okwu karịa mgbe gị na Ndị Kraịst ibe gị na-ekwurịta okwu n’ọmụmụ ihe. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na  asatọ aha ya bụ Jasmine kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ, i nwere ike ịhụ ndị ọ dị otú ọ dị gị. Ọ ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu.”

Mgbe i chebachaara ihe ndị ahụ niile e kwuru echiche, i nwere ike iche na ọ kacha mma ka gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ekwurịta okwu n’Ịntanet. Tammy kwuru na ya emetụla ụdị ihe ahụ. O kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ ibe m niile na ndị enyi ha na-ekwurịta ọtụtụ ihe n’Ịntanet, achọghị m ịdị iche.” * Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Natalie mepere ebe ya na ndị enyi ya ga na-ekwurịta okwu n’Ịntanet. O kwuru, sị: “Nkà na ụzụ na-agbalị. E nweela ụzọ ọhụrụ ndị a na-esi ekwurịta okwu. Nke a bụ otu n’ime ha, ọ na-atọ m ụtọ.”

Chebara Nsogbu Ndị Dị na Ya Echiche

O doro anya na ọ na-akara ụfọdụ ndị mma imeta enyi n’Ịntanet ma na-agbalị ka ha ghara itisa. Natalie kwuru, sị: “Ikwu okwu n’Ịntanet na-eme ka mmadụ nwee ụdị obi ike ọ na-agaghị enweli ma ya na onye ọzọ na-ekwu okwu ihu na ihu. Tammy kwetara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, ị ga-ebu ụzọ hazie ihe ị chọrọ ikwu tupu gị na mmadụ ekwuwe okwu n’Ịntanet.”

Ma ọtụtụ nsogbu dị n’ikwurịta okwu n’Ịntanet, ọ ga-abụkwa iberiibe ma i leghara ha anya. Dị ka ihe atụ: Ị̀ ga-emechi anya na-aga n’okporo ámá e nwere ihe ndị na-emerụ ahụ́? Ọ bụrụ na ị gaghị eme otú ahụ, gịnịzi mere ị ga-eji na-awagharị n’Ịntanet n’achọghị ịma nsogbu ndị dị na ya?

Chegodị echiche nsogbu dị n’ịchọ imeta ndị enyi n’Ịntanet. E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Elaine. Ọ na-atọbu ya ụtọ ya na ndị ọ na-amaghị ikwurịta okwu n’Ịntanet. O kwuru, sị:  “Ọ dị nnọọ mfe imeta ndị aghụghọ enyi n’Ịntanet. Mgbe ụfọdụ, gị na mmadụ nwere ike ikwu okwu naanị nkeji ole na ole, ya ekwuwe okwu rụrụ arụ ma ọ bụ jụwa gị, sị: ‘Ị̀ marala nwoke ma ọ bụ nwaanyị? Ì jitụla ọnụ nwee mmekọahụ?’ Ụfọdụ na-amalitedị ịkọwara gị ihe banyere mmekọahụ iji kpalie mmasị gị.”

Ọ́ bụrụkwanụ na onye ahụ gị na ya na-ekwurịta okwu bụ enyi gị ị tụkwasịrị obi? Ya bụrụgodị enyi gị, i kwesịrị ịkpachara anya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joan kwuru, sị: “Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere ike ikwugide okwu ruo ọtụtụ awa, ọ bụrụgodị na o nweghị ihe jikọrọ unu. Ka ị na-etinyekwu oge n’izigara onye ahụ ozi, otú ahụ ka unu na-aghọkwu enyi. O nwere ike ime ka okwu unu bawa ime.”

“Ndị Na-ezochi Ihe Ha Bụ”

Eze Devid maara nke ọma na mmadụ izere ndị enyi ọjọọ bara ezigbo uru. O dere, sị: “Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.”—Abụ Ọma 26:4.

N’Ịntanet, ị̀ hụtụla ụdị ndị ahụ Devid kwuru banyere ha? Olee mgbe ndị mmadụ “na-ezochi ihe ha bụ” n’Ịntanet? ․․․․․

N’aka nke ọzọ, ọ̀ ga-abụ na na-ezochi ihe ị bụ mgbe gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu n’Ịntanet? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Abigail, bụ́ onye ya na ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet, kwuru, sị: “Mgbe mụ na  ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, ana m eme ka m̀ bụ ụdị onye a na-ekwu banyere ya.”

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Leanne nwere ụzọ ọzọ o si aghọgbu ndị mmadụ. O kwuru, sị: “Mụ na otu nwata nwoke nọ n’ọgbakọ dị nso na-ekwurịta okwu n’Ịntanet mgbe niile. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ikwu ihe dị ka ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Papa m ma ọ bụ mama m gafewa, ana m ewepụ ebe anyị dere ozi, n’ihi ya, o nweghị otú ha si mara ihe na-aga. Echeghị m na ha nwere ike iche n’ụwa a na nwa ha nwaanyị dị afọ iri na atọ na-edere nwata nwoke dị afọ iri na anọ ozi ịhụnanya. O nweghị mgbe ha chetụrụ ya n’echiche.”

Otú Ị Ga-esi Ezere Nsogbu

N’eziokwu, e nwere mgbe ikwurịta okwu n’Ịntanet na-adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-esi n’Ịntanet ezigara ndị enyi ha ozi mgbe niile. Ndị toro eto na-emekwa otú ahụ. Ọ bụrụ na ị na-esi n’Ịntanet ezigara ndị enyi gị ozi, ò nwere ihe ndị i kwesịrị ịkpachapụ anya na ha? Tụlee ihe ndị a.

Mara awa ole ị na-anọ n’Ịntanet, ekwekwala ka o rie oge ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa, ma oge i ji arahụ ụra. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe m kwuru na ha na-anọgide n’Ịntanet ruo n’elekere atọ nke ụtụtụ.”—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Ka ndị gị na ha na-ezirịta ozi bụrụ naanị ndị ị maara nke ọma ma ọ bụ ndị i nwere ike ịmatali ndị ha bụ. Ndị ọjọọ na-agakarị  n’Ịntanet achọ ụmụaka na-amachaghị ihe ha ga-aghọgbu.—Ndị Rom 16:18.

Mgbe gị na ndị mmadụ na-emekọ ihe ego, kpachara anya. Kpachara ezigbo anya mgbe ị na-agwa ndị mmadụ banyere onwe gị. Ma ọ́ bụghị ya, e nwere ike igwu gị wayo, ma ọ bụ mee gị nke ka njọ.—Matiu 10:16.

Mgbe ị na-ezigara ndị enyi gị foto gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Otú m dị na foto a ọ̀ bụ otú onye na-efe Chineke kwesịrị ịdị?’—Taịtọs 2:7, 8.

Dị ka i kwesịrị ime mgbe gị na mmadụ na-ekwu okwu ihu na ihu, ọ bụrụ na mkparịta ụka unu n’Ịntanet agawa ‘n’ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị,’ kwụsị ya.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

 Na-akwụwa aka gị ọtọ mgbe ọ bụla ị nọ n’Ịntanet. Ọ bụrụ na ‘ị chọrọ izochiri ndị mụrụ gị ihe ị bụ,’ nsogbu dị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kari kwuru, sị: “Anaghị m ezoro mama m ihe ọ bụla. Ana m egosi ya ihe m na-eme n’Ịntanet.”—Ndị Hibru 13:18.

“Mgbalị I Mere Bara Uru!”

Ị chọrọ inwe ndị enyi. Ọ bụghị ihe ọjọọ. E kere ụmụ mmadụ ka ha na ibe ha na-akpakọrịta. (Jenesis 2:18) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ gụrụ gị agụụ imeta ndị enyi, ọ bụ n’ihi otú e si kee gị! Naanị ihe ị ga-eme bụ ịkpachara anya n’ụdị ndị ị na-emeta enyi.

Ka obi sie gị ike na i nwere ike imeta ezigbo ndị enyi ma ọ bụrụ na i soro ihe Okwu Chineke kwuru. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise kwuru, sị: “Ọ dịghị mfe inweta ndị enyi hụrụ Jehova n’anya, hụkwa gị n’anya. Ma mgbe i nwetara ụdị ndị enyi ahụ, ị ga-ahụ na mgbalị i mere bara uru!”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ị̀ ma na okwu nwere ike igbu mmụọ mmadụ? Asịrị nwere ike ịfụ ụfụ ka ebe e ji mma agha maa mmadụ. Olee otú ị ga-esi akwụsị ya?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 17 A ga-atụlekwu banyere imeta ndị enyi n’ụlọ akwụkwọ n’Isi nke 17.

AMAOKWU BAỊBỤL

Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.Abụ Ọma 26:4.

NDỤMỌDỤ

Igbu oge n’Ịntanet anaghị ara ahụ́! N’ihi ya, kwuo mgbe ị ga-anọru. Agafela oge ahụ i kwuru. I nwere ike idewe ihe ga-echetara gị mgbe oge ahụ zuru.

Ị̀ MA NA . . . ?

Naanị ihe ole na ole i dere n’Ịntanet, ma eleghị anya, aha nna gị, aha ụlọ akwụkwọ unu, na nọmba ekwe ntị gị, nwere ike ime ka onye bu ihe ọjọọ n’obi nweta gị.

IHE M GA-EME!

Naanị awa ole m ga na-anọ n’Ịntanet n’izu bụ, ihe ga-enyere m aka ime ya bụ

Ọ bụrụ na mụ na onye m na-amaghị ekwurịtawa okwu n’Ịntanet, ihe m ga-eme bụ

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee uru na ọghọm dị n’ikwurịta okwu n’Ịntanet ma e jiri ya tụnyere ikwurịta okwu ihu na ihu?

● Gịnị mere o ji adị mfe mmadụ ime ka ọ̀ bụ onye ọzọ mgbe ọ na-ekwu okwu n’Ịntanet?

● Olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịnọ ogologo oge n’Ịntanet?

● Olee ihe ndị bara uru i nwere ike iji Ịntanet na-eme?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 103]

“Mụ na ndị m na-amaghị ma ọ bụ ndị mụ na ha na-enweghị ike ịkpa ihu na ihu anaghị ekwurịta okwu n’Ịntanet.”—Joan

[Foto dị na peeji nke 100 na 101]

Ị̀ ga-emechi anya na-aga n’okporo ámá e nwere ihe ndị na-emerụ ahụ́? Ọ bụrụ na ị gaghị eme otú ahụ, gịnịzi mere ị ga-eji na-awagharị n’Ịntanet n’achọghị ịma nsogbu ndị dị na ya?