Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?

Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?

 ISI NKE 5

Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?

“Ọ na-agụsi m agụụ ike ịma otú mmekọahụ na-adị.”—Kelly.

“Ọ na-eme m ihere na amabeghị m nwaanyị.”—Jordon.

“Ị̀ KA nọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ajụjụ a nwere ike ime ka ụjọ tụwa gị! A sị ka e kwuwe, n’ọtụtụ ebe, e nwere ike na-ele onye ntorobịa na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị anya dị ka onye ime ọhịa. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji enwe mmekọahụ tupu ha eruo afọ iri abụọ!

 Enweghị Njide Onwe Onye na Nsogbu Ndị Ọgbọ

Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, ị ma na Baịbụl gwara gị ka i “zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike ịna-esiri gị ike ijide onwe gị mgbe agụụ mmekọahụ na-agụ gị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Paul kwuru, sị: “Mmekọahụ na-abata m n’obi mgbe ụfọdụ n’enweghị ihe kpatara ya.” Ka obi sie gị ike na ọ dịchaghị njọ ma mmekọahụ bata gị n’obi mgbe ụfọdụ.

Otú ọ dị, ịma gị njakịrị ma ọ bụ ịkparị gị mgbe niile n’ihi na ị maghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-emenye ihere! Dị ka ihe atụ, ọ́ bụrụkwanụ na ndị ọgbọ gị agwa gị na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụrụ na i nwebeghị mmekọahụ? Otu onye na-eto eto aha ya bụ Ellen kwuru, sị: “Ndị ọgbọ gị na-eme ka inwe mmekọahụ yie ihe ga-eme ka i nwee  obi ụtọ nakwa ihe na-adịghị njọ. Ọ bụrụ na ị naghị enwe mmekọahụ aghara aghara, ha ga na-ele gị anya dị ka onye iberiibe.”

Ma eleghị anya, ọ dị ihe ndị ọgbọ gị na-agaghị ekwu banyere mgbe mbụ ha nwere mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria, bụ́ onye ya na enyi ya nwoke kwara iko, kwuru, sị: “Ihere mewere m mgbe anyị kwachara iko ahụ. Onwe m sọwara m oyi, mụ akpọọkwa enyi m nwoke ahụ asị.” Ụdị ihe ahụ na-eme eme karịa otú ọtụtụ ndị na-eto eto chere. N’eziokwu, mgbe mbụ ndị na-eto eto nwere mmekọahụ, ọ na-agbawakarị ha obi, na-akpatakwa nsogbu!

Otú ọ dị, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Shanda jụrụ, sị: “Gịnị mere Chineke ji mee ka ọ na-agụ ndị na-eto eto agụụ inwe mmekọahụ, ebe ọ ma na ha ekwesịghị inwe ya ruo mgbe ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye?” Nke ahụ bụ ezigbo ajụjụ. Ma, chegodị echiche:

Ọ̀ bụ naanị mmekọahụ na-agụ gị agụụ? Mbanụ. Jehova Chineke kere gị ka ihe dị iche iche na-agụ gị agụụ.

Ọ̀ bụ ihe ọ bụla gụwara gị agụụ ka ị na-eme ozugbo ahụ? Ee e, n’ihi na Chineke kere gị, mee ka i nwee ike ijide onwe gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.

N’ihi ya, gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ? Ihe i kwesịrị ịmụta bụ na o nwere ike ị gaghị emeli ka ihe ụfọdụ ghara ịgụ gị agụụ, ma i nwere ike ijide onwe gị mgbe ha gụwara gị agụụ. N’eziokwu, ịga kwaa iko mgbe ọ bụla agụụ mmekọahụ na-agụ gị dị njọ ma bụrụ nzuzu otú  ahụ ịkụ mmadụ ihe mgbe ọ bụla a kpasuru gị iwe si dị njọ ma bụrụ nzuzu.

N’eziokwu, Chineke achọghị ka anyị jiri akụkụ ahụ́ anyị ji amụta nwa na-enwe mmekọahụ na-ezighị ezi. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:4) Otú ahụ e si nwee “oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị,” e nwekwara oge mmadụ ga-enwe mmekọahụ mgbe ọ gụrụ ya agụụ na oge ọ na-agaghị enwe ya. (Ekliziastis 3:1-8) Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ejide onwe gị mgbe ihe na-agụ gị!

Ma, gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ jiri njakịrị jụọ gị, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ihere emekwala gị. Ọ bụrụ na naanị ihe onye ahụ chọrọ ime bụ imenye gị ihere, i nwere ike ịgwa ya, sị: “Ee, amabeghị m nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ị̀ ma na ọ na-eme m obi ụtọ?” Ma ọ bụ gị agwa ya, sị: “O nweghị onye ọ gbasara.” * (Ilu 26:4; Ndị Kọlọsi 4:6) N’aka nke ọzọ, i nwere ike iche na i kwesịrị ịgwa onye ahụ jụrụ gị ajụjụ ahụ banyere ya. Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịkọwara ya ihe ị mụtara na Baịbụl mere na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị.

Ì nwere ike icheta ihe ndị ọzọ ị ga-agwa onye kwara gị emo, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ọ bụrụ na i chetara, dee ha ebe a.

․․․․․

Onyinye Dị Oké Ọnụ Ahịa

Olee otú obi na-adị Chineke ma ndị mmadụ nwee mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye? Ka e were ya na ị zụtaara enyi gị onyinye. Ma tupu gị enye ya onyinye ahụ, ya emepee ya n’ihi na  ọ chọrọ ịmata ihe ọ bụ! Ọ́ gaghị ewe gị iwe? Chee echiche otú obi ga-adị Chineke ma i nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ chọrọ ka i chere ruo mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye tupu gị enwewe mmekọahụ, nke bụ́ onyinye o nyere mmadụ.—Jenesis 1:28.

Olee ihe i kwesịrị ime agụụ mmekọahụ na-agụ gị? E kwuo ya ná nkenke, mụta otú ị ga-esi na-ejide onwe gị. Ị ga-emeli ya! Kpekuo Jehova ekpere ka o nyere gị aka. Mmụọ ya nwere ike ime ka ị na-ejide onwe gị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Cheta na Jehova “agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.” (Abụ Ọma 84:11) Otu onye na-eto eto aha ya bụ Gordon  kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mụ echewe na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye adịchaghị njọ, ana m echeta na ọ ga-emebi adịm ná mma mụ na Jehova, chetakwa na ọ dịghị mmehie ọ bụla ga-abara m uru karịa mmekọrịta mụ na Jehova.”

N’eziokwu, amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị abụghị ọrịa. Mmekọahụ rụrụ arụ na-eweda mmadụ ala, na-emenye mmadụ ihere ma na-akpata nsogbu. N’ihi ya, ekwela ka ụgha ụwa na-agha mee ka i chewe na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụrụ na ị nọsie ike n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na ị nọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ị ga-enwe ahụ́ ike, akọnuche dị ọcha, nke ka nke, ọ ga-emekwa ka mmekọrịta gị na Chineke sie ike.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 24

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ dị mma ịmara na Jizọs gbara nkịtị mgbe Herọd na-ajụ ya ajụjụ. (Luk 23:8, 9) N’ihi ya, mgbe a jụrụ gị ajụjụ iberiibe, ọ dị mma ịgba nkịtị.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’ime obi ya na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma.’—1 Ndị Kọrịnt 7:37.

NDỤMỌDỤ

Gị na ndị na-anaghị akpa ezi àgwà akpala, a sịgodị na ha sịrị na ha bụ Ndịàmà ibe gị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ịlụ di ma ọ bụ nwunye anaghị eme ka ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara kwụsị ya. Ma ndị nọsiri ike n’ụkpụrụ Chineke nyere banyere omume ọma tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye ga-ekwesịkwu ntụkwasị obi n’ebe di ha ma ọ bụ nwunye ha nọ.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na m ga-anọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ruo mgbe m lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ihe m kwesịrị ime bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ndị enyi m na-eme ka o siere m ike ịnọgide ná mkpebi m mere, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị ka i chere mere ụfọdụ ji achị ndị na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọchị?

Gịnị mere o ji esi ike ịnọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?

Olee uru ị ga-erite ma ị nọrọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ruo mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye?

Olee otú ị ga-esi akọwara nwanne gị ị tọrọ uru ịnọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị bara?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 51]

“Mgbe ọ bụla a nwara m ọnwụnwa inwe mmekọahụ, ihe na-enyere m aka imeri ya bụ icheta mgbe niile na ‘ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze Chineke.’’’ (Ndị Efesọs 5:5)”—Lydia

Igbe dị na peeji nke 49]

Ebe M Dere Ihe

Gịnị n’Ezie Na-eme Ma E Mechaa?

Ndị ọgbọ gị na ndị na-eme ntụrụndụ na-ewu ewu na-ejikarị akọ ezochi nsogbu mmadụ na-enweta ma o nwee mmekọahụ mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Chebara ọnọdụ atọ a echiche. Olee ihe i chere n’ezie ga-eme ndị na-eto eto ndị a?

● Ka e were ya na nwa akwụkwọ ibe gị turu ọnụ na ya na ọtụtụ ụmụ agbọghọ enweela mmekọahụ. Ọ sịrị na ọ na-atọ ụtọ, na o nweghị ihe ọ na-eme mmadụ. Gịnị n’ezie mere ya na ụmụ agbọghọ ndị ahụ mgbe ha mechara? ․․․․․

● Ná ngwụcha otu fim, e gosiri ebe ndị na-eto eto na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe mmekọahụ iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ emee eme, gịnị n’ezie ga-emecha mee ha? ․․․․․

● Ka e were ya na otu nwa okorobịa mara mma gwara gị ka gị na ya nwee mmekọahụ. Ọ sịrị na ọ dịghị onye ga-ama. Ọ bụrụ na gị na ya enwee mmekọahụ, gị agbalịa izochi ya, gịnị n’ezie ga-eme mgbe unu mechara? ․․․․․

[Foto dị na peeji nke 54]

Inwe mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye yiri imepe onyinye mgbe a na-enyebeghị gị ya