Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

 ISI NKE 24

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

Ọ̀ dị mgbe papa gị na mama gị na-ese okwu n’ihu gị? Ọ bụrụ na ọ dị, olee nke kacha esere ha okwu n’ime ihe ndị a?

□ Ego

□ Ọrụ a na-arụ n’ụlọ

□ Ndị ikwu

□ Gịnwa

Olee ihe ị chọrọ ịgwa papa gị na mama gị banyere otú esemokwu ha si na-ewute gị? Dee ihe ị chọrọ ịgwa ha n’okpuru ebe a.

․․․․․

 MEE elu mee ala, okwu papa gị na mama gị na-ese ga-agbasa gị. A sị ka e kwuwe, ị hụrụ ha n’anya, ọ bụkwa ha ka ị ma ga-enyere gị aka. N’ihi ya, o nwere ike na-ewute gị mgbe ha na-ese okwu. I nwere ike ikweta ihe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marie kwuru. O kwuru, sị: “O siiri m ike ịkwanyere papa m na mama m ùgwù mgbe o yiri ka ha anaghị akwanyere onwe ha ùgwù.”

Ịhụ ka papa gị na mama gị na-ese okwu ga-eme ka ị ghọta otu ihe dị mwute, ya bụ na ha na-emejọ ihe karịa otú i chere. Ịghọta ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka ezigbo ụjọ na-atụ gị. Ọ bụrụ na ha na-ese ezigbo okwu mgbe niile, i nwere ike na-echegbu onwe gị na ha ga-etisa. Marie kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ ka papa m na mama m na-ese okwu, ọ na-adị m ka hà ga-agba alụkwaghịm, nakwa na m ga-ahọrọ onye nke mụ na ya ga-ebi. Ụjọ na-atụkwa m na ọ ga-eme ka mụ na ụmụnne m biri iche iche.”

Gịnị mere papa na mama ji ese okwu, oleekwa ihe i kwesịrị ime ma esemokwu malite n’ezinụlọ?

Ihe Mere Papa na Mama Ji Ese Okwu

N’eziokwu, papa gị na mama gị nwere ike ‘jiri ịhụnanya na-ediri ibe ha ihe.’ (Ndị Efesọs 4:2) Ma Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Papa gị na mama gị ezughị okè. N’ihi ya, o kwesịghị iju gị anya ma ha buru iwe n’obi ruo mgbe o mere ka ha see okwu mgbe ụfọdụ.

Chetakwa na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Timoti 3:1) Nsogbu inweta ihe e ji ebi ndụ, mmefu ego, na nsogbu a na-enwe n’ebe ọrụ na-akpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ. Ọ bụrụ na papa na mama na-arụcha ọrụ ego, ikpebi onye ga-arụ ọrụ ụfọdụ e nwere n’ụlọ nwere ike na-esere ha okwu.

Ka obi sie gị ike na ọ bụrụgodị na papa gị na mama gị  na-ese okwu, ọ pụtaghị na ha etisawala. O nwere ike ịbụ na ha ka hụrụ ibe ha n’anya n’agbanyeghị na echiche ha anaghị abụ otu mgbe ụfọdụ.

Dị ka ihe atụ: Ọ̀ dịtụla mgbe gị na ezigbo ndị enyi gị lechara fim, gị achọpụta na ihe i chere banyere fim ahụ dị iche n’ihe ha chere? Ọ na-eme eme. Otú ndị bụ́ ezigbo enyi si ele ihe anya na-adị iche iche mgbe ụfọdụ. Otú ahụ ka o nwere ike ịdị papa gị na mama gị. Ma eleghị anya, ha abụọ na-echegbu onwe ha banyere ego ole ezinụlọ nwere, ma otú ha chọrọ ka e si mefuo ya adịrị iche iche; ha nwere ike ịchọ ka ezinụlọ unu gaa ezumike ebe ọzọ, ma ụdị ntụrụndụ ha abụọ chọrọ ka e nwee abụghị otu; ma ọ bụ na ha chọrọ ka i mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ma otú ha chọrọ isi gbaa gị ume adịrị iche iche.

Isi ihe a na-ekwu bụ na mmadụ na mmadụ ịdị n’otu apụtaghị na echiche ha abụọ ga-abụrịrị otu. Mmadụ abụọ ndị hụrụ ibe ha n’anya nwere ike ile ihe anya iche iche mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike isiri gị ike ịnọ n’ebe papa gị na mama gị na-ese okwu. Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụ kwuo ga-enyere gị aka idi ya?

Ihe Ị Ga-eme

Na-akwanyere ha ùgwù. Ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-ese okwu mgbe niile, o nwere ike ịkpasu gị iwe. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ha kwesịrị ịkpa àgwà ọma ị ga-eṅomi, ọ bụghị gị kwesịrị ịkpa àgwà ọma ha ga-eṅomi. Ma, naanị ihe ileda papa gị ma ọ bụ mama gị anya ga-eme bụ ka esemokwu ezinụlọ unu ka njọ. Nke ka nke bụ na Jehova Chineke nyere  gị iwu ka ị na-akwanyere papa gị na mama gị ùgwù, na-erubekwara ha isi, ọbụna mgbe o siiri gị ike ime otú ahụ.—Ọpụpụ 20:12; Ilu 30:17.

Ma ọ́ bụrụkwanụ na papa gị na mama gị na-ese okwu n’ihi gị? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mama gị bụ Onyeàmà Jehova, ma papa gị abụghị. Papa gị na mama gị nwere ike isewe okwu n’ihi na i kpebiri iso mama gị bụrụ Onyeàmà Jehova. (Matiu 10:34-37) Ma ‘jiri obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu’ nọgide n’ihe ahụ i kpebiri ime. Àgwà ọma gị nwere ike inyere papa gị aka ịbụ Onyeàmà Jehova otu ụbọchị.—1 Pita 3:15.

Adụnyerela otu onye úkwù. Olee ihe ị ga-eme ma papa gị ma ọ bụ mama gị nyewe gị nsogbu ka ị dụnyere ya úkwù n’ihe na-agbasachaghị gị? Gbalịa ka ị ghara ịdụnyere otu onye úkwù. I nwere ike iji nkwanye ùgwù gbụrụ onwe gị ma kwuo, sị: “Papa, Mama, ahụrụ m unu abụọ n’anya. Ma, biko, unu agwala m ka m dụnyere otu onye úkwù. Ihe a bụ okwu unu abụọ ga-ekpezi.”

Gwa ha otú obi dị gị. Gwa papa gị na mama gị otú okwu ahụ ha na-ese si ewute gị. Chọpụta mgbe i chere na ha ga-ege gị ntị ma jiri nkwanye ùgwù gwa ha na esemokwu ha na-ewute gị, na-ewe gị iwe ma ọ bụ na-atụdị gị ụjọ.—Ilu 15:23; Ndị Kọlọsi 4:6.

 Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime

Enyela ha ndụmọdụ otú e si alụ di na nwunye. Ebe ị ka bụ nwata, i torubeghị ikpeziri papa gị na mama gị okwu ha. Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na e bu gị n’ụgbọelu, gị ahụ ka mmadụ abụọ na-akwọ ụgbọelu ahụ na-arụ ụka. O doro anya na obi agaghị adị gị mma. Ma gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na i jiri mpako gwawa ha otú e si akwọ ụgbọelu ma ọ bụ gbalịwa ịkwọ ụgbọelu ahụ n’onwe gị?

N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-agbalị ka ị gwa papa gị na mama gị otú e si edozi esemokwu di na nwunye, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Baịbụl kwuru, sị: “Site n’ịdị mpako, naanị ihe mmadụ na-akpata bụ ọgụ, ma ndị na-agba izu na-enwe  amamihe.” (Ilu 13:10) Papa gị na mama gị nwere ike idozi okwu ha ma ọ bụrụ na naanị ha ekwurịta ya.—Ilu 25:9.

Etinyela aka. Esemokwu mmadụ abụọ na-enye nsogbu n’obi. Ha zuo atọ, ya aka njọ. N’agbanyeghị na o nwere ike ịdị gị ka i tinye ọnụ n’okwu papa gị na mama gị na-ese, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ha ka ọ dịịrị idozi okwu ha, ọ bụghị gị. N’ihi ya, a bịa n’ihe na-agbasaghị gị, gbalịa ka i mee ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ‘ilekwasị anya n’ihe ị na-eme.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:11) Etinyela aka n’esemokwu ahụ.

Asọkọtala papa gị na mama gị isi. Ụfọdụ ndị na-eto eto na-asọkọta papa ha na mama ha isi, mee ka ha sewe okwu. Ha rịọ mama ha ihe, ya jụ, ha agakwuru papa ha, nyegide ya nsogbu ruo mgbe o meere ha ihe ahụ. I nwere ike iji aghụghọ nweta ihe ụfọdụ ị chọrọ, ma ka oge na-aga, ọ ga-eme ka a ghara idozi esemokwu ezinụlọ unu ngwa ngwa.

Amụtala àgwà ha. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Peter ghọtara na ya naara akpa àgwà ọjọọ ka o megwara papa ya ihe ọjọọ ọ na-eme ha. O kwuru, sị: “Achọrọ m ịkpasu  ya iwe. Ewesara m ya ezigbo iwe n’ihi ihe ọ na-eme mụ na mama m na nwanne m nwaanyị.” Ma, n’oge na-adịghị anya, Peter banyere ná nsogbu n’ihi àgwà ya. Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? I kwesịrị ịmụta na ịkpa àgwà ọjọọ ga-eme ka nsogbu ndị ị na-enwe n’ezinụlọ unu ka njọ.—Ndị Galeshia 6:7.

N’ihe ndị a e kwuru n’isiokwu a, dee nke i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya karịchaa. ․․․․․

O doro anya na i nweghị ike ime ka papa gị na mama gị ghara ise okwu. Ma ka obi sie gị ike na Jehova nwere ike inyere gị aka ka i die obi erughị ala esemokwu ha mere ka ị na-enwe.—Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Pita 5:7.

Gbalịsie ike ime ihe ndị ahụ e kwuru. Ka oge na-aga, o nwere ike ime ka papa gị na mama gị chee ezigbo echiche otú ha ga-esi dozie esemokwu ha. O nwedịrị ike ime ka ha kwụsị ise okwu.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee ihe i nwere ike ime ka ihe dịrị gị mma ma ọ bụrụ na i si n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 201]

“Ihe nyeere m aka idi okwu papa m na mama m na-ese bụ mgbe m ghọtara na ha ezughị okè, nakwa na ọnwụnwa na-abịara ha otú ọ na-abịara m.”—Kathy

AMAOKWU BAỊBỤL

Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile.Ndị Kọlọsi 4:6.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ndị hụrụ ibe ha n’anya nwere ike ile ihe anya iche iche mgbe ụfọdụ.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-ese ezigbo okwu mgbe niile, jiri nkwanye ùgwù gwa ha ka ha chọọ enyemaka.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme ma papa m na mama m sewe okwu bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na papa m ma ọ bụ mama m agwa m ka m dụnyere ya úkwù, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere ụfọdụ ndị papa na ndị mama ji ese okwu?

Gịnị mere ọ dịghị onye kwesịrị ịta gị ụta n’ihi nsogbu papa gị na mama gị na-enwe?

Olee ihe i nwere ike ịmụta ma ị na-ele àgwà papa gị na mama gị?

 [Igbe na Foto ndị dị na peeji nke 206 na 207]

Ọ́ Bụrụkwanụ na Papa M na Mama M Ebikwaghị?

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị ebikwaghị, olee otú ị ga-esi gosi na ị ma ihe n’agbanyeghị na o nwere ike na-ewute gị? Tụlee aro ndị a:

Atụla anya ihe na-agaghị ekwe omume. Ihe mbụ i nwere ike ịchọ ime bụ ịgbalị ka papa gị na mama gị kpezie. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anne kwuru, sị: “N’agbanyeghị na papa m na mama m ebikwaghị, ha ka na-akpọ anyị apụ apụ mgbe ụfọdụ. Mụ na nwanne m nwaanyị na-eji nwayọọ agwa ibe anyị, sị, ‘Ka anyị gaa ebe ọzọ ka ha abụọ nọrọ.’ Ma ọ dị ka ihe ahụ enweghị isi. Ọ dịghị mgbe ha kpeziri.”

Ilu 13:12 kwuru, sị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.” Ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara inye onwe gị nsogbu na-enweghị isi na ọdụ bụ icheta na ọ bụghị gị ga-ekpebiri papa gị na mama gị ihe ha ga-eme. Ọ bụghị gị mere ha ji tisaa, o nwekwara ike ịbụ na ị gaghị emeli ka ha kpezie.—Ilu 26:17.

Akpọla ha asị. Iburu papa gị ma ọ bụ mama gị iwe n’obi ma ọ bụ ịkpọ ya asị, ma ọ bụkwanụ iburu ha abụọ iwe n’obi, nwere ike ịkpatara gị nsogbu ruo ogologo oge. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Tom chetara iwe na-ewe ya mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. O kwuru, sị: “Amalitere m iwere papa m ezigbo iwe. Achọghị m ikwu na m kpọrọ ya asị, ma obi adịtụdịghị mụ mma n’ebe ọ nọ. Aghọtaghị m ihe mere o ji sị na ya hụrụ anyị n’anya ma ya ahapụ anyị.”

Ma, ọ bụrụ na di na nwunye ebikwaghị, ọ naghị abụcha naanị otu n’ime ha kpatara ya. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na papa gị na mama gị agwabeghị gị ihe niile banyere alụmdi na nwunye ha ma ọ bụ ihe mere ha ji tisaa; o nwedịrị ike ịbụ na ha aghọtaghị ya. N’ihi ya, amala onye ọ bụla ikpe mgbe ị na-amaghị ihe niile merenụ. (Ilu 18:13) N’eziokwu, ịkwụsị iwe iwe adịghị mfe. Ọ dịghịkwa njọ iwe iwe mgbe a kpasuru gị iwe. Ma ibu iwe n’obi na ịchọ ka i megwara ihe mmadụ mere gị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mebie àgwà gị. Ọ bụ ya  mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.”—Abụ Ọma 37:8.

Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Kama ịkpọ papa ha ma ọ bụ mama ha hapụrụ ha asị, ihe ụfọdụ ndị na-eto eto na-eme bụ ịhụbiga ya n’anya ókè. Dị ka ihe atụ, papa otu nwa okorobịa bụ onye aṅụrụma ma na-achụ nwaanyị. Ọ hapụrụ ezinụlọ ya ọtụtụ ugboro, mechaa gbaa nwunye ya alụkwaghịm. N’agbanyeghị nke ahụ, nwa okorobịa ahụ kwuru na n’ihi ihe ụfọdụ, ọ fọrọ obere ka ya hụbiga papa ya n’anya ókè!

Ịhụbiga mmadụ n’anya ókè otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. N’otu mba, n’ime ụmụaka iri ndị papa ha na mama ha gbara alụkwaghịm, itoolu na mama ha na-ebi, ha na-agakwa eleta papa ha. N’ihi ya, ọ bụ mama ha na-elekọta ha kwa ụbọchị ma na-enye ha ndụmọdụ. N’agbanyeghị ego ole papa ha na-akwụ iji na-elekọta ha, ihe na-esikarịrị mama ha ike mgbe ha gbachara alụkwaghịm. N’aka nke ọzọ, ihe nwere ike ịdịrị papa ha mma. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ha gara leta papa ha, ọ na-enye ha onyinye, ha ekporiekwa ndụ! Ma n’ụlọ mama ha, ọ na-apị ego aka, na-asịkwa mee nke a, emela nke a. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị na-eto eto ahapụla papa ha ma ọ bụ mama ha bụ́ Onye Kraịst gaa ka ha na papa ha ma ọ bụ mama ha na-abụghị Onye Kraịst biri, n’ihi na o nwere ego, na-ekwekwa ka ha mee ihe masịrị ha.—Ilu 19:4.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ime otú ahụ, chebara ihe ndị ka mkpa echiche. Cheta na e kwesịrị inye gị ọzụzụ na ndụmọdụ. Ọzụzụ na ndụmọdụ karịrị ihe ọ bụla papa gị ma ọ bụ mama gị ga-enye gị. Ọ ga-eme ka àgwà gị na otú i si ebi ndụ ka mma.—Ilu 4:13.

[Foto dị na peeji nke 203]

Nwatakịrị nke na-agwa papa ya na mama ya otú ha ga-esi kpezie esemokwu ha yiri onye e bu n’ụgbọelu na-agwa ndị na-akwọ ụgbọelu otú e si akwọ ụgbọelu