Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Ghara Inwe Mmekọahụ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Ghara Inwe Mmekọahụ?

 ISI NKE 28

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Ghara Inwe Mmekọahụ?

“Mgbe m dị afọ iri na ụma, ọ na-agụ m agụụ ka mụ na nwoke ibe m nwee mmekọahụ. N’obi m, ama m na ụdị agụụ ahụ adịghị mma.”—Olef.

“Mụ na enyi m nwaanyị susuru ọnụ otu ugboro ma ọ bụ abụọ. Ebe ọ bụ na ihe ụmụ nwoke ka na-amasị m, anọ m na-eche ma m̀ ghọọla onye chọrọ ka ya na nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọahụ.”—Sarah.

O DORO ọtụtụ ndị anya na a na-ekwu okwu banyere nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị taa karịa otú e si na-ekwu ya ọtụtụ afọ gara aga. Nwagodị anwa kwuo na ọ dịghị mma! Ma eleghị anya, ndị mmadụ ga-abara gị ezigbo mba. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Amy kwuru, sị: “Otu nwa agbọghọ gwara m na m kpọrọ ndị agbụrụ ọzọ asị, n’ihi na m kpọrọ nwaanyị idina nwaanyị asị!”

Àgwà onye mere otú masịrị ya ndị mmadụ na-akpa taa emeela ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmekọahụ ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Becky kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị kwuru na ha na nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ, ndị ọzọ asị na ha na nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọahụ. Ndị ọzọ ekwuo na ha chọrọ ịma otú ha abụọ na-adị.” Nwa  agbọghọ ọzọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Christa kwuru na ọ na-emekwa n’ụlọ akwụkwọ ha. O kwuru, sị: “Ụmụ agbọghọ abụọ nọ na klas anyị agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Otu detaara m akwụkwọ, jụọ m ma m̀ chọrọ ịma otú nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ na-adị.”

Ebe ọ bụ na ndị ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ anaghị ezo onwe ha ezo, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Ụdị mmekọahụ ahụ ọ̀ dị njọ n’ezie? Ọ́ bụrụkwanụ na ụdị mmekọahụ ahụ na-agụ m agụụ? Ọ̀ pụtara na mụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m ga-enwerịrị mmekọahụ?’

Olee Otú Chineke Si Ele Omume ahụ Anya?

Taa, ọtụtụ ndị na-asị na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị abụghị ihe ọjọọ. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-ekwukwa otú ahụ. Ma, ihe Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kwuru banyere ya doro anya. Ọ gwara anyị na Jehova Chineke kere nwoke na nwaanyị, kwuokwa na ọ bụ naanị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:27, 28; 2:24) N’ihi ya, o doro anya na Baịbụl kwuru na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị bụ ihe ọjọọ.—Ndị Rom 1:26, 27.

Ụfọdụ na-ekwu na Okwu Chineke bụ akwụkwọ oge ya gaferela. Ma, gịnị ka i chere mere ọ naghị ara ha ahụ́ ikwu otú ahụ? Ọ̀ ga-abụ na Baịbụl anaghị agwa ha ihe ha chọrọ ịnụ? Ihe mere ọtụtụ ndị ji jụ Okwu Chineke bụ na ihe ọ na-akụzi dị iche n’ihe ha chọrọ ikwere. Ma, echiche ahụ adịghị mma, anyị kwesịkwara ịgbara ya ọsọ!

Ma ọ́ bụrụkwanụ na ọ na-agụ gị agụụ ka gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ? Ọ̀ pụtara na gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ga-enwerịrị mmekọahụ? Mbanụ. Cheta na ị nọ n’oge “ntoju ntorobịa,” ya bụ, oge ị ga-anọkata agụụ mmekọahụ agụwa gị. (1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ mgbe  ụfọdụ ka gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ, ka obi sie gị ike na ọ pụtaghị na gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ga-enwerịrị mmekọahụ. Agụụ ahụ na-emecha kwụsị ka oge na-aga. Ka ọ dịgodị, ekwela ka gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ. Gịnị ka ị ga-eme?

Kpee ekpere banyere ya. Dị ka Devid, rịọ Jehova, sị: “Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu, na-edukwa m n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Jehova ga-enye gị udo “karịrị echiche niile,” nke ga-eme ka i sikwuo ike. Udo ahụ ‘ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche,’ meekwa ka i nwee “ike karịrị ike nkịtị,” nke ga-eme ka ị ghara ime ihe ahụ na-adịghị mma na-agụ gị agụụ.—Ndị Filipaị 4:6, 7; 2 Ndị Kọrịnt 4:7.

Na-echebara ihe ziri ezi echiche. (Ndị Filipaị 4:8) Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Echela na ike ọ na-akpa agaghị agbanweli uche gị na obi gị ka i mee ihe dị mma. (Ndị Hibru 4:12) Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jason kwuru, sị: “Baịbụl akpaala ike dị egwu ná ndụ m. Dị ka ihe atụ, ihe e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10 na Ndị Efesọs 5:3 nyeere m ezigbo aka. Ana m agụ ya mgbe ọ bụla ime ihe ọjọọ gụwara m.”

Elela foto ndị gba ọtọ, jụkwa ihe ga-eme ka i nwee mmasị ka gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ.  (Ndị Kọlọsi 3:5) Zere ihe ọ bụla ga-eme ka agụụ mmekọahụ rụrụ arụ gụwa gị, dị ka ihe atụ, foto ndị gba ọtọ, fim na ihe ụfọdụ a na-egosi na TV, akwụkwọ ndị e sere ndị na-emega ahụ́ ma ọ bụ ndị na-achọ mma, bụ́ ndị ọ fọrọ ntakịrị ka ha gbara ọtọ. Kwụsị iche echiche ọjọọ. Na-eche ihe ziri ezi. Otu nwa okorobịa kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ọ na-agụ m agụụ ka mụ na nwoke ibe m nwee mmekọahụ, m na-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl kacha atọ m ụtọ.”

N’eziokwu, ụfọdụ na-ekwu na ọ baghị uru ime otú ahụ, na ihe i kwesịrị ime bụ inwe ụdị mmekọahụ ọ bụla gụrụ gị agụụ, na ‘iwere onwe gị otú e si kee gị.’ Ma Baịbụl kwuru na i nwere ike imeri agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị! Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị na ụfọdụ Ndị Kraịst oge ochie ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nweburu mmekọahụ gbanwere omume ha. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) I nwekwara ike imeri àgwà ahụ—ọ bụrụgodị na ị ka na-eche ya naanị n’echiche.

Ọ́ bụrụkwanụ na agụụ ahụ ekweghị akwụsị? Emekwala ya! Jehova kpọrọ omume ahụ asị. N’ihi ya, onye ọ na-agụ agụụ ka ya na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ nwere ihe ọ ga-emeli—o nwere ike ikpebi na ya agaghị eme ya.

Dị ka ihe atụ: Mmadụ nwere ike ịbụ onye “na-ewekarị oké iwe.” (Ilu 29:22) N’oge gara aga, o nwere ike iwe wee ya, ya emee ihe ọjọọ. Ma, mgbe ọ mụrụ Baịbụl, ya aghọta na ya kwesịrị ịna-ejide onwe ya. Ọ̀ pụtara na ọ dịtụghị mgbe iwe ga-ewe ya? Mbanụ. Otú ọ dị, ebe ọ ma ihe  Baịbụl kwuru banyere iwe ọkụ, ọ ga-agbalịsi ike ijide onwe ya mgbe a kpasuru ya iwe.

Otú ahụ ka ọ dị onye ọ na-agụ agụụ ka ya na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ, ma ọ mụtala ihe Baịbụl kwuru banyere omume ahụ. Ihe ọjọọ nwere ike na-agụ ya agụụ mgbe ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ elee omume ahụ anya otú Jehova si ele ya, ọ ga-enwe ike imeri ya.

Jisie Ike!

Ọ bụrụ na ọ ka na-agụ gị agụụ ka gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwa okorobịa, bụ́ onye kwuru, sị: “Agbalịrị m iwepụ ya n’obi m. Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka. Ana m agụ Baịbụl. Egeela m ọtụtụ okwu gbasara omume ahụ. Ma, amaghịzi m ihe ọzọ m ga-eme.”

Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, i nwere ihe gị na ya na-alụ. O nweghị ihe ga-akwụsị ya ozugbo. Ka o sina dị, onye ọ bụla chọrọ ime ihe dị Chineke mma ga-akparịrị àgwà ọma o kwuru ka anyị  na-akpa, ma gbaara àgwà ọjọọ ọsọ, n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe. Echefula na Chineke ghọtara ihe gị na ya na-alụ n’obi gị, na ọ na-enwekwara ndị na-efe ya ọmịiko. * (1 Jọn 3:19, 20) Ọ bụrụ na i rube isi n’iwu Chineke, ọ ga-agọzi gị. N’eziokwu, idebe iwu Chineke “na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.” (Abụ Ọma 19:11) Ọbụna ugbu a, ị ga-ebi ezigbo ndụ n’ụwa a nsogbu juru.

Ya mere, tụkwasị Chineke obi, ekwela ka ọchịchọ ọjọọ merie gị. (Ndị Galeshia 6:9) Gbalịsie ike ka ị “kpọọ ihe ọjọọ asị” ma ‘jidesie ezi ihe ike.’ (Ndị Rom 12:9) Ka oge na-aga, ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike, ị ga-ahụ na ihe ọjọọ ahụ na-agụ gị ga-akwụsị. Nke ka nke, ọ bụrụ na i zere mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị, ị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee otú ị ga-esi na-ejide onwe gị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 21 Onye Kraịst nwere mmekọahụ na-ezighị ezi kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere ya aka.—Jems 5:14, 15.

AMAOKWU BAỊBỤL

Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu.Abụ Ọma 139:23, 24.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe mmadụ ịbụ nwoke pụtara, mụọ ihe nlereanya Jizọs. (1 Pita 2:21) O gosiri anyị ezigbo ihe nlereanya n’otú nwoke si eji ike ya eme ihe, na otú e si adị nwayọọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụ ezie na i nweghị ike imecha ka ihe ghara ịgụ gị agụụ, i nwere ike ịjụ ime ihe na-agụ gị agụụ. I nwere ike ikpebi na ị gaghị eme ihe na-adịghị mma na-agụ gị agụụ.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ m ihe mere Baịbụl ji sị na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị adịghị mma, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na mmadụ agwa m na ihe Baịbụl kwuru banyere omume ahụ abaghị uru, ihe m ga-agwa ya bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere Chineke ji sị na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị adịghị mma?

Olee ihe bara uru ị ga-eme ka a ghara ịrata gị idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị?

Ịkpọ omume ahụ asị otú Chineke kpọrọ ya asị ọ̀ pụtara na anyị ga-akpọ ndị na-eme ya asị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 236]

“Echiche ọjọọ nke ụwa riri m isi ma mee ka ihe metụtara mmekọahụ gbagwojukwuo m anya. Ugbu a, ana m ezere ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ga-eme ka mụ na nwaanyị ibe m nwee mmekọahụ.”—Anna

[Foto dị na peeji nke 233]

Ndị na-eto eto niile ga-ekpebi ma hà ga-eso ụzọ ọjọọ ụwa a si ele mmekọahụ anya, ka hà ga-eme omume ọma Okwu Chineke kwuru ka a na-eme