Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?

Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?

 ISI NKE 3

Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?

 Wepụta oge zaa ajụjụ ndị a:

Olee àgwà ndị i chere ugbu a na onye ị ga-alụ kwesịrị inwe? N’ime ụdị mmadụ ndị e depụtara n’ebe a, kanye ✔ n’anọ ndị i chere kacha mkpa.

□ Onye mara mma □ Onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe

□ Onye ya na ndị ọzọ □ Onye a pụrụ ịtụkwasị obi

na-adị ná mma

□ Onye a ma ama □ Onye omume ya dị mma

□ Onye na-akpa ndị □ Onye na-agba mbọ

mmadụ ọchị

Mgbe ị na-erubeghị afọ ole ị dị ugbu a, ò nwetụla onye ị na-anwụrụ? N’ime ụdị mmadụ ndị ahụ e depụtara, kanye × na nke ọ bụla kacha masị gị banyere onye ahụ mgbe ahụ.

O NWEGHỊ ihe dị njọ na nke ọ bụla n’ime ụdị mmadụ ndị ahụ e depụtara. O nwere ihe dị mma na nke ọ bụla n’ime ha. Ma, ọ̀ bụ na i kweghị na ọ bụrụ na i nwere onye ị na-anwụrụ mgbe ị ka na-eto eto, ebe anya gị ga na-aga bụ n’àgwà ndị na-adịchaghị mkpa, dị ka ndị ahụ e depụtara n’aka ekpe n’igbe ahụ?

Ma, ka ị na-eto, ị ga-amalite iji ikike nghọta gị nyochawa àgwà ndị ka mkpa, dị ka ndị ahụ e dere n’aka nri n’igbe ahụ. Dị ka ihe atụ, ị ga-amalite ịghọta na nwa agbọghọ ahụ kacha mma n’obodo unu nwere ike bụrụ onye na-ekwesịghị ka a tụkwasị ya obi, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na nwa okorobịa ahụ a kacha mara amara na klas unu anaghị akpa àgwà ọma. Ọ bụrụ na ị gafeela oge ntoju ntorobịa, o yiri nnọọ ka ị̀ ga-ahụ àgwà ndị ọzọ ma e wezụga ndị ahụ na-adịchaghị mkpa mgbe ị na-aza ajụjụ ahụ bụ́, “Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?”

Matagodị Ụdị Onye Ị Bụ

Tupu gị achọpụta onye ihe nwere ike ịdabara gị na ya ma unu lụọ, i kwesịrị ịmata ụdị onye ị bụ nke ọma. Iji nyere gị aka ịmatakwu ụdị onye ị bụ, zaa ajụjụ ndị a:

 Olee ebe m na-eme nke ọma? ․․․․․

Olee ebe m na-anaghị eme nke ọma? ․․․․․

Olee ihe ndị ga-eme ka obi dị mụ mma, oleekwa otú m chọrọ ka mmekọrịta mụ na Chineke dịrị? ․․․․․

Ọ gaghị adịrị gị mfe ịmata ụdị onye ị bụ. Ma ajụjụ ndị dị ka ndị ahụ a jụrụ ga-enyere gị aka. Ka ị na-amatakwu ụdị onye ị bụ, ị ga-enwe ike ịchọta onye ga-eme ka i mezikwuo ebe ị na-eme nke ọma, ọ bụghị onye ga-eme ka ebe ị na-anaghị eme nke ọma ka njọ. * Ọ́ bụrụkwanụ na i chere na ị chọtala ụdị onye ahụ?

Ọ̀ Bụ Onye Ọ Bụla Ka Ihe Ga-adabara Mụ na Ya?

“Achọrọ m ka mụ na gị lụọ.” Okwu ahụ nwere ike ime ka ị kụja ma ọ bụ mee ka obi dị gị ezigbo ụtọ—dabere n’onye gwara gị ya. Ka e were ya na i kwetara. Ka oge na-aga, olee otú ị ga-esi mata ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na onye ahụ ị chọrọ ịlụ?

 Ka e were ya na ị chọrọ ịzụ akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ. Gị agaa ahịa hụ nke dị gị mma. Gị eyitụ ya, ma hụ na ọ baghị gị ụkwụ. Ọ ga-ewute gị nke ukwuu. Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-azụwa ya otú ahụ? Ka ị ga-achọrọ akpụkpọ ụkwụ ọzọ? O doro anya na ọ ga-aka mma ka ị hapụ akpụkpọ ụkwụ ahụ ma chọrọ ọzọ. Ọ gaghị adị mma ka i yiri akpụkpọ ụkwụ na-abaghị gị ụkwụ na-agagharị!

E nwere ike iji ya tụnyere ịchọta onye ị ga-alụ. Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ị hụrụ ga-amasị gị. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe ga-adabara gị na ya. A sị ka e kwuwe, ị chọrọ onye gị na ya ga-anọ, ahụ́ eruo gị ala, ya bụ, onye àgwà gị na ya na ihe mgbaru ọsọ gị na ya bụ otu. (Jenesis 2:18; Matiu 19:4-6) Ị̀ hụla ụdị onye ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi mara ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na ya?

Lekwasị Anya n’Ihe Ndị Ka Mkpa

Iji zaa ajụjụ ikpeazụ ahụ, leruo onye ahụ ị chọrọ ịlụ anya nke ọma. Ma, kpachara anya! I nwere ike ịhụ naanị ihe ị chọrọ ịhụ. N’ihi ya, ya adịla gị ngwa ngwa. Gbalịa ka ị chọpụta kpọmkwem ụdị onye ọ bụ. Ị ga-agbalịsi ike ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime otú ahụ. Ma o kwesịghị iju gị anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ụgbọala, ị́ gaghị eleru ya anya nke ọma? Mkpa gị ọ ga-abụ naanị otú ahụ́ ya dị? Ọ́ gaghị aka mma ma i leruo ya anya nke ọma—ma  eleghị anya, chọpụta ihe niile i nwere ike ịchọpụta banyere otú njin ụgbọala ahụ dị?

Ịchọta onye ị ga-alụ dị mkpa karịa ịchọta ụgbọala ị ga-azụ. Ma, ọtụtụ ndị ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpa anaghị elekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa. Kama nke ahụ, ha na-ekwukarị banyere ihe na-amasị ha abụọ, sị: ‘Ụdị egwú na-amasị m na-amasị ya.’ ‘Ihe ndị na-atọ m ụtọ na-atọ ya ụtọ.’ ‘Obi mụ na ya bụ otu n’ihe niile!’ Ma, dị ka e kwuru na mbụ, ọ bụrụ na ị gafeela ntoju ntorobịa n’eziokwu, ị ga-elekwasị anya n’àgwà ndị ka mkpa. Ị ga-ahụ na i kwesịrị ịchọpụta “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi” onye ahụ.—1 Pita 3:4; Ndị Efesọs 3:16.

Dị ka ihe atụ, kama ilekwasị anya n’ebe ihe na-adabara gị na ya, i nwere ike ịghọtakwu ụdị onye ọ bụ ma ọ bụrụ na ị hụ ihe o mere mgbe okwu na-adabaghịrị gị na ya. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, olee otú onye ahụ si eme omume mgbe obi unu na-abụghị otu? Ọ̀ na-esi ọnwụ ka e mee ihe ọ chọrọ, ma eleghị anya, na-ewe “iwe ọkụ,” ma ọ bụ na-ekwu “okwu mkparị”? (Ndị Galeshia 5:19, 20; Ndị Kọlọsi 3:8) Ka omume onye ahụ ọ̀ na-egosi na o nwere ezi uche, ya bụ, ikweta ihe i kwuru ka udo dịrị ma ọ bụrụ na ọ gaghị emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ?—Jems 3:17.

Ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche bụ: Onye ahụ ọ̀ na-eji aghụghọ enweta ihe ọ chọrọ, ọ̀ bụ okwuchaa obie, ka ọ̀ bụ onye ekworo? Ọ̀ na-achọ ịmata ihe niile ị na-eme? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Nicole sịrị: “Ana m anụ akụkọ banyere ndị na-ekwu okwu ọlụlụ ma ihe na-esekarịrị ha abụrụ na otu onye n’ime ha anaghị agwa onye nke  ọzọ ebe ọ nọ na ihe ọ na-eme. Echere m na ọ na-egosi na nsogbu dị.”—1 Ndị Kọrịnt 13:4.

N’ihe ndị ahụ e kwuru banyere ha, e lekwasịrị anya n’ụdị onye mmadụ bụ na omume mmadụ. Otú ọ dị, ọ dị oké mkpa ka ị mata àgwà e ji mara onye ahụ ị chọrọ ịlụ. Olee otú ndị ọzọ si ele ya anya? I nwere ike ịjụ ndị ma ya nke ọma ajụjụ, dị ka ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ. Ị ga-esi otú ahụ mata ma ‘à na-akọ akụkọ ọma banyere ya.’—Ọrụ 16:1, 2.

I nwere ike ịmata onye ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na i dee ihe ị chọpụtara banyere ya ede iji hụ ma ò nwere àgwà ndị ahụ a tụlere.

Ụdị onye ọ bụ ․․․․․

Omume ya ․․․․․

Àgwà e ji mara ya ․․․․․

Ọ ga-abara gị uru ma ị gụọ igbe bụ́  “Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Di?” na peeji nke 39 ma ọ bụ  “Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Nwunye?” na peeji nke 40. Ajụjụ ndị a jụrụ ebe ahụ ga-enyere gị aka ịmata ma onye ahụ ị chọrọ ịlụ ọ̀ ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye.

Ọ́ bụrụkwanụ na mgbe i lebachara okwu ahụ anya, gị achọpụta na ihe agaghị adabara gị na ya? Mgbe ahụ, ị ga-echebara otu ajụjụ dị mkpa echiche:

M̀ Kwesịrị Ịhapụ Onye Ahụ?

Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mma ma ị hapụ onye ahụ. Chee echiche banyere ihe mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jill. Ọ sịrị: “Ná mmalite, obi tọrọ m ụtọ na onye chọrọ ịlụ m na-achọkarị ịma ebe m nọ, ihe m na-eme, na onye  mụ na ya nọ. Ma, o ruziri nke na o nweghị onye ọzọ mụ na ya na-anọ ma ọ bụghị ya. Ya hụ ebe mụ na ndị ezinụlọ anyị nọ—nke ka nke, ebe mụ na papa m nọ, iwe abịa ya. Mgbe m hapụrụ ya, ọ dị m ka è bupụrụ ibu nọ na-anyịgbu m!”

Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarah. Ọ chọpụtara na nwa okorobịa chọrọ ịlụ ya aha ya bụ John nwere ọnụ ọjọọ, ọ naghị ekwe mmeta, ọ naghịkwa asọpụrụ mmadụ. Sarah kwuru, sị: “O nwere otu mgbe o kwesịrị ịbịa n’ụlọ anyị. Ma, ọ bịara mgbe awa atọ gachara! Ọ tụpụrụghị mama m ọnụ mgbe ọ bịara mepeere ya ụzọ. Ihe o kwuru bụ: ‘Ka anyị gawa. Oge aganahụla anyị.’ Ọ sịghị, ‘Abịaghị m n’oge,’ kama ọ sịrị, ‘Oge aganahụla anyị.’ O kwesịrị ịrịọ m arịrịọ ma gwa m ihe mere na ọ bịaghị n’oge. Nke ka nke, o kwesịrị ịkwanyere mama m ùgwù!” Otú ọ di, otu ihe onye gị na ya na-akpa mehiere ekwesịchaghị ime ka gị na ya kwụsị ịkpa. (Abụ Ọma 130:3) Ma mgbe Sarah chọpụtara na ọ bụghị naanị mama ya ka John na-anaghị akwanyere ùgwù, o kpebiri na ya na ya agaghị akpakwa.

Dị ka Jill na Sarah, gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ihe agaghị adabara gị na onye ahụ ị chọrọ ịlụ? Ọ bụrụ otú ahụ, agbachila nkịtị. Ọ ga-akacha mma ka gị na ya kwụsị ịkpa, ọ bụ ezie na o siri ike omume. Ilu 22:3 kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye gị na ya chọrọ ịlụ na-akpa otu n’ime àgwà ọjọọ ndị ahụ ma ọ bụ karịa, bụ́ ndị dị na peeji nke 39 na nke 40, ihe ga-akacha  mma ga-abụ ka unu kwụsị ịkpa—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo mgbe ọ kwụsịrị ịkpa àgwà ahụ. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ịhapụ onye ahụ adịghị mfe. Ma, alụmdi na nwunye abụghị ihe e kwesịrị itisa etisa. Ọ ka mma idi obi mgbawa ugbu a karịa inwe mwute n’oge ndụ gị niile n’ọdịnihu!

Otú Ị Ga-esi Ekwu Ya

Olee otú ị ga-esi agwa onye gị na ya chọrọ ịlụ na ị ga-ahapụ ya? Buru ụzọ chọpụta mgbe ga-akacha mma ka gị na ya kwuo ya. Olee mgbe ọ ga-abụ? Chegodị echiche otú ị ga-achọ ka e si gwa gị ya ma ọ bụrụ gị. (Matiu 7:12) Ị̀ ga-achọ ka a nọrọ n’ebe ndị ọzọ nọ gwa gị ya? E nwere ike ị gaghị achọ. Ọ gwụla ma è nwere ihe mere ị ga-eji mee ya otú ahụ, ọ dịghị mma ma i jiri ígwè na-aza fon gwa ya na ị hapụla ya, ma ọ bụ jiri ekwe ntị dee ya, ma ọ bụkwanụ jiri kọmputa deere ya ozi ahụ. Kama nke ahụ, chọpụta oge na ebe kwesịrị ekwesị unu ga-anọ kwurịta okwu a dị mkpa.

Gịnị ka i kwesịrị ikwu mgbe oge ruru ka i kwuo ihe ị chọrọ ikwu? Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agwa ibe ha eziokwu.’ (Ndị Efesọs 4:25) N’ihi ya, ọ ga-akacha mma ka i jiri akọ kwuo okwu, ma kwụsie ike n’ihe ị na-ekwu. Kọwaara ya ihe mere i ji chee na mmekọrịta gị na ya agaghị enwe isi. I kwesịghị ịga gwawa ya ọtụtụ ihe ọjọọ o mere ma ọ bụ kọwa ya ọnụ. N’eziokwu, kama ịsị, “Ị naghị” eme nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ọ ga-aka mma ka i kwuo okwu na-egosi otú ọ dị gị n’obi—“Achọrọ m onye . . . ” ma ọ bụ “Echere m na anyị ga-akwụsị ịkpa n’ihi na . . . ”

 Ugbu a abụghị mgbe ị ga na-ama ọnụ jijiji, ọ bụghịkwa mgbe ị ga-ekwe ka onye ahụ mee ka ị gbanwee obi gị. Cheta na ihe mere i ji kpebie ịhapụ ya abụghị ntakịrị ihe. Ya mere, kpachara anya ma ọ bụrụ na onye ahụ gị na ya na-akpa ejiri aghụghọ gbalịa ime ka ị gbanwee obi gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lori sịrị: “Mgbe onye mụ na ya chọrọ ịlụ kwụsịrị ịkpa, ọ malitere ime ka à ga-asị na ọ na-ewutebiga ya ókè mgbe niile. Echere m na ọ na-eme ihe ahụ ka m mewere ya ebere. O wutere m n’eziokwu. Ma, ekweghị m ka ihe ahụ ọ na-eme mee ka m gbanwee obi m.” Dị ka Lori, mara ihe ị chọrọ. Nọsie ike n’ihe i kpebiri. Ka ee e gị bụrụ ee e.Jems 5:12.

Ihe Ịhapụ Onye ahụ Ga-akpata

Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ọ na-ewute gị nke ukwuu mgbe gị na onye ahụ kwụsịrị ịkpa. Obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị ọbụ abụ bụ́ onye sịrị: “Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu; ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum.” (Abụ Ọma 38:6) Ụfọdụ ndị enyi gị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi nwere ike ịgbalị inyere gị aka site n’ịgba gị ume ka gị na onye ahụ  maliteghachi ịkpa. Kpachakwara anya! Ihe ọ bụla si ná mkpebi i mere pụta ga-adị gị n’isi—ọ bụghị n’isi ndị enyi gị ndị ahụ. Ya mere, ụjọ atụla gị ịnọsi ike n’ihe i kwuru—n’agbanyeghị na ihe mere nwere ike ịna-ewute gị.

Ka obi sie gị ike na mwute ị na-enwe ga-akwụsị ka oge na-aga. Ka ọ dị ugbu a, ọ ga-adị mma ma i mee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka idi ya, dị ka ihe ndị a e depụtara.

Gwa onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị. * (Ilu 15:22) Gwa ya Jehova n’ekpere. (Abụ Ọma 55:22) Anọla nkịtị. (1 Ndị Kọrịnt 15:58) Anọla naanị gị! (Ilu 18:1) Ka gị na ndị mmadụ na-akpakọrịta, ya bụ, ndị ga na-agba gị ume. Gbalịsie ike ka ị na-eche banyere ihe ndị kwesịrị ekwesị.—Ndị Filipaị 4:8.

Ka oge na-aga, i nwere ike ịchọta onye ọzọ ị ga-achọ ịlụ. O doro anya na ị ga-elerukwu anya mgbe ị na-eme otú ahụ. Ma eleghị anya, ị jụọ onwe gị ajụjụ ahụ bụ́ “Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?” ihe ị ga-aza ugbu a bụ ee!

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 31

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Mgbe gị na onye ị chọrọ ịlụ na-akpa, olee otú unu ga-esi mara ihe unu kwesịrị ime n’ihe banyere igosi ibe unu ịhụnanya?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 17 Ị ga-achọpụta ihe ndị ọzọ banyere ụdị onye ị bụ ma ọ bụrụ na ị tụlee ajụjụ ndị ahụ dị n’Isi nke 1, n’isiokwu nta bụ́ “Ị̀ Chọwala Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

^ par. 45 Papa gị na mama gị ma ọ bụ ndị ọzọ toro eto, dị ka ndị okenye ọgbakọ, nwere ike inyere gị aka. I nwere ike ịchọpụta na ụdị ihe ahụ na-ewute gị mere ha mgbe ha ka na-eto eto.

AMAOKWU BAỊBỤL

Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.Ilu 20:11.

NDỤMỌDỤ

Ka gị na onye ahụ na-eme ihe ga-enyere unu aka ịmata àgwà ibe unu:

● Na-amụkọnụ Okwu Chineke ọnụ.

● Mata otú onye nke ọzọ si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na otú o si ezi ozi ọma.

● Soronụ na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’iwu ebe a na-anọ efe Chineke.

Ị̀ MA NA . . .. ?

Nchọpụta e mere gosiri na ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-anọghị n’otu okpukpe alụọ, ha na-agbakarị alụkwaghịm.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na mụ enwee mmasị n’ebe onye na-ekweghị ekwe nọ, ihe m ga-eme bụ

Iji chọpụta àgwà e ji mara onye mụ na ya na-akpa, ihe m ga-eme bụ

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee àgwà ọma ndị ị ga na-akpa ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye?

Olee àgwà ndị dị mkpa ị chọrọ ka onye ị ga-alụ na-akpa?

Olee nsogbu ndị tara akpụ ị ga-enwe ma ọ bụrụ na ị lụọ onye na-ekweghị ekwe?

Olee ụzọ ndị i nwere ike isi matakwuo àgwà onye ị chọrọ ịlụ, tinyere omume ya na otú ndị mmadụ si ele ya anya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 37]

“Otú onye ị chọrọ ịlụ si akpaso ndị ezinụlọ ya àgwà bụ otú ọ ga-esi na-akpaso gị àgwà.”—Tony

 Igbe dị na peeji nke 34]

‘Unu na Ha Ekekọtala Onwe Unu, nke Bụ́ Nkekọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’

“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ.” Ma eleghị anya, ị ghọtara na amamihe dị n’ụkpụrụ Baịbụl ahụ dị ná 2 Ndị Kọrịnt 6:14. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike ịbụ na i nwere mmasị n’ebe onye na-ekweghị ekwe nọ. N’ihi gịnị? Mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị n’ihi na onye ahụ mara mma. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Mark sịrị: “M na-ahụ otu nwa agbọghọ mgbe niile n’ebe anyị na-amụ otú e si emega ahụ́. Ọ bụ ya na-eji ụkwụ ya abịakwute m, gwawa m okwu. Ọ raghị ahụ́ mụ na ya akpawa.”

Ọ bụrụ na ị ma onwe gị, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe—ọ bụrụkwa na i tozuola okè nke na ị gaghị eme ihe n’ebughị ụzọ chebara ya echiche—ị ga-ama ihe i kwesịrị ime. N’eziokwu, n’agbanyeghị otú onye ahụ si maa mma, ma ọ bụ otú o si dị ka ọ̀ na-akpa àgwà ọma, ọ gaghị eme ka adịm ná mma gị na Chineke ka mma.—Jems 4:4.

N’ezie, ọ bụrụ na ịhụnanya eriela gị obi, ịhapụ onye ahụ agaghị adịrị gị mfe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cindy chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “M na-ebe ákwá kwa ụbọchị. M na-eche banyere nwa okorobịa ahụ mgbe niile, ọbụna mgbe m nọ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. M hụrụ ya n’anya nke na m chere na ọ kaara m mma ịnwụ kama ịhapụ ya.” Ma, n’oge na-adịghị anya, Cindy hụrụ na amamihe dị na ndụmọdụ mama ya nyere ya ka ya na onye na-ekweghị ekwe ghara ịkpa. Ọ sịrị: “Ọ dị mma na m hapụrụ ya. Obi siri m ike na Jehova ga-egboro m mkpa m.”

Ị̀ nọ n’ọnọdụ yiri nke Cindy? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị ihe naanị gị ga-akwụsịli! I kwesịrị ịgwa ndị mụrụ gị. Nke ahụ bụ ihe Jim mere mgbe ọ chọpụtara na ya na-anwụrụ otu nwa agbọghọ ya na ya nọ n’otu ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “M mechara gwa ndị mụrụ m ka ha nyere m aka. Ọ bụ ihe nyeere m aka ime ka nwa agbọghọ ahụ pụọ m n’obi.” Ndị okenye ọgbakọ nwekwara ike inyere gị aka. Ọ ga-adị mma ma ị gwa otu n’ime ha ihe gị na ya na-alụ.—Aịzaya 32:1, 2.

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 39]

 Ebe M Dere Ihe

Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Di?

Ihe Dị Mkpa M Kwesịrị Ịma Banyere Nwoke Ahụ

□ Olee otú ọ na-esi akpaso ndị ọzọ àgwà mgbe e nyere ya ikike?—Matiu 20:25, 26.

□ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.

□ Ọ̀ na-agbalịsi ike ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ? —1 Ndị Kọrịnt 9:26, 27.

□ Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya?—Ọpụpụ 20:12.

□ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.

□ Gịnị ka ọ na-ekwukarị?—Luk 6:45.

□ Olee otú ya na ego si aga?—Ndị Hibru 13:5, 6.

□ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị ya?—Abụ Ọma 97:10.

□ Olee otú o si egosi na ya hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.

Àgwà Ya

□ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 6:9-11.

□ Ọ̀ ma otú e si eji ego eme ihe bara uru?—Luk 14:28.

□ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Ọrụ 16:1, 2.

□ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ndị Filipaị 2:4.

Ihe Na-egosi na Nsogbu Dị

□ Ọ̀ na-ewekarị iwe?—Ilu 22:24.

□ Ọ̀ na-achọ ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ? —Ndị Galeshia 5:19.

□ Ọ̀ bụ onye na-alụkarị ọgụ ma ọ bụ onye nwere ọnụ ọjọọ? —Ndị Efesọs 4:31.

□ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ekweta na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.

□ Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ma na-achọ ọdịmma onwe ya naanị?—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 40]

 Ebe M Dere Ihe

Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Nwunye?

Ihe Dị Mkpa M Kwesịrị Ịma Banyere Nwaanyị Ahụ

□ Olee otú o si edo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya nakwa n’okpuru ndị okenye? —Ndị Efesọs 5:21, 22.

□ Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya?—Ọpụpụ 20:12.

□ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.

□ Gịnị ka ọ na-ekwukarị?—Luk 6:45.

□ Olee otú ya na ego si aga?—1 Jọn 2:15-17.

□ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.

□ Ọ̀ na-agbalịsi ike ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ? —1 Ndị Kọrịnt 9:26, 27.

□ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị ya?—Abụ Ọma 97:10.

□ Olee otú o si egosi na ya hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.

Àgwà Ya

□ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 31:17, 19, 21, 22, 27.

□ Ọ̀ ma otú e si eji ego eme ihe bara uru?—Ilu 31:16, 18.

□ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Rut 3:11.

□ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ilu 31:20.

Ihe Na-egosi na Nsogbu Dị

□ Ọ̀ bụ nwaanyị na-ese okwu?—Ilu 21:19.

□ Ọ̀ na-achọ ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ?—Ndị Galeshia 5:19.

□ Ọ̀ bụ onye nwere ọnụ ọjọọ ma ọ bụ onye na-alụ ọgụ?—Ndị Efesọs 4:31.

□ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ekweta na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.

□ Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ma na-achọ ọdịmma onwe ya naanị?—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ọ bụghị akpụkpọ ụkwụ ọ bụla ga-aba gị ụkwụ; n’otu aka ahụ, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe ga-adabara gị na ya ma unu lụọ

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ụgbọala, í cheghị na ọ dị mkpa ka i leruo ya anya, ọ bụghị naanị ile otú ahụ́ ya dị? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ dị mkpa ka i lerukwuo anya!