Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ na M Na-ebi Ndụ Ihu Abụọ, Ònye Ka M Kwesịrị Ịgwa?

Ọ Bụrụ na M Na-ebi Ndụ Ihu Abụọ, Ònye Ka M Kwesịrị Ịgwa?

 ISI NKE 16

Ọ Bụrụ na M Na-ebi Ndụ Ihu Abụọ, Ònye Ka M Kwesịrị Ịgwa?

□ Ịṅụbiga mmanya ókè

□ Iso ndị papa gị na mama gị sịrị na ha bụ ndị enyi ọjọọ

□ Ige egwú na-adịghị mma

□ Ịga oriri na nkwari ndị ara

□ Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ịkpa na nzuzo

□ Ile fim a na-egosi ebe a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ, ma ọ bụkwanụ igwu egwuregwu vidio a na-eme ihe ike na ya

□ Ikwu okwu rụrụ arụ

 LEE anya n’ihe ndị ahụ e dere na peeji bu ụzọ. Ò nwere nke ị na-eme papa gị na mama gị na-amaghị? Ya bụrụ otú ahụ, ma eleghị anya, ị ma na ihe ị na-eme adịghị mma. Akọnuche gị nwedịrị ike na-ama gị ikpe. (Ndị Rom 2:15) N’agbanyeghị nke ahụ, i chewe echiche cheta ịkọrọ ya papa gị na mama gị, obi agbafuo gị. I cheta ihe nwere ike isi na ya pụta, i nwere ike ịsị ka ị hapụwa, obi gị ana-agwa gị, sị, “Ihe papa m na mama m na-amaghị agaghị ewe ha iwe.” Ma, ị̀ ma na ihe ahụ ị na-ebi nwere ike ịbụ ndụ ihu abụọ? Gịnị ka i chere mere i ji ezo omume ọjọọ ahụ?

Achọghị Ịnọ n’Okpuru Onye Ọ Bụla

Baịbụl kwuru na ‘nwoke ga-emecha hapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) N’eziokwu, e nwekwara ike ikwu na nwaanyị ga-emecha mee otú ahụ. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ị chọọ ito, na-echere onwe gị echiche, na-ekpebikwara onwe gị ihe ị ga-eme. Ma ụfọdụ ndị na-eto eto na-enupụ isi ma ọ bụrụ na papa ha na mama ha ekweghị ha mee ihe ha weere na ọ bụ ihe nzuzu ma ọ bụ ihe ọjọọ.

N’eziokwu, ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ịdị aka ike mgbe ụfọdụ. Otu nwata nwaanyị aha ya bụ Kim kwuru, sị, “Ha anaghị ekwe anyị lee fim ọ bụla. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na papa m sịrị anyị egela egwú ọ bụla!” Mgbe ọ dị ụfọdụ ndị na-eto eto ka è kere ha agbụ na-enweghị isi na ọdụ, ọ na-adị ha ka ha bụrụ ndị ọgbọ ha, bụ́ ndị o yiri ka à na-ekwe ha mee ihe sọrọ ha.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tammy kwuru na ihe ọzọ mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji ebi ndụ ihu abụọ bụ ka ụmụ akwụkwọ ibe ha lewe ha anya ọma. O kwuru, sị, “Otú m si malite bụ ikwu okwu rụrụ arụ n’ụlọ akwụkwọ. O mere ka obi sie m ike na mụ na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ bụ otu. Ka oge na-aga, m ṅụrụ sịga. Ọ na-abụkwa m ṅụkata mmanya, ya egbuwe m egbu. Amalitekwara m inwe enyi nwoke na nzuzo n’ihi na papa m na mama m anaghị ekwe m megharịa ahụ́, ha anaghịkwa ekwe ka mụ na nwoke na-akpa.”

 Otu nwata nwoke aha ya bụ Pete mere ụdị ihe ahụ. O kwuru, sị: “A mụrụ m n’ọgbakọ. Ma anatụghị m achọ ka a na-achị m ọchị.” Gịnịzi ka Pete mere? O kwuru, sị, “M gbalịrị ime ihe ndị ọzọ na-eme. A jụọ m ihe mere m ji jụ onyinye a na-enye n’oge ememme okpukpe, m na-agha ụgha, kwuokwa ihe ọ bụla m chetara.” Ozugbo Pete malitere ime ntakịrị ihe ndị ọ ma na ha adịghị mma, o mewere ihe ndị ka njọ n’egbughị oge.

Ọ Dịghị Ihe Zoro Ezo

Ibi ndụ ihu abụọ abụghị ihe ọhụrụ. Ụfọdụ ndị Izrel oge ochie biri ndụ ihu abụọ, gbalịa izochi ya. Ma, Aịzaya onye amụma dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agami nnọọ agami iji zonahụ Jehova atụmatụ ha, ndị meworo omume ha n’ebe gbara ọchịchịrị. Ha na-asịkwa: “Ònye na-ahụ anyị, ònyekwa maara ihe anyị na-eme?’” (Aịzaya 29:15) Ndị Izrel chefuru na Chineke na-ahụ ihe ha na-eme. Mgbe oge ruru, o nyere ha ntaramahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ha mere.

Otú ahụ ka ọ dị taa. Ọ bụrụgodị na i zochiere papa gị na mama gị ihe ọjọọ ị na-eme, i nweghị ike izochiri ya Jehova Chineke. Ndị Hibru 4:13 kwuru, sị: ‘Ọ dịghị ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.’ N’ihi ya, olee uru izo ya ezo bara? Cheta na i nweghị ike ime ka obi tọọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na naanị ihe ị na-eme bụ ime ka à ga-asị na ị na-asọpụrụ ya ma ị gaa ọmụmụ ihe. Jehova ma mgbe ndị mmadụ ‘ji egbugbere ọnụ na-asọpụrụ ya, ma obi ha adịrị nnọọ anya n’ebe ọ nọ.’—Mak 7:6.

Ị̀ ma na ndị na-ebi ndụ ihu  abụọ na-eme ihe na-ewute Jehova? N’ezie, ndị mmadụ hà ga-emeli ihe ga-ewute Jehova? Ee! Mgbe ndị Izrel oge ochie hapụrụ Iwu Chineke, ‘o wutere Onye Nsọ Izrel.’ (Abụ Ọma 78:41) Taa, ọ na-ewutekwa Jehova nke ukwuu mgbe ndị na-eto eto ‘a zụlitere n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka ya’ na-eme ihe ọjọọ na nzuzo!—Ndị Efesọs 6:4.

Mezie Ihe I Mebiri

N’ezie, i kwesịrị ikwupụta ihe ị nọ na-eme na nzuzo, n’ihi Chineke na ndị mụrụ gị, ka ọ bakwaara gị uru. N’eziokwu, o nwere ike ịbụrụ gị ihe ihere, ma eleghị anya, meekwa ka a dọtụ gị aka ná ntị. (Ndị Hibru 12:11) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ghakatala ụgha, ghọgide aghụghọ, ike agwụ gị, i meela ka papa gị na mama gị nyowe gị enyo. N’ihi ya, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ha enyekwuo gị iwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ikwupụta ihe i mere bụ ihe kacha mma ị ga-eme. N’ihi gịnị?

Chee echiche banyere ihe atụ a: Ka e were ya na gị na ndị ezinụlọ unu sịrị ka unu gaa kpagharịtụ. Papa gị na mama gị agwa gị ka ị nọrọ n’ebe ha nọ. Ma mgbe ha lefuru anya, gị apụọ, tụrịrị tinye isi n’ebe ị na-amaghị ma fuo ụzọ. Na mberede, gị ana-emikpu na pọtọpọtọ. Ihere ọ̀ ga-eme ka ị ghara ịkpọ papa gị na mama gị ka ha bịa dọpụta gị? Ị̀ ga na-eche, sị, ‘Há  nyekwanụ m ntaramahụhụ n’ihi na m mere ihe ha sịrị m emela?’ Mbanụ! Ị ga-etisi mkpu ike.

N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ ihu abụọ, e kwesịrị inyere gị aka ngwa ngwa. Cheta na i nweghị ike ịlaghachi azụ mezie ihe i mebiri. Ma i nwere ike ịgbanwe ọdịnihu gị. N’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ ihe mwute na ihe siri ike, ọ ga-abara gị uru ma ị chọọ enyemaka mgbe ị na-emebeghị onwe gị na ezinụlọ unu ihe ọjọọ karịrị nke i mere eme. Ọ bụrụ na ihe i mere wutere gị n’ezie, Jehova ga-emere gị ebere.—Aịzaya 1:18; Luk 6:36.

 N’ihi ya, gwa papa gị na mama gị eziokwu. Ghọta na ihe i mere wutere ha. Nabata ntaramahụhụ ha ga-enye gị. I mee otú ahụ, ị ga-eme ka obi tọọ papa gị na mama gị ụtọ, tọọkwa Jehova Chineke ụtọ. Ahụ́ ga-erukwa gị ezigbo ala n’ihi na akọnuche gị adịla ọcha.—Ilu 27:11; 2 Ndị Kọrịnt 4:2.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

E nwere ọtụtụ ihe mere gị na ụmụ klas unu ji bụrụ otu. Ma, olee ihe i kwesịrị ịma banyere imeta ndị enyi n’ụlọ akwụkwọ?

AMAOKWU BAỊBỤL

Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”—Ilu 28:13.

NDỤMỌDỤ

Ewerela na ihe i mejọrọ adịchaghị njọ, ma echela na ị baghịzi uru. Cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie.—Abụ Ọma 86:5.

Ị̀ MA NA . . . ?

Inwe mwute nwere ike ịbara mmadụ uru; o nwere ike ime ka mmadụ chegharịa. Ma onye nọgidere ná mmehie na-emebi akọnuche ya. Ihe agaghịzi na-ewute akọnuche ya, ọ ga-adị ka ahụ́ siri esì, nke ihe na-anaghịzi afụ afụ.—1 Timoti 4:2.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na m na-ebi ndụ ihu abụọ, onye m ga-agwa ya bụ ․․․․․

Otú m ga-esi edi aka ná ntị ọ bụla a ga-adọ m bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji ebi ndụ ihu abụọ?

● Olee nsogbu ụfọdụ ibi ndụ ihu abụọ na-akpata?

● Gịnị mere o ji baa uru ka onye na-ebi ụdị ndụ ahụ gbalịsie ike kwụsị ya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 140]

“Echere m na ndị na-eto eto kwesịrị ime ka ụmụ klas ha mata na ha bụ Ndị Kraịst na-akpa àgwà ọma Baịbụl kwuru ka a na-akpa. Ha kwesịrị ime otú ahụ n’egbughị oge. Ọ bụrụ na ha egbuo oge, ọ ga-esiri ha ike.”—Linda

[Foto dị na peeji nke 141]

Ọ bụrụ na ị tọrọ atọ n’ibi ndụ ihu abụọ, nke yiri imikpu na pọtọpọtọ, i kwesịrị ịchọ enyemaka