Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Die Mba A Na-abara M?

Olee Otú M Ga-esi Die Mba A Na-abara M?

 ISI NKE 21

Olee Otú M Ga-esi Die Mba A Na-abara M?

“Mama m na-eme ka onye uwe ojii na-achọpụta ihe ọjọọ e mere. Ọ na-achọkarị ihe m mejọrọ. Tupu mụ arụchaa ọrụ m na-arụ n’ụlọ, ọ na-abịa nyochawa ihe m rụrụ, na-achọ ebe m na-emetaghị.”—Craig.

“Papa m na mama m na-abara m mba mgbe niile. Ha na-asị na ndụ m dị ghara ghara ghara. N’ihe ọ bụla m mere, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ ma n’ọgbakọ, ha ga-ahụrịrị ihe ha ga-ekwo abara m mba.”—James.

 Ọ̀ NA-ADỊ gị ka o nweghị ihe i mere na-adị papa gị na mama gị mma? Ọ̀ na-adị gị ka hà na-eji onyokomita enyo ihe niile ị na-eme, ya bụ, na ha na-enyocha ihe niile ị na-eme, ma ọ dịghị ebe ha na-asị na i metara?

N’ime okwu ndị a, olee nke ha na-agwakarị gị?

□ Ọ dịghị mgbe ime ụlọ gị na-adị mma n’anya.

□ Ị na-elekarị TV.

□ Ị naghị ehi ụra abalị n’oge.

□ Ị naghị eteta ụra n’oge.

N’okpuru ebe a, dee ihe papa gị ma ọ bụ mama gị na-agwakarị gị na-akacha ewe gị iwe.

․․․․․

N’eziokwu, iwu e nyere gị ma ọ bụ mba a baara gị nwere ike wee gị iwe. Ma chegodị echiche: Ọ bụrụ na papa gị na mama gị anaghị adụ gị ọdụ ma ọ bụ na-adọ gị aka ná ntị, ị́ gaghị eche na ha ahụghị gị n’anya? (Ndị Hibru 12:8) N’eziokwu, aka ná ntị ha na-adọ gị na-egosi na ha hụrụ gị n’anya. Baịbụl kwuru na onye nna ya na-abara mba bụ “nwa ya nke ihe ya dị ya mma.”—Ilu 3:12.

Obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ na ihe mere papa gị na mama gị ji na-adụ gị ọdụ bụ na ha hụrụ gị n’anya! A sị ka e kwuwe, ị ka na-eto eto, ị hụbeghị ihe ha hụrụ ná ndụ. Mee elu mee ala, ha kwesịrị inye gị ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ha enyeghị gị ndụmọdụ, ọ gaghị ara ahụ́ “ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa” erie gị isi.—2 Timoti 2:22.

Ma Ọ Na-ewe Mmadụ Iwe!

N’eziokwu, “ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke na-eyi ihe na-enye ọṅụ mgbe a na-adọ ya, kama ọ na-eyi ihe mwute.” (Ndị Hibru 12:11) Ịdọ aka ná ntị ga-aka ewe gị iwe ugbu a ị na-eto eto. Ọ bụghị ihe ijuanya! Àgwà gị ka na-agbanwe agbanwe. Ị ka na-eto eto, na-achọ ịmata ụdị onye ị ga-abụ. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú e si chezie echiche ma dozie olu baara gị mba, o nwere ike iwe gị iwe.

Iwe ahụ na-ewe gị doro anya n’ihi na ihe ndị ọzọ  na-ekwu banyere gị nwere ike imetụta otú i si ele onwe gị anya. Ihe papa gị na mama gị na-ekwu banyere gị dị gị ezigbo mkpa n’ihi na ọ na-emetụta otú i si ele onwe gị anya. N’ihi ya, mgbe ọ bụla papa gị ma ọ bụ mama gị baara gị mba n’ihi otú i si mee ihe, o nwere ike iwe gị ezigbo iwe.

Ì kwesịrị ikwu na ebe ọ bụ na papa gị na mama gị ekwuola ebe ụfọdụ ị na-emezighị emezi, na o nweghị ihe ọ bụla i mere na-adị ha mma, ma ọ bụ na ị baghịzi uru? Mbanụ. Mmadụ niile na-emehie ihe ọtụtụ mgbe. (Ekliziastis 7:20) Imehie ihe sokwa n’ihe ga-eme ka ị na-amụta ihe. (Job 6:24) Ma, ọ́ bụrụkwanụ na o yiri ka papa gị na mama gị hà na-ekwu oké okwu ma i mehie ihe, ma mgbe i mere ihe dị mma, o nweghị ezigbo ihe ha na-ekwu? O nwere ike ịkpasu gị iwe. Ma, ọ pụtaghị na o nweghị ihe ị ma eme.

Gịnị Mere Ha Ji Abara Gị Mba?

Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ime ka papa gị ma ọ bụ mama gị baara gị oké mba abụghị na i mere ihe na-adịghị mma, kama o nwere ike ịbụ naanị na obi adịghị ya mma. È nwere ihe nyere mama gị nsogbu n’ụbọchị ahụ? Ọ̀ na-arịa ọrịa? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ime ka ọ baara gị oké mba ma ọ bụrụ na ime ụlọ gị adịghị mma n’anya. Iwe ọ̀ na-ewe papa gị n’ihi na o nweghị ego ọ ga-eji gboo mkpa ezinụlọ? O nwere ike ime ka o kwuo okwu n’echeghị echiche “dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.” (Ilu 12:18) N’eziokwu, ụdị okwu ahụ na-akpasu mmadụ iwe. Ma kama ichewe okwu ahụ na-ezighị ezi—nke ga-akpasukwu gị iwe—gbalịa leghara ihe ha mejọrọ anya. Chetakwa: “Anyị niile na-asụ  ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè.”—Jems 3:2.

Ebe ọ bụ na papa gị na mama gị ezughị okè, o nwekwara mgbe ọ na-adị ha ka ha enweghị ike imezi ihe emezi. N’eziokwu, mgbe i mejọrọ ihe, o nwere ike ime ka ha chewe na o nwere ihe ha mejọrọ. Dị ka ihe atụ, nne nwere ike ịbara nwa ya nwaanyị mba ma ọ daa n’ule. Ma ihe nne ahụ nwere ike ịna-eche bụ, ‘O nwekwara ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na anaghị m eme ihe niile m kwesịrị ime inyere ya aka ka o mee nke ọma.’

Ekwula Okwu Ma A Bawara Gị Mba

N’agbanyeghị ihe mere e ji na-abara gị mba, ajụjụ bụ, Olee otú ị ga-esi die ya? Ihe mbụ bụ ịkpachara anya ka ị ghara iji iwe saa ha okwu. Ilu 17:27 kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe, mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.” A bawara gị mba, olee otú ị ga-esi mee ka ‘mmụọ gị dịrị jụụ’? Megodị ihe ndị a:

Gee ntị. Kama ikwu na ihe i mere adịghị njọ ma ọ bụ na ọ dịghị ihe i mere, gbalịa jide obi gị aka ma gee ntị n’ihe papa gị na mama gị chọrọ ịgwa gị. Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-anụ ihe ngwa ngwa, ghara ịna-ekwu okwu ngwa ngwa, gharakwa ịna-ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Ọ bụrụ na i jiri iwe na-asa ha okwu mgbe ha na-abara gị mba, ha ga-eche na ị naghị ege  ntị n’ihe ha na-ekwu. Ọ ga-akpasu ha iwe, meekwa ka ha na-abakwuru gị mba.

Chee echiche. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka papa gị na mama gị hà ji iwe baara gị mba. Ma, kama ichewe otú ha si gwa gị okwu, chebara ihe ha gwara gị echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m ma bụ́ eziokwu na mba a ha baara m? Hà ekwuola ihe ahụ mbụ? Ọ̀ dị ihe ọ ga-ewepụ m n’ahụ́ ma m mee ihe ha gwara m?’ Chetakwa na, n’agbanyeghị otú ahụ ọ dị gị mgbe ahụ, ihe mere papa gị na mama gị ji abara gị mba bụ na ha hụrụ gị n’anya. Ọ bụrụ eziokwu na ha kpọrọ gị asị, ha agaghịdị adọ gị aka ná ntị.—Ilu 13:24.

Kwughachi ihe ha kwuru. Ọ bụrụ na i jiri nkwanye ùgwù kwughachi ndụmọdụ ahụ papa gị na mama gị nyere gị, ha ga-aghọta na ị nụrụ ihe ha kwuru. Dị ka ihe atụ, papa gị ma ọ bụ mama gị nwere ike ịsị gị: “O nweghị mgbe ị na-edewe ime ụlọ gị ọcha. Ọ bụrụ na i hichaghị ya, ị gaghị apụ èzí!” I nwere ike iche na ime ụlọ gị dị ọcha. Ma, ịgwa ya na ime ụlọ gị dị ọcha agaghị aba uru. Gbalịa lee ime ụlọ gị anya otú papa gị na mama gị si lee ya anya. N’ejighị ọnụ ọjọọ, ọ ga-aka mma ka i kwuo ihe dị ka: “Ọ bụ eziokwu. Ime ụlọ m adịghị ọcha. Ị̀ chọrọ ka m hichaa ya ugbu a ka ọ̀ bụ ma e richaa nri abalị?” Ọ bụrụ na i si otú ahụ na-ekweta ihe papa gị na mama gị kwuru,  o nwere ike ime ka iwe ha dajụọ. N’eziokwu, i kwesịrị ime ihe papa gị na mama gị kwuru.—Ndị Efesọs 6:1.

Chere. Ekwula na ihe i mere adịghị njọ ruo mgbe i mere ihe papa gị na mama gị gwara gị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.” (Ilu 10:19) Ọ bụrụ na papa gị na mama gị achọpụta na ị na-ege ha ntị, ha ga-achọkwa ige gị ntị.

N’ihe anọ ahụ e kwuru, dee nke i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya karịchaa. ․․․․․

Ihe Mere O Ji Baa Uru

Ọ bụrụ na ị hụrụ ebe nnukwu ọlaedo dị, ị́ gaghị ejisi ike gwuo ya n’agbanyeghị ahụ́ ọ ga-ara gị? Baịbụl kwuru na amamihe bara uru karịa akụ̀ ọ bụla dị oké ọnụ ahịa. (Ilu 3:13, 14) Olee otú ị ga-esi ama ihe? Ilu 19:20 kwuru, sị: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.” N’eziokwu, ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị nwere ike ịkpasu gị iwe. Ma, ọ bụrụ na i jisie ike ghọta amamihe dị na mba a baara gị, meekwa ya  eme, ị ga-enweta akụ̀ bara uru karịa ọlaedo.

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe a na-agaghị abara gị mba. I kwesịrị idi mba papa gị, mama gị, ma ọ bụ ndị nkụzi gị na-abara gị ugbu a. O doro anya na n’ọdịnihu, ndị ga-ewe gị n’ọrụ nakwa ndị ọzọ nwere ike ịbara gị mba. Ọ bụrụ na ị mụta idi mba a na-abara gị n’ụlọ, ị ga-abụ nwa akwụkwọ na-eme nke ọma, onye ọrụ a na-akwanyere ùgwù nakwa onye ndị mmadụ ga-atụkwasị obi. N’ezie, ọ ga-abara gị uru idi ntakịrị mba ma rite uru a niile!

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

N’ụlọ unu, è nyere gị ọtụtụ iwu na-anaghị ekwe gị megharịa ahụ́? Chọpụta otú ị ga-esi nwee obi ụtọ n’ohere e nyere gị—nakwa otú ị ga-esi nwetakwuo ohere.

AMAOKWU BAỊBỤL

Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka.Ilu 1:5.

NDỤMỌDỤ

Ihe ga-enyere gị aka ịnara ndụmọdụ papa gị na mama gị nyere gị bụ

Inwe obi ụtọ ná mma ọ bụla ha jara gị n’agbanyeghị mba ha na-abara gị.

Ịjụ ha ajụjụ ma ọ bụrụ na ị ghọtaghị ihe ha sịrị na i mere ma ọ bụ ihe ha chọrọ ka i mee.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihe mere ọ na-eji ara ụfọdụ ndị papa na ndị mama ahụ́ iji ịhụnanya emeso ụmụ ha omume bụ na papa ha na mama ha ejighị ịhụnanya na obiọma meso ha omume.

IHE M GA-EME!

Mgbe ọzọ papa m na mama m baara mụ mba, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ọ dị m ka papa m na mama m hà na-abara mụ mba mgbe niile, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị nwere ike ime ka o siere gị ike ịnabata mba a baara gị?

Gịnị nwere ike ime ka papa gị na mama gị bawara gị mba?

Olee ihe ị ga-eme ka ndụmọdụ e nyere gị baara gị ezigbo uru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 177]

“N’oge mbụ, ọ na-abụ mama m jiri iwe na-abara m mba, mụ ejiri olu ike na-asa ya okwu. Ma ugbu a, ana m agbalị ime ihe Okwu Chineke kwuru. Ọ bara uru. Àgwà mama m agbanwewala. Kemgbe m mewere ihe Baịbụl kwuru, aghọtawala m mama m karị. Ihe na-adabaziri mụ na ya.”—Marleen

[Foto dị na peeji nke 180]

Ọ bụrụ na i were amamihe dị na mba a baara gị, ị ga-enweta akụ̀ bara uru karịa ọlaedo