Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Ego

Okwu Ego

 NKEBI NKE 5

Okwu Ego

Ọ̀ bụ ego ga-eme ka i nwee obi ụtọ?

□ Ọ bụghị ya

□ Ọ bụchaghị ya

□ Ọ bụ ya

Ugboro ole ka ị na-ekwu okwu ego, ma ọ bụ banyere ihe ị ga-azụ?

□ Ọ na-ara ahụ́

□ Mgbe ụfọdụ

□ Mgbe ọ bụla

Ma eleghị anya, papa gị na mama gị na-agụrụ gị ya ka egwú, na e nweghị osisi na-amị ego. Ha kwuru eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka i were ego na-eme ihe bara uru. Ọ bụ eziokwu na ego bara ezigbo uru, o nwere ike ịkpatara gị obi ezughị ike, mebie adịm ná mma gị na enyi gị, mebiekwa mmekọrịta gị na Chineke. N’eziokwu, otú i si ele ego anya nwere ike imetụta otú i si eme omume. Isi nke 18 ruo nke 20 ga-eme ka ị mata otú i kwesịrị isi na-ele ego anya.

 [Foto juru ihu peeji nke 148 na nke 149]