Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa?

M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa?

 ISI NKE 30

M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa?

 OTU nwata nwoke aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, ọ bụkwa ebe a nọ. Mgbe ị na-egwu ya, ị ga-emeli ihe ọ ga-abụ i mee n’ìhè, gị abanye n’ezigbo nsogbu.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Deborah kwukwara na igwu egwuregwu kọmputa na-atọ ya ụtọ. Otú ọ dị, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ na-eri mmadụ oge, o nwekwara ike iri mmadụ ahụ́.”

O doro anya na egwuregwu kọmputa abụghị naanị ntụrụndụ ọgbara ọhụrụ. N’eziokwu, ọ ga-egosi ma ì nwere nkà, nyekwara gị aka chụọ ike ọgwụgwụ. Ma, ọ na-eme ihe karịrị nke ahụ. Egwuregwu kọmputa nwekwara ike ime ka ụbụrụ gị na-aghọ nkọ. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike ime ka ị mụtakwuo ịrụ mgbakọ na mwepụ, nakwa otú e si agụ ihe nke ọma. Ọzọkwa, egwuregwu kọmputa pụtara ọhụrụ nwere ike ịbụ okwu ụmụ akwụkwọ ibe gị kpụ n’ọnụ. Ọ bụrụ na i gwuola ya, ị ga-enwe ihe ị ga-akọrọ ha.

N’ezie, ọ bụrụ na ị saa anya ná mmiri chọọ, ị ga-achọta nke dị ụtọ Onye Kraịst nwere ike igwu. Ma gịnị mere ị ga-eji asa anya ná mmiri?

Nsogbu Ya

Ọ dị mwute na ọ bụghị egwuregwu kọmputa niile dị mma. Ọtụtụ n’ime ha taa na-akwadosi ihe Baịbụl kpọrọ “ọrụ nke anụ ahụ́” ike, ya bụ, omume rụrụ arụ Chineke kpọrọ asị.—Ndị Galeshia 5:19-21.

Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Adrian kwuru na otu egwuregwu kọmputa na-ewu ewu na-egosi “ịlụ agha, ịṅụ ọgwụ ike, inwe mmekọahụ, okwu rụrụ arụ, ime ihe ike, ịwụfu ọbara, na ihe ọjọọ ndị ọzọ.” Ụfọdụ n’ime ha na-akwadokwa anwansi. Nke ọhụrụ ọ bụla e wepụtara na-akakwa ndị bu ya ụzọ njọ. Mmadụ na  mmadụ nwere ike igwu ọtụtụ n’ime ha n’Ịntanet. O meela ka igwu egwuregwu kọmputa na-atọkwu ụtọ. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu aha ya bụ James kwuru, sị: “I nwere ike iji kọmputa dị n’ụlọ gị gị na ndị nọ ná mba ndị ọzọ asọọ mpi.”

Ihe na-ewu ugbu a bụ egwuregwu kọmputa ndị a na-enwe n’Ịntanet, ebe ndị na-egwu ha ga na-eme ka hà bụ ndị nọ n’egwuregwu ndị ahụ. N’ụdị ndị a, ndị na-egwu ha na-eji aka ha ewepụta ndị ha ga-eji egwu nke ha chọrọ igwu. O nwere ike ịbụ mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụkwanụ ha abụọ. Ha na-emepụta ebe yiri ụwa n’ime kọmputa, bụ́ ebe e nwere ọtụtụ puku ihe ndị ọzọ yiri anụmanụ ma ọ bụ mmadụ. N’ebe ahụ, a na-enwe ụlọ ahịa, ụgbọala, ụlọ, ebe a na-agba egwú, ụlọ ndị akwụna, ya bụ, ọ na-adị nnọọ ka ụwa anyị a. Ndị na-egwu egwuregwu a nwere ike iji kọmputa na-ezirịta ozi mgbe ndị ahụ ha ji kọmputa wepụta na-asọ mpi.

Ụfọdụ n’ime ndị ọjọọ a na-ahụ n’egwuregwu a bụ ndị òtù ọjọọ, ndị akwụna na ndị na-akpọtara ha ndị ahịa, ndị ohi, ndị na-emepụta ihe adịgboroja, na ndị na-egbu mmadụ. Ndị na-egwu egwuregwu a nwere ike ime ihe ha na-agaghị emeli n’ìhè. Ha nwekwara ike ịpị bọtịn aka, mee ka ndị ahụ ha wepụtara na kọmputa malite inwe mmekọahụ, ha onwe ha ejiri kọmputa na-ezirịta ozi banyere mmekọahụ. N’egwuregwu kọmputa ụfọdụ, ndị ahụ ha wepụtara na ndị ọzọ yiri ụmụaka nwere ike inwe mmekọahụ. O doro anya na ọ na-ewute ndị na-akatọ egwuregwu ahụ na ndị mmadụ na-eji ụdị omume rụrụ arụ ahụ egwu egwuregwu.

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Ị Họrọ nke Dị Mma

Ndị na-egwu ụdị egwuregwu ahụ a na-eme ihe ike ma ọ bụ na-enwe  mmekọahụ na ya nwere ike ikwu, sị: “O nweghị onye e merụrụ ahụ́. Ihe ahụ emeghị eme. Ọ bụ naanị egwuregwu.” Ma ekwela ka e jiri ụdị ụgha ahụ rafuo gị!

Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” (Ilu 20:11) Ọ bụrụ na ị na-egwu egwuregwu ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha, à ga-akpọ gị onye omume ya dị ọcha, na onye ziri ezi? Nchọpụta ndị e mere gosiri na mmadụ ikiri egwuregwu a na-eme ihe ike na ya na-eme ka onye ahụ na-eme ihe iwe iwe. N’eziokwu, ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ebe ọ bụ na ndị na-egwu egwuregwu kọmputa na-eso eme ihe a na-eme na ya, o nwere ike imetụta mmadụ karịa ihe a na-egosi na TV.

Mmadụ ịhọrọ igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha yiri iji ihe na-esi ísì ọjọọ na-egwuri egwu—o nwere ike ọ gaghị ama na ọ na-emebi ya ahụ́, ma ọ ga-emebirịrị ya ahụ́. Olee otú ọ ga-esi emebi ya ahụ́? Ikuru ísìsì ọjọọ ahụ mgbe niile nwere ike imebi akpa ume mmadụ ma kpatara onye ahụ ọrịa. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-egwu egwuregwu kọmputa ndị a na-enwe mmekọahụ ma ọ bụ na-eme ihe ike na ha, ọ ga-eme ka ‘mmehie ghara iwute’ gị,  meekwa ka ọchịchọ anụ ahụ́ na-achị echiche gị na omume gị.—Ndị Efesọs 4:19; Ndị Galeshia 6:7, 8.

Olee Egwuregwu Kọmputa M Kwesịrị Ịhọrọ?

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị kwere ka ị na-egwu egwuregwu kọmputa, olee otú ị ga-esi ama nke i kwesịrị ịhọrọ nakwa awa ole ị ga-eji na-egwu ya? Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

Olee otú nke m họọrọ ga-esi emetụta otú Jehova si ele m anya? Abụ Ọma 11:5 kwuru, sị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” Okwu Chineke kwukwara banyere ndị na-eme anwansi, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, i kwesịrị ime ihe e kwuru n’Abụ Ọma 97:10, bụ́ ebe sịrị: ‘Kpọọ ihe ọjọọ asị.’

 Olee otú ọ ga-esi emetụta echiche m? Jụọ onwe gị, sị, ‘Igwu egwuregwu a ọ̀ ga-eme ka ọ dịkwuoro m mfe ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ’ ka ọ̀ ga-eme ka o sikwuoro m ike?’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Egwuregwu kọmputa ndị na-egosi ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ndị a na-ekwu ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na ha agaghị eme ka ị na-eche ihe ziri ezi, ihe dị ọcha nakwa ihe a na-ekwu okwu ọma banyere ya.—Ndị Filipaị 4:8.

Awa ole ka m ga-eji na-egwu ya? Egwuregwu kọmputa ndị na-adịghị njọ nwedịrị ike iri ezigbo oge. N’ihi ya, na-edekọ awa ole i ji na-egwu ya edekọ. Ọ̀ na-eri oge i kwesịrị iji eme ihe ndị ka mkpa? Ọ bụrụ na ị na-edekọ awa ole i ji egwu egwuregwu ahụ, ọ ga-enyere gị aka iji oge gị na-eme ihe ndị ka mkpa.—Ndị Efesọs 5:16.

N’eziokwu, Baịbụl ekwughị na naanị ihe ị ga-eji oge gị niile na-eme bụ ịmụ ihe na ịrụ ọrụ dị n’ụlọ. Kama nke ahụ, ọ na-echetara anyị niile na e nwere “oge ịchị ọchị . . . na oge  ịwụli elu.” (Ekliziastis 3:4) Ma, buru n’obi na okwu ahụ bụ́ “ịwụli elu” apụtaghị naanị igwuri egwu, kama ọ pụtakwara imega ahụ́. N’ihi ya, ọ́ gaghị aka mma ka i jiri oge gị ụfọdụ na-emega ahụ́ kama ịnọ na-apị kọmputa ma ọ bụ TV mgbe niile?

Jiri Amamihe Na-ahọrọ nke Ị Ga-egwu

O doro anya na igwu egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ị ma ya egwu. Ọ bụ ya mere i kwesịrị iji jiri amamihe na-ahọrọ nke ị ga-egwu. Jụọ onwe gị, sị, ‘N’ime ihe ndị m na-amụ n’ụlọ akwụkwọ, olee ndị m kacha eme nke ọma na ha?’ Ọ́ bụghị ha na-akacha atọ gị ụtọ? N’eziokwu, ka ihe ị na-amụ na-atọ gị ụtọ, otú ahụ ka ọ na-edokwu gị anya. Ugbu a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee egwuregwu kọmputa na-akacha atọ m ụtọ? Olee ihe ọma ọ na-akụziri m?’

Kama igwu egwuregwu kọmputa n’ihi na ọ na-amasị ndị ọgbọ gị, kata obi kpebie ụdị ndị ị ga-egwu dabere n’ihe ị maara. Nke ka nke, mee ihe a Baịbụl dụrụ ọdụ ya: “Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—Ndị Efesọs 5:10.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na egwú na-atọ gị ụtọ, ọ dịghịkwa njọ. Ma, ò riela gị isi?

AMAOKWU BAỊBỤL

Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.Abụ Ọma 97:10.

NDỤMỌDỤ

Dee ná nkenke banyere egwuregwu kọmputa ọ bụla ị chọrọ igwu, kọwaa ihe mere e ji egwu ya na otú e si egwu ya. Jiri ihe i dere tụnyere ụkpụrụ Baịbụl a kọwara n’isiokwu a, marazie ma ì kwesịrị igwu egwuregwu ahụ.

Ị̀ MA NA . . . ?

N’afọ 2006, n’obodo Amsterdam nke dị na Netherlands, e mepere ụlọ ọgwụ mbụ n’ụwa nke na-agwọ ndị egwuregwu kọmputa riri isi.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na enyi m agwa m ka m gwuo egwuregwu kọmputa a na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ na ya, ihe m ga-agwa ya bụ ․․․․․

Naanị awa ole m ga-eji na-egwu egwuregwu kọmputa n’izu bụ ․․․․․, ihe ga-enyere m aka ime ya bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Olee otú egwuregwu kọmputa ga-esi emetụta echiche mmadụ na àgwà ya?

Gịnị mere o ji dị mkpa ka i chebara ụkpụrụ Jehova echiche mgbe ị na-ahọrọ egwuregwu kọmputa ị ga-egwu?

Olee otú ị ga-esi enyere nwanne gị ị tọrọ aka ma ọ bụrụ na egwuregwu kọmputa ị ma na ọ dịghị mma eriela ya isi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 249]

“Ọtụtụ egwuregwu kọmputa na-eme ka ime ihe ike, ikwu okwu rụrụ arụ, na ime omume rụrụ arụ ghara ịdị gị ka ihe ọjọọ. O nwekwara ike ime ka i mee ihe ọjọọ ndị ọzọ. I kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị egwuregwu kọmputa ndị ị na-egwu.”—Amy

[Foto dị na peeji nke 250]

Mmadụ igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha yiri iji ihe na-esi ísì ọjọọ na-egwuri egwu—o nwere ike ọ gaghị ama na ọ na-emebi ya ahụ́, ma ọ ga-emebirịrị ya ahụ́