Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Eme?

Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Eme?

 ISI NKE 38

Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Eme?

“Mgbe mbụ, anaghị m echegbu onwe m banyere ọdịnihu. Ma, mgbe m gụchawara akwụkwọ, achọpụtara m na o ruwela mgbe m ga-ama ihe ụwa na-akọ, mgbe m ga na-arụ ọrụ, na-akwụrụ onwe m ụgwọ niile.”—Alex.

KA E were ya na ị chọrọ isi n’ebe i bi gaa obodo dị ezigbo anya. Ma eleghị anya, ị ga-ajụ ndị ma ụzọ otú ị ga-esi aga ebe ahụ. E nwere ike iji ya tụnyere ime atụmatụ maka ọdịnihu gị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Michael, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, kwuru, sị: “Ihe i nwere ịhọrọ juru eju.” Olee otú ị ga-esi mara nke ị ga-ahọrọ n’ime ha niile? Michael kwuru, sị: “Ọ dabeere n’ihe ị chọrọ iji ndụ gị eme.”

Were ya na ihe mgbaru ọsọ gị bụ otu ebe ị chọrọ ịga. Ọ bụrụ na ị nọ nnọọ na-agagharị, ọ dị ka ị gaghị eru ebe ahụ ị chọrọ ịga. Ọ bụrụ na ị maghị ụzọ, ọ ka mma ka ị jụọ ndị ma ụzọ ebe i kwesịrị isi. Otú ahụ ka ị ga-esi eme ihe Ilu 4:26 dụrụ gị ọdụ ka i mee. Ọ sịrị: “Mee ka ụzọ nke ụkwụ gị na-aga dị larịị.” Otú Baịbụl ọzọ (bụ́ Contemporary English Version) si sụgharịa ya bụ: “Mara ebe ị na-aga.”

 N’afọ ndị na-abịa n’ihu, ị ga-ekpebi ọtụtụ ihe dị mkpa banyere ofufe ị na-efe Chineke, ọrụ ị ga-arụ, onye ị ga-alụ, ezinụlọ gị, na ihe ndị ọzọ. Ọ ga-adịrị gị mfe ime ezi mkpebi ma ọ bụrụ na i buru ụzọ mara ihe ị chọrọ. Ma mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eji ndụ gị eme, ọ dị otu ihe ị na-ekwesịghị ileghara anya.

“Cheta Onye Kere Gị”

Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe obi ụtọ n’ezie, echefula ihe Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru. Ọ sịrị: “Cheta Onye kere gị mgbe ị ka na-eto eto.” (Ekliziastis 12:1, Today’s English Version) Ọ pụtara na ihe kwesịrị iduzi ụdị ndụ ị ga-ebi bụ ịchọ ime ihe dị Chineke mma.

Gịnị mere o ji dị mkpa ka i kpebie ime otú ahụ? Baịbụl kwuru ná Mkpughe 4:11, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Ihe niile e kere eke n’eluigwe na ụwa  kwesịrị ikele Onye kere ha. Ị̀ na-ekele Chineke maka ‘ndụ, ume, na ihe niile’ o nyere gị? (Ọrụ 17:25) Ọ́ naghị emetụ gị n’obi iji ihe ọ bụla kelee Jehova Chineke maka ihe niile o nyere gị?

Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova abanyela n’ozi oge niile n’ihi na ha na-echeta Onye kere ha. Chee echiche banyere ụzọ dị iche iche magburu onwe ha i nwere ike isi jeere Chineke ozi.

Ozi ịsụ ụzọ. Ndị ọsụ ụzọ oge niile na-eji oge buru ibu eje ozi ọma. Ọzụzụ na ahụmahụ ha na-enweta na-eme ka ha na-enwekwu nkà n’ịkụzi Baịbụl.

Ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ụfọdụ ndị na-akwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị ọzọ na-amụ asụsụ ọzọ ma na-eje ozi n’ọgbakọ dị nso na-asụ asụsụ mba ọzọ ma ọ bụkwanụ kwaga mba ọzọ. *

Ozi ala ọzọ. A na-enye ndị ọsụ ụzọ ruru eru, ndị ahụ́ gbasiri ike, ọzụzụ ije ozi ná mba ọzọ. Ndị ozi ala ọzọ na-enwe obi ụtọ na ọṅụ ná ndụ ha.

Ozi Betel. Ndị ezinụlọ Betel na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ná mba  ụfọdụ, ha na-ebi akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ma na-ebugara ha ọgbakọ dị iche iche.

Ije ozi ná mba ndị ọzọ. Ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-aga arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche.

Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ndị na-aga ụlọ akwụkwọ a bụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru, bụ́ ndị na-alụbeghị nwaanyị. A na-akụziri ha otú e si ahazi ọgbakọ na otú e si ekwu okwu n’ihu ọha. A na-eziga ụfọdụ ndị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a ná mba ọzọ.

Kpebie Ihe Ị Ga-eme

Ozi oge niile bụ ezigbo ihe mgbaru ọsọ nke na-eme ka mmadụ nweta ọtụtụ ngọzi. Ma e kwesịrị ibu ụzọ chebara ya echiche. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee aka ọrụ m nwere m ga-eji na-enyere onwe m aka?’

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kelly setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ịbụ ọsụ ụzọ. N’ihi ya, o kpebiri ụdị ọrụ ego ọ ga-arụ. O kwuru, sị: “Ekpebiri m ịrụ ọrụ ga-eme ka m na-egbo mkpa m ma na-eje ozi m.”

 Kelly banyere ụlọ akwụkwọ dị elu nke na-akụzi ihe ọmụmụ ọrụ aka. O nyeere ya aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ o setịpụrụ. Kelly kwuru, sị: “Ozi oge niile bụ ọrụ m chọrọ ịrụ. O nweghị ihe ọzọ dị mụ mkpa karịa ya.” Obi dị Kelly ụtọ n’ihi ihe a o kpebiri. O kwuru, sị: “Echeghị m na ọ dị ihe ọzọ m gaara ekpebi ime ga-aka nke a mma.”

Jụọ Ajụjụ

Ọ bụrụ na ị maghị ụzọ ebe ị na-aga, ị gatụ, i kwesịrị ịjụ ajụjụ. I nwere ike ime otú ahụ mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eme n’ọdịnihu. Jụọ ndị ọzọ ihe ha chere. Ilu 20:18 kwuru, sị: “A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike.”

Papa gị na mama gị nwere ike inye gị ndụmọdụ. Ma Ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè nwekwara ike inye gị ndụmọdụ, ya bụ, ndị ndụ ha gosiri na ha nwere amamihe Chineke.  E nwere otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na asaa na-arụ ọrụ na Betel. Aha ya bụ Roberto. Ọ tụrụ aro, sị: “Chọọ ndị toro eto na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ unu ma ọ bụ n’ọgbakọ ndị dị nso.”

Karịa onye ọ bụla ọzọ, Jehova Chineke chọrọ inyere gị aka ka i kpebie iji ndụ gị mee ihe ga-eme ka i nwee obi ụtọ na-enweghị atụ. N’ihi ya, rịọ ya ka o nyere gị aka ‘ịnọgide na-aghọta ihe bụ́ uche ya’ banyere ọdịnihu gị. (Ndị Efesọs 5:17) N’ihe niile ị na-eme ná ndụ, soro ndụmọdụ ahụ dị n’Ilu 3:5, 6, nke sịrị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”

Ị chọọ ịmụta ihe ndị ọzọ, lee DVD bụ́ “Young People Ask—What Will I Do With My Life?” E nwere ya n’ihe karịrị asụsụ iri atọ.

[Ihe odide ala ala peeji]

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Nwaleenụ m . . . ,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.’Malakaị 3:10.

NDỤMỌDỤ

Gị na ndị jerela ozi oge niile ruo ọtụtụ afọ kwurịta okwu. Chọpụta ihe mere ha ji kpebie ije ozi oge niile nakwa ngọzi ndị ha nwetara.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọkụ eletrik na-eme ka ihe ndị dị ka redio na TV na-arụ ọrụ. Otú ahụ ka mmụọ nsọ Chineke nwere ike ime ka ị rụọ ihe dị ukwuu n’ozi Chineke.—Ọrụ 1:8.

IHE M GA-EME!

Ka m nwee ike inwetakwu obi ụtọ n’ozi ọma, onye mụ na ya ga-ekwurịta okwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee ihe ndị ị ma eme?

● Olee otú ị ga-esi jiri ha na-eto Jehova?

● Olee ụdị ozi oge niile a kọwara n’isiokwu a nke kacha amasị gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 313]

“Ana m eji papa m na mama m eme ọnụ. Otú ha si anụ ọkụ n’obi mgbe niile n’ozi ọma, otú ha si edi ihe isi ike, na ume ha gbara m ịbanye n’ozi oge niile, nyeere m ezigbo aka.”—Jarrod

 Igbe dị na peeji nke 314]

Ebe M Dere Ihe

Ihe Mgbaru Ọsọ M

Kanye akara n’ihe mgbaru ọsọ ndị ị chọrọ isetịpụ. N’ebe ndị a na-edeghị ihe, dee ihe ị ga-emeli ma ọ bụkwanụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ.

N’ozi Ọma

□ Itinyekwu oge n’ozi ọma ka o ruo awa ․․․․․ n’ọnwa

□ Itinye akwụkwọ ․․․․․ kwa ọnwa

□ Ịgụ Baịbụl mgbe m na-agwa ndị ọzọ ihe m kweere

□ Ime nletaghachi ․․․․․ kwa ọnwa

□ Ịmalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl

Ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ: ․․․․․

N’ịmụ Ihe

□ Ịgụ peeji ․․․․․ na Baịbụl kwa ụbọchị

□ Ịkwadebe ọmụmụ ihe niile a na-enwe kwa izu

□ Ime nchọnchọ n’isiokwu Baịbụl ndị a: ․․․․․

N’ọgbakọ

□ Ọ dịkarịa ala, ịza otu ajụjụ n’ọmụmụ ihe ọ bụla

□ Ịgakwuru onye torola eto m chọrọ ịmatakwu ka mụ na ya kwurịta okwu

□ Ileta onye ọgbakọ anyị merela agadi ma ọ bụ onye na-arịa ọrịa

Ihe ndị ọzọ: ․․․․․

Akara Ụbọchị Taa

Ọnwa isii gachaa, tụleghachi ihe i dere, chọpụta ma ì rukwara ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ i dere. Gbanwee ha ma ọ bụ tinye ndị ọzọ.

[Foto dị na peeji nke 312]

Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ga-eme ka ị ghara imefusị ike gị n’enweghị ebe i ji azụ aga