Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Akọwara Ndị Ọzọ Ihe M Kweere Banyere Chineke?

Olee Otú M Ga-esi Akọwara Ndị Ọzọ Ihe M Kweere Banyere Chineke?

 ISI NKE 36

Olee Otú M Ga-esi Akọwara Ndị Ọzọ Ihe M Kweere Banyere Chineke?

Olee ihe nwere ike ime ka ị ghara ịgwa nwa klas unu ihe i kweere?

□ Amachaghị Baịbụl

□ Ịtụ ụjọ na a ga-achị gị ọchị

□ Amaghị otú e si amalite nkwurịta okwu

Olee otú i chere ga-akacha adịrị gị mfe ịgwa mmadụ ihe i kwere?

□ Ịgwa otu nwa klas unu okwu

□ Ịgwa ụmụ klas unu niile okwu n’otu mgbe

□ Ide edemede banyere ihe i kweere na Baịbụl

Dee aha nwa klas unu i chere ọ ga-amasị ka gị na ya kwurịta okwu banyere Baịbụl ma ọ bụrụ na ị ma otú ị ga-esi amalite ya. ․․․․․

 O NWERE ike ịbụ na ụmụ akwụkwọ ibe gị anaghị ekwukarị okwu gbasara Chineke. I kwuo banyere ihe ndị ọzọ dị ka egwuregwu, uwe ma ọ bụ okwu nwoke na nwaanyị, onye ọ bụla ga-achọ itinye ọnụ. Ma i kwutezie okwu banyere Chineke, ebe niile ajụọ oyi ozugbo.

Ọ bụghị na ụmụaka ibe gị ekweghị na Chineke; ọtụtụ n’ime ha kweere na ya. Ma ụfọdụ na-eme ihere ikwu ihe banyere ya. Ha nwere ike iche, sị: ‘Ọ bụghị ebe a nọ.’

Gịnwa kwanụ?

Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe gị okwu banyere Chineke, ọ bụghị ihe ijuanya. O nweghị onye chọrọ ịbụ onye a jụrụ ajụ, ma ya fọdụzie ịbụ onye a na-achị ọchị! Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime gị ma ọ bụrụ na ị gwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere? Ee. N’aka nke ọzọ, ụmụaka ibe gị nwere ike ime ihe ga-eju gị anya. Ụfọdụ n’ime ha na-achọ ka a zaa ha ajụjụ ndị dị ka: Olee ihe ụwa a chọrọ ịghọ? na Gịnị mere nsogbu ji ju n’ụwa? Ha nwere ike ịchọ ka ụmụaka ibe ha zaa ha ụdị ajụjụ ahụ kama ndị dimkpa ịza ha ya.

N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike isiri gị ezigbo ike gị na ụmụaka ibe gị ikwurịta ihe gbasara okpukpe. N’eziokwu, i kwesịghị imewe ka onye okpukpe ya na-agba ara ma ọ bụkwanụ chewe na i kwesịrị  ikwutecha ihe niile. Ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere dị ka ịpị ngwá egwú. Ná mmalite, o nwere ike ịra gị ahụ́. Ma ka ị na-amụ ya, ọ ga-adịkwuru gị mfe, mgbalị i mere ga-abara gị ezigbo uru. Otú ọ dị, olee otú ị ga-esi amalite ụdị nkwurịta okwu ahụ?

Ọtụtụ mgbe, i nwere ike iji ihe ndị dị mfe malite. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere okwu onye ọ bụla kpụ n’ọnụ n’ụlọ akwụkwọ unu, i nwere ike ịgwa ha ihe ị ma Baịbụl kwuru banyere ya. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike ịgwa ya otu nwa klas unu. Ụzọ ọzọ ka mfe Ndị Kraịst na-eto eto sirila mee ya bụ idewe akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’elu oche ha, na-ele ma ò nwere onye ọ ga-amasị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-amasị nwa klas ha, nkwurịta okwu amalite!

N’ime ụzọ ndị ahụ e kwuru, olee nke ga-achọ ime? ․․․․․

Ò nwere ụzọ ọzọ i chetara ị ga-esi amalite ịgwa nwa klas unu ihe i kweere? Ọ bụrụ na e nwere, dee ya ebe a.

․․․․․

Mgbe ụfọdụ, ihe unu chọrọ ịmụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike ime ka i nwee ohere ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na unu amụwa ihe banyere evolushọn, gịnị ka ị ga-eme? Olee otú ị ga-esi akọwa na i kweere na e kere ihe niile eke?

 Otú Ị Ga-esi Akọwa na E Kere Ihe Niile Eke

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ryan kwuru, sị: “Mgbe anyị na-amụ banyere evolushọn, ihe a kụziiri anyị dị nnọọ iche n’ihe m mụtara na Baịbụl. Otú e si kụzie ya mere ka o yie eziokwu, meekwa ka m ghara inwe ọnụ okwu.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Raquel kwuru ihe yiri ya. O kwuru, sị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe onye na-akụziri anyị ihe ọmụmụ social studies kwuru na n’ụbọchị ọzọ, ihe anyị ga-amụ bụ evolushọn. Ama m na m ga-anọrịrị na klas kọwaa ihe m kweere banyere okwu a na-akpatakarị arụmarụ.”

Olee otú ọ na-adị gị ma onye nkụzi unu malite ịkụzi evolushọn na klas unu? I kweere na ọ bụ Chineke “kere ihe niile.” (Mkpughe 4:11) Ebe ọ bụla i lere anya, ị na-ahụ ihe na-egosi na e ji amamihe kee ihe niile. Ma akwụkwọ unu ji amụ ihe na onye nkụzi unu kwuru na mmadụ si n’enwe pụta. I nwere ike na-eche ma ì rijuola afọ ịrụ “ndị ọkachamara” ụka.

Ka obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị bụ onye na-ekwetaghị n’ozizi evolushọn. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ekweghị na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ.

N’agbanyeghị nke ahụ, ị chọọ ịkọwa na i kweere na e kere ihe niile eke, i kwesịrị ịma ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie banyere  ya. Ọ baghị uru ka gị na ha rụwa ụka n’ihe Baịbụl na-ekwughị hoo haa. Legodị ihe atụ ndị a.

Akwụkwọ anyị ji amụ sayensị kwuru na ụwa na mbara igwe anọọla ọtụtụ ijeri afọ. Baịbụl kwuru na Chineke ekeela eluigwe na ụwa tupu ụbọchị nke mbụ ọ malitere ike ihe. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ụwa na mbara igwe anọọla ọtụtụ ijeri afọ.—Jenesis 1:1.

Onye nkụzi anyị kwuru na o nweghị ike ịbụ na e ji ụbọchị isii nkịtị kee ụwa. Baịbụl ekwughị na ụbọchị nke ọ bụla n’ime ụbọchị isii ahụ Chineke ji kee ihe bụ awa iri abụọ na anọ.

Na klas anyị, a gwara anyị ụzọ dị iche iche ụmụ anụmanụ na mmadụ sirila gbanwee. Baịbụl kwuru na Chineke kere ihe ndị dị ndụ “n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 1:20, 21) Ọ kwadoghị na ndụ si n’ihe na-adịghị ndụ pụta, ma ọ bụkwanụ na Chineke kere naanị otu mkpụrụ ndụ, mkpụrụ ndụ ahụ amalitezie ịgbanwe, mee ka e nwee ihe niile dị ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ike inwe mgbanwe dị iche iche ‘n’ụdị’ nke ọ bụla. N’ihi ya, otú Baịbụl si kwuo okwu gosiri na e nwere ike inwe ụdị dị iche iche n’ime otu ‘ụdị’ ihe e kere eke.

N’ihi ihe e kwuru n’isiokwu a, olee ihe ị ga-agwa onye nkụzi unu ma ọ bụ nwa klas unu ma o kwuo, sị:

 “Sayensị egosila na anyị si n’enwe pụta.” ․․․․․

“Ekweghị m na Chineke n’ihi na anaghị m ahụ ya anya.” ․․․․․

Ka Obi Sie Gị Ike n’Ihe I Kweere!

Ọ bụrụ na a mụrụ gị n’ezinụlọ Ndị Kraịst, o nwere ike ịbụ na ihe mere i ji kweta na ọ bụ Chineke kere ihe niile bụ na ọ bụ ihe a kụziiri gị. Ugbu a ị na-eto, i kwesịrị iji ‘ike iche echiche gị’ na-efe Chineke, marakwa ihe mere i ji kwere n’ihe i kweere. (Ndị Rom 12:1) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile?’ Otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ aha ya bụ Sam chebaara otú ahụ́ mmadụ dị echiche. O kwuru, sị: “Ihe niile zuru ezu ma dị mgbagwoju anya. Akụkụ ahụ́ niile na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. O nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na ahụ́ mmadụ pụtaara onwe ya n’enweghị onye kere ya!” Otu  nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Holly kwetara ihe ahụ Sam kwuru. Ọ sịrị: “Kemgbe m chọpụtara na m na-arịa ọrịa shuga, amụtala m ọtụtụ ihe banyere otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, e nwere obere ihe na-adị n’okpuru afọ mmadụ a na-akpọ anyịnya. Otú o si eme ka ọbara na ihe ndị ọzọ dị n’ahụ́ mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma dị egwu.”

N’ebe a, dee ihe atọ mere i ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

I kwesịghị ime ihere n’ihi na i kweere na Chineke nakwa na ọ bụ ya kere ihe niile. N’ihi ihe àmà e nwere, ọ bara uru ikweta na e ji amamihe kee anyị bụ́ ụmụ mmadụ.

A sị ka e nyochawa ya, ọ bụ ozizi evolushọn na-eme ka mmadụ kwere n’ihe na-enweghị isi na ọdụ, ọ bụghị okike. O yiri ikwere n’ọrụ ebube ma ghara ikwe na e nwere onye rụrụ ya! Ọ bụrụhaala na i jiri ike iche echiche gị leba okwu a anya nke ọma, obi ga-esikwu gị ike ịgwa ndị ọzọ ihe mere i ji kwere na Chineke.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ị na-ahụ ka a na-eme ụmụaka ibe gị baptizim. Ị̀ dịla njikere ka e mee gị baptizim?

AMAOKWU BAỊBỤL

Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.Ndị Rom 1:16.

NDỤMỌDỤ

Lezie anya n’otú i si eme mgbe ị na-agwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ọ bụrụ na ihere na-eme gị, o nwere ike ime ka ụmụaka ibe gị chịwa gị ọchị. Ma i kwuo okwu ka onye ihe doro anya—otú ahụ ụmụ klas unu na-eme ma ha kwuwe ihe ha chere—i nwere ike ime ka ha na-akwanyere gị ùgwù.

Ị̀ MA NA . . . ?

Mgbe ụfọdụ a gwara ndị nkụzi ka ha kwuo ihe mere ha ji kwere n’ozizi evolushọn, ha na-achọpụta na ha anaghị ekwuli ya. Ha na-achọpụtakwa na ihe mere ha ji kwere na ya bụ na ọ bụ ihe a kụziiri ha.

IHE M GA-EME!

Ka m nwee ike ime ka mụ na nwa klas anyị kwurịta ihe dị na Baịbụl, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na a jụọ m ihe mere m ji kwere na e nwere Onye kere ihe niile, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị gwa ndị ọzọ ihe i kweere?

● N’ụlọ akwụkwọ unu, olee ụzọ ụfọdụ ga-adịrị gị mfe ị ga-esi kọwaa ihe mere i ji kwere na e kere ihe niile eke?

● Olee otú ị ga-esi egosi na ị na-ekele Onye kere ihe niile?—Ọrụ 17:26, 27.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 299]

“Ụlọ akwụkwọ bụ ókèala anyị ebe naanị anyị nwere ike izi ozi ọma.”—Iraida

[Foto dị na peeji nke 298]

Ịgwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere dị ka ịpị ngwá egwú. A na-eji nkà eme ha abụọ—ka ị na-eme ya mgbe niile, ọ ga na-edokwu gị anya

[Foto dị na peeji nke 300 na 301]

Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere, i nwere ike imeri ya