Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?

Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?

 ISI NKE 35

Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?

Ihe Mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Jeremy mere ka ọ mụta na ịbụ enyi Chineke bara uru. O kwuru, sị: “Papa m hapụrụ ezinụlọ anyị mgbe m dị afọ iri na abụọ. N’otu abalị, anọ m n’ihe ndina m na-arịọ Jehova ka o mee ka papa m lọghachi.”

N’oge ahụ obi na-adịghị Jeremy mma, ọ malitere ịgụ Baịbụl. Mgbe ọ gụtara Abụ Ọma 10:14, o metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. Amaokwu ahụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ bụ gị ka onye ihe ọjọọ dabaara, bụ́ nwa na-enweghị nna, na-enyefe onwe ya. Gị onwe gị bụ onye na-enyere ya aka.” Jeremy kwuru, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ọ̀ bụ m ka Jehova na-agwa okwu ahụ, na-eme ka m ghọta na ya bụ onye na-enyere m aka; na ya bụ Papa m. Ò nwere papa ọzọ m ga-enwe ga-aka ya?”

 MA Ị̀ nọ n’ọnọdụ yiri nke Jeremy ma ọ bụ na ị nọghị, Baịbụl kwuru na Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. N’eziokwu, Baịbụl kwuru, sị: ‘Bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa gị nso.’ (Jems 4:8) Chegodị echiche ihe okwu ahụ pụtara: N’agbanyeghị na i nweghị ike ịhụ Jehova Chineke anya, o nweghịkwa otú gị na ya si hara, ọ na-agwa gị ka ị bụrụ enyi ya!

Ma ka gị na Chineke nwee ike ịbụ enyi, ị ga-etinye mgbalị. Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na i nwere okooko osisi na-eto n’ime ụlọ, ị ma na ọ naghị eto ma é lekọtaghị ya. Ị chọọ ka ọ na-eto nke ọma, ị ga na-agba ya mmiri mgbe niile, ma dewe ya ebe dị mma ọ ga-anọ na-eto. Ọ bụ otú ahụ ka ị ga-esi agbalị ma ị chọọ ka gị na Chineke bụrụ enyi. Olee otú ị ga-esi eme ka enyi gị na ya sie ike?

Uru Ịmụ Baịbụl Bara

Ige ntị na ikwurịta okwu bụ ihe abụọ dị mkpa ga-eme ka mmadụ abụọ bụrụ enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma mmadụ chọọ ka ya na Chineke bụrụ enyi. Otú anyị si ege ntị n’ihe  Chineke na-agwa anyị bụ ịgụ na ịmụ Baịbụl.—Abụ Ọma 1:2, 3.

N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ị naghị enwecha mmasị n’ịmụ ihe. Ọ na-akara ọtụtụ ndị na-eto eto mma ile TV, igwu egwuregwu kọmputa ma ọ bụ iso ndị enyi ha kpapụ kama ịmụ ihe. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ị ga-emerịrị ihe o kwuru. I kwesịrị ịmụ Okwu ya ma ọ bụrụ na ị ga-ege ya ntị.

Ma, echegbula onwe gị. Ịmụ Baịbụl ekwesịghị ịbụrụ gị ibu. I nwere ike ime ka ọ na-atọ gị ụtọ—a sịgodị na i chere na ị bụghị onye akwụkwọ. Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ iwepụta oge ị ga-eji na-amụ ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lais kwuru, sị: “Enwere m oge m ji amụ ihe. Ihe mbụ m na-eme kwa ụtụtụ bụ ịgụ otu isiakwụkwọ Baịbụl.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Maria kwuru oge ọzọ o ji agụ nke ya. Ọ sịrị: “Ana m agụtụ Baịbụl kwa abalị tupu mụ ehie ụra.”

Ị chọọ ịmalite ọmụmụ Baịbụl nke gị, lee ihe e dere na  peeji nke 292. N’okpuru ebe a, dee mgbe ị ga-ewepụta ihe dị ka nkeji iri atọ ị ga-eji amụ Okwu Chineke.

․․․․․

Ide oge ị ga-eji amụ ya ka bụ mmalite. Ị malitehaala ịmụ  Baịbụl, i nwere ike ịchọpụta na ịghọta ya anaghị adị mfe mgbe niile. I nwere ike ikweta ihe otu nwata nwoke dị afọ iri na otu aha ya bụ Jezreel ji obi ya niile kwuo. Ọ sịrị: “Ebe ụfọdụ na Baịbụl na-esi ike nghọta, ọ naghịkwa atọ ụtọ.” Ọ bụrụ otú ọ na-adị gị, jisie ike. Mgbe ọ bụla ị mụwara Baịbụl, were oge ahụ dị ka oge i ji na-ege enyi gị bụ́ Jehova Chineke ntị. Ihe ị ga-eme ka ịmụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ ma baara gị uru bụ ịgbalịsi ike na-amụ ya!

Ekpere Dị Mkpa

Ekpere bụ ụzọ anyị si agwa Chineke okwu. Chegodị echiche otú ekpere si bụrụ onyinye magburu onwe ya! I nwere ike ịkpọku Jehova Chineke mgbe ọ bụla ma n’ehihie ma n’abalị. Ọ dị njikere ige gị ntị mgbe niile. Nke ka nke, ọ chọrọ ịnụ ihe ị ga-agwa ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gbaa gị ume, sị: ‘N’ihe niile, jiri ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe ị na-arịọ.’—Ndị Filipaị 4:6.

Dị ka e kwuru n’amaokwu ahụ, e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ịgwa Jehova. I nwere ike ịgwa ya nsogbu gị na ihe na-echegbu gị. Ihe ndị ọzọ i nwere ike ịgwa ya bụ ihe ndị o meere gị. A sị ka e kwuwe, ọ̀ bụ na ị naghị ekele ndị enyi gị ma ha meere gị ihe ọma? I nwekwara ike ikele Jehova maka ihe ọma ndị o meere gị, bụ́ ihe enyi gị ọ bụla na-enweghị ike imere gị.—Abụ Ọma 106:1.

N’okpuru ebe a, dee ihe ụfọdụ Jehova meere gị mere i ji na-ekele ya.

․․․․․

 O doro anya na mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ga na-echu gị ụra. Abụ Ọma 55:22 kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”

 N’okpuru ebe a, dee ihe ụfọdụ na-enye gị nsogbu ị chọrọ ịgwa Jehova n’ekpere.

․․․․․

Ahụmahụ

E nwere ihe ọzọ ị na-ekwesịghị ichefu n’enyi gị na Chineke bụ. Devid bụ́ ọbụ abụ dere, sị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.” (Abụ Ọma 34:8) Mgbe Devid dere abụ nke iri atọ na anọ ahụ, ọ ka si ná nsogbu gaara ata isi ya pụta. Ọ nọ na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl ghara igbu ya—nke bụkwanụ ezigbo nsogbu n’onwe ya. Ma, ọ gbagara n’obodo ndị iro ya bụ́ ndị Filistia. Mgbe Devid chọpụtara na a gawala igbu ya, ọ kpachaara anya mee ka onye ara, sikwa otú ahụ lagbụrụ.—1 Samuel 21:10-15.

Devid ekwughị na ihe mere o ji lagbụrụ bụ na ya ma ihe. Kama, o kelere Jehova maka ya. Tupu ya edee Abụ Ọma 34:8 ahụ, o dere, sị: “Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m, ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.” (Abụ Ọma  34:4) N’ihi ya, ọ bụ ihe ahụ mere Devid mere o ji gwa ndị mmadụ ka ha ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ *

Ì nwere ike icheta otu ihe metụrụla ná ndụ gị nke na-egosi na Jehova na-elekọta gị? Ya bụrụ otú ahụ, dee ya n’okpuru ebe a. Echela na ọ ga-abụrịrị ọrụ ebube. I nwere ike icheta ihe ọma na-emere ndị mmadụ kwa ụbọchị, nke ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ihe ndị mmadụ na-anaghị eji akpọrọ ihe.

․․․․․

Ma eleghị anya, papa gị na mama gị akụzierela gị Baịbụl. Ya bụrụ otú ahụ, nke gị ka mma. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị ime ka gị na Chineke bụrụ enyi. Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, i nwere ike iji ihe e kwuru n’isiokwu a malite. Jehova ga-agọzi mgbalị i mere. Baịbụl kwuru, sị: ‘Na-arịọ, a ga-enye gị; na-achọ, ị ga-achọta.’—Matiu 7:7.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 38 NA NKE 39

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ̀ na-esiri gị ike ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke? Chọpụta ihe ga-eme ka obi sie gị ike ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 24 Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ‘detụ ire ma hụ’ bụ “jiri aka gị chọpụtara onwe gị.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

AMAOKWU BAỊBỤL

Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.Matiu 5:3.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ị gụọ ihe dị ka peeji anọ na Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-agụcha Baịbụl dum n’ihe dị ka otu afọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọgụgụ ị na-agụ akwụkwọ a ma na-eme ihe si na Baịbụl e dere na ya na-egosi na Jehova hụrụ gị n’anya.—Jọn 6:44.

IHE M GA-EME!

Ka m nwee ike iritekwu uru na Baịbụl m na-amụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ka m nwee ike ịna-ekpechikwu ekpere anya, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee ihe ị ga-eme ka ọmụmụ Baịbụl gị na-atọkwu gị ụtọ?

● Gịnị mere Jehova ji ege ntị n’ekpere ụmụ mmadụ na-ezughị okè?

● Olee otú ị ga-esi eme ka ekpere gị ka mma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 291]

“Mgbe m ka dị obere, ana m ekwukarị otu ihe mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere. Ugbu a, ana m agbalị itinye ihe ọma na ihe ọjọọ ndị mere n’ụbọchị n’ekpere. Ebe ọ bụ na ụbọchị niile anaghị abụ otu, ọ na-eme ka m ghara ịna-ekwu otu ihe mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere.”—Eve

 [Igbe na Foto dị na peeji nke 292]

 Otú Ị Ga-esi Agụ Baịbụl

1. Họrọ otu akụkọ ị chọrọ ịgụ na Baịbụl. Kpekuo Chineke ekpere ka o nye gị amamihe ị ga-eji aghọta ya.

2. Meda obi gụọ akụkọ ahụ. Agbala ya ọsọ. Mgbe ị na-agụ ya, jiri anya nke uche gị na-ahụ ihe ị na-agụ. Were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme, ya bụ, gbalịa ịhụ ihe na-emenụ, ịnụ olu ndị na-ekwu okwu n’akụkọ ahụ, ịnụ ísì ihe dị n’ebe ahụ, ịnụ ụtọ nri e kwuru okwu ya n’ebe ahụ na ihe ndị ọzọ. Gbalịa mee ka akụkọ ahụ dị gị ka ihe na-eme mgbe ahụ!

3. Chebara ihe ị gụrụ mgbe ahụ echiche. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

● Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee akụkọ a n’Okwu ya?

● Olee ndị e kwesịrị iṅomi n’akụkọ a, oleekwa ndị bụ́ ihe atụ ịdọ aka ná ntị?

● Olee ihe bara uru m kwesịrị ịmụta n’akụkọ a m gụrụ?

● Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m banyere Jehova na otú o si eme ihe?

4. Kpekuo Jehova ekpere dị nkenke. Gwa ya ihe ị mụtara n’akụkọ ahụ ị gụrụ na Baịbụl na otú ị chọrọ isi eme ya eme. Na-ekele Jehova mgbe niile maka onyinye o nyere gị, nke bụ́ Okwu ya bụ́ Baịbụl Nsọ!

[Foto]

“Okwu gị bụ oriọna nke na-enye ụkwụ m ìhè, bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ m.” —Abụ Ọma 119:105.

[Igbe na Foto dị na peeji nke 294]

Kpebie Ihe Kacha Mkpa

Ị̀ na-enwe efe ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl? Ọ bụrụ na ị naghị enwe efe, ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihe i weere dị ka ihe kacha mkpa.

Megodị ihe a: Were otu bọket, tinye ya ụfọdụ nkume buru ibu. Wụjuo bọket ahụ ájá. Ihe juziri bọket ahụ bụ nkume na ájá.

Ugbu a, wụpụ nkume ndị ahụ na ájá ahụ n’ala, ma dewe ha otu ebe. Mee ihe ahụ i mere mbụ n’ụzọ ọzọ: Buru ụzọ wụjuo ájá na bọket ahụ, gbalịzie itinye nkume ndị ahụ n’ime ya. Ọ̀ kwa ha abaghị na bọket ahụ? Ihe kpatara ya bụ na i bu ụzọ wụnye ájá na bọket ahụ ugbu a.

Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Ọ bụrụ na i buru ụzọ na-eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa dị ka ntụrụndụ, ọ ga-adị gị ka i nweghị oge ị ga-eji eme ihe ndị kacha mkpa, ya bụ, ihe gbasara ofufe Chineke. Ma ọ bụrụ na i mee ihe ahụ Baịbụl kwuru, ị ga-ahụ na ị ga-enwe oge ị ga-eji eme ma ihe gbasara ofufe Chineke ma inwe ntụrụndụ. Ihe ka mkpa bụ ihe i bu ụzọ tinye na bọket gị!

[Foto dị na peeji nke 290]

Otú ahụ e si elezi okooko osisi na-eto n’ime ụlọ anya, ọ bụ otú ahụ ka mmadụ ga-esi eme ka enyi ya na Chineke bụ sie ike