Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-eme Ahụ́ M?

Gịnị Na-eme Ahụ́ M?

 ISI NKE 6

Gịnị Na-eme Ahụ́ M?

“Etoro m ogologo ngwa ngwa. O nyere m nsogbu. N’agbanyeghị na ọ na-eme m obi ụtọ na m na-etokwu ogologo, mgbe ụfọdụ, ụta ngwere na-ejide m n’ụkwụ. Ọ na-ewe m iwe!”—Paul.

“Ị ma na ahụ́ gị na-agbanwe, gị echee na ọ dịghị onye ma. Ma, otu ụbọchị, mmadụ ejiri egwuregwu gwa gị na ‘úkwù gị hazi ka nke nne nwaanyị’—ya adị gị ka ala mepee ka ị dakpuo!”—Chanelle.

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i so ezinụlọ unu kwaga ebe ọzọ? Ọ dịghịrị gị mfe, ọ̀ kwa eziokwu? N’ezie, ị hapụrụ ihe niile mara gị ahụ́, ya bụ, ụlọ unu, ụlọ akwụkwọ unu, na ndị enyi gị. Ma eleghị anya, o were gị oge tupu ebe ọhụrụ ahụ amara gị ahụ́.

N’oge a ị ghọwara okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, ya bụ,  ugbu a i ruwara ihe e ji mmadụ eme, ị ga-amalite ịhụ mgbanwe n’ahụ́ gị, nke bụ́ otu n’ime mgbanwe kachanụ mmadụ na-enwe ná ndụ. E nwere ike ikwu na ị na-akwaga “n’ebe” ọhụrụ. N’eziokwu, ọ na-eme obi ụtọ! Ma, ịghọ dimkpa nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ịratụ gị ahụ́ tupu ya amara gị ahụ́. Olee ihe na-eme n’ahụ́ gị n’oge obi ụtọ a nke na-ara gị ahụ́?

Mgbanwe Ụmụ Nwaanyị Na-enwe

Ị ga-amalite ịhụ ọtụtụ mgbanwe n’oge a ị ghọwara agbọghọbịa. A ga-ahụ ụfọdụ n’ime mgbanwe ndị ahụ anya. Dị ka ihe atụ, mmiri ọgwụ ahụ́ a na-akpọ hormone ga-eme ka ị gbaa ajị n’ihe i ji bụrụ nwaanyị. Ị ga-amalitekwa kpụwa ara. Úkwù gị, apata ụkwụ gị, na ikè gị ga-ebukwu ibu. Ị gaghịzi enwe ahụ́ nwatakịrị, kama ahụ́ gị ga-amalite ịdị ka nke nne nwaanyị. Echegbula onwe gị, ọ bụ otú o kwesịrị ịdị. Ọ na-egosikwa na ahụ́ gị na-ejikere maka oge ị ga-amụ nwa n’ọdịnihu!

Ka oge na-aga, ị ga-amalite ịhụ nsọ gị. Ọ bụrụ na ị dịchaghị njikere, mgbanwe a ị ga-ahụ n’ahụ́ gị nwere ike imenye gị ụjọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Samantha kwuru, sị: “Mgbe m malitere ịhụ nsọ m, amaghị m ihe m ga-eme. Onwe m sọwara m oyi. M gaa ịsa ahụ́, m na-eji sapo ekwo n’ahụ́ m, na-eche na eruru m unyi. M cheta  na m ga na-ahụ nsọ m kwa ọnwa ruo ọtụtụ afọ, ụjọ atụwa m!”

Chetakwa na nsọ ahụ ị na-ahụ na-egosi na i toruwela ịmụ nwa. N’agbanyeghị na ị ka ga-anọ ọtụtụ afọ tupu gị achọwa ịbụ nne nwa, i ruwela ihe e ji nwaanyị eme. Ma, mgbe ị hụwara nsọ gị, i nwere ike na-echegbu onwe gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kelli kwuru, sị: “Nke na-akacha enye m nsogbu bụ otú obi na-adị m. Ọ naghị edo m anya ihe mere m ga-eji nwechaa obi ụtọ n’ehihie, e ruzie n’abalị, ya afọ ntakịrị ka m bepụta ọbara.”

Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị ugbu a, nwee ndidi. Ọ ga-emecha mara gị ahụ́. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Annette kwuru, sị: “Echetara m mgbe m mechara ghọta na ọ bụ ya ga-eme ka m toruo ihe e ji nwaanyị eme, nakwa na ihe mere o ji eme m bụ na ọ bụ onyinye Jehova nyere m nke ga-eme ka m nwee ike ịmụ nwa. Ọ na-ewe oge tupu mmadụ aghọta na ọ bụ eziokwu, ọ na-esikwara ụfọdụ ụmụ agbọghọ ike ikweta; ma ka oge na-aga, ọ ga-emecha mara gị ahụ́.”

Ị̀ hụwala ụfọdụ mgbanwe ndị ahụ n’ahụ́ gị? Dee ajụjụ ndị ị chọrọ ịjụ gbasara mgbanwe ị na-ahụ n’ahụ́ gị n’ebe a.

․․․․․

Mgbanwe Ụmụ Nwoke Na-enwe

Ọ bụrụ na ị bụ nwata nwoke, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-ahụ n’ahụ́ gị mgbe ị ghọwara nwa okorobịa. Dị ka ihe atụ, ahụ́  gị ga na-abụ mmanụ mmanụ, nke ga-eme ka pịmpụl na ihe yiri ọkọ na-apụta gị n’ihu. * Otu nwa okorobịa aha ya bụ Matt kwuru, sị: “Inwe pịmpụl ndị a na-eme m obi ọjọọ. Ọ bụ ọgụ na mgba, ya bụ, gị na ya ga na-alụ ezigbo ọgụ. Ị maghị ma ọ̀ ga-ala ala, ma ọ̀ ga-atụkasị gị kpọm kpọm n’ihu, ma ọ bụkwanụ mee ka ndị mmadụ ghara ịna-akwanyere gị ùgwù.”

Otú ọ dị, ọ bụghị ihe niile ị na-ahụ n’ahụ́ gị dị njọ. I nwere ike ịchọpụta na ị na-agbazi dimkpa, na-esikwu ike, ubu gị ana-asa mbara. Ọzọkwa, n’oge ahụ, i nwere ike ịgba ajị ụkwụ, ajị obi, ajị agba nakwa ajị mkpaabụ. Ma, ọ bụghị otú ị gbaruru ajị ga-egosi na ị bụ nwoke; ọ na-esi n’ọbara.

N’oge a, ihe nwere ike na-adapụnahụ gị ebe ọ bụ na akụkụ ahụ́ gị niile anaghị eto n’otu mgbe. I nwere ike na-eme ka onye ọkpụkpụ na-adịghị n’ahụ́. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Dwayne sịrị na ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ụbụrụ ya na-ekwu ihe ọzọ, aka ya na ụkwụ ya ana-eme ihe ọzọ.

Mgbe ị ka dị ihe dị ka afọ iri na isii, olu gị ga-amalite ịda ka olu dimkpa, ma ọ ga-abụ nwayọọ nwayọọ. Mgbe ụfọdụ, akpịrị nwere ike na-atachi gị, olu agụọ gị, nke nwere ike ime ka ahụ́ ghara iru gị ala. Ma, echegbula onwe gị.  Ka oge na-aga, olu gị ga-adazi. Ka ọ dịgodị, ịchị onwe gị ọchị ga-eme ka ahụ́ rutụ gị ala.

Ka ị na-aghọ okorobịa, ihe i ji bụrụ nwoke ga-ebu ibu, gbaakwa ajị gburugburu ya. Ọ ga-amalite inwe ọbara ọcha. Ọbara ọcha na-adị mmiri mmiri. O nwere ọtụtụ nde irighiri ihe ndị nwere ike ịtụwa nwaanyị ime. A na-anyụpụta ha mgbe a na-enwe mmekọahụ. Ọbara ọcha na àkwá dị n’ahụ́ nwaanyị na-agwakọta, mee ka nwaanyị tụrụ ime ma mụọ nwa.

Ahụ́ gị na-emepụta ọbara ọcha. Ahụ́ gị na-agbari ụfọdụ, ma site n’oge ruo n’oge, i nwere ike ịnyụpụ ụfọdụ mgbe ị na-ehi ụra abalị. Ihe dị otú ahụ abụghị ọrịa. Baịbụl kwudịrị okwu banyere ya. (Levitikọs 15:16, 17) O gosiri na ihe i ji bụrụ nwoke kwụ chịm, gosikwa na i ruwela ihe e ji nwoke eme.

Ị̀ hụwala ụfọdụ mgbanwe ndị ahụ n’ahụ́ gị? Dee ajụjụ ndị ị chọrọ ịjụ banyere mgbanwe ị na-ahụ n’ahụ́ gị n’ebe a.

․․․․․

Idi Ihe Ọhụrụ Ndị Na-abata Gị n’Obi

Ka ahụ́ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ na-agbanwe, ha na-ahụ ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha karịa otú ha na-ahụbu. Nwa okorobịa ahụ aha ya bụ Matt kwuru, sị: “Mgbe m ruwere ihe e ji nwoke eme, m malitere ịhụ ọtụtụ ụmụ agbọghọ bụ́ asampete. Ọ gbawara m obi n’ihi na amatara m na m gaghị emetụ ha aka ruo mgbe m tokwuru.” Isi nke 29 n’akwụkwọ a ga-elebakwu anya n’ihe i kwesịrị ime banyere mmekọahụ na-agụ gị mgbe ị na-etolite.  Ka ọ dịgodị, i kwesịrị ịghọta na ọ dị mkpa ka ị mụta otú ị ga-esi na-ejide onwe gị. (Ndị Kọlọsi 3:5) N’agbanyeghị na o yiri ihe siri ike, i nwere ike ikpebi ijide onwe gị!

E nwere ihe ndị ọzọ ị ga-edi ka ị na-eru ihe e ji nwoke eme. Dị ka ihe atụ, ọ dị mfe onwe gị ịgbụ gị. Owu na-amakarị ndị na-eto eto, ike ụwa na-agwụkwa ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, ọ ga-adị mma ka ị gwa papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụ onye ọzọ toro eto ị tụkwasịrị obi. Dee aha onye toro eto i nwere ike ịgwa otú obi dị gị:

․․․․․

Ụdị Uto Kacha Mkpa

Uto kacha mkpa abụghị otú i toruru ogologo, otú ahụ́ gị ma ọ bụ ihu gị dị, kama ọ bụ ụdị onye ị bụ, ya bụ, otú i si eche echiche, otú i si eme omume, na nke ka nke, otú mmekọrịta gị na Chineke dị. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọrọ dimkpa, ahapụwo m omume  nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Ihe amaokwu a na-akụzi doro anya. Ogologo abụghị na nwa m etoola. Omume gị, okwu gị, na otú i si eche echiche ga-egosi na i toola. Ekwela ka mgbanwe ị na-ahụ n’ahụ́ gị na-echu gị ụra nke ga-eme ka i chefuo mmadụ ị bụ n’ime!

Chetakwa na Chineke “na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Baịbụl kwuru na Eze Sọl toro ogologo, maakwa mma, ma, ọ bụ onye ọjọọ, ọchịchị ya adịghịkwa mma. (1 Samuel 9:2) Ma, Zakịọs “dị obere.” N’agbanyeghị nke ahụ, o mere ka dimkpa, gbanwee àgwà ya ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Luk 19:2-10) O doro anya na ihe kacha mkpa bụ ihe mmadụ bụ n’ime.

Ihe doro anya bụ na, ị gaghị emeli ka i too ngwa ngwa ma ọ bụ mee ka ị ghara ito ngwa ngwa. N’ihi ya, kama ikwe ka mgbanwe ndị ahụ mee ka obi na-ajọ gị njọ ma ọ bụ mee ka ụjọ na-atụ gị, jiri obi ụtọ na ọṅụ nabata ha. Mgbanwe ndị ahụ abụghị ọrịa, ị bụghị onye mbụ na-enwe ha. Nwee obi ike na o nweghị ihe ọ ga-eme gị. Mgbe mgbanwe ndị ahụ gafere, ị ga-aghọ dimkpa!

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na otú ị dị n’enyo adịghị gị mma? Gịnị ga-enyere gị aka ịma otú i kwesịrị ịdị?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ na-emekwa ụmụ agbọghọ. Ọ bụrụ na ị na-ete ezigbo mmanụ, ha nwere ike ịla.

AMAOKWU BAỊBỤL

M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.Abụ Ọma 139:14.

NDỤMỌDỤ

Ka ahụ́ gị na-agbanwe, kpachara anya ka ị ghara iyi uwe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Na-eyi uwe ndị na-egosi “imeru ihe n’ókè na uche zuru okè” mgbe niile.—1 Timoti 2:9.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ahụ́ nwata nwoke ma ọ bụ nwata nwaanyị nwere ike ịmalite ịgbanwe mgbe ọ dị ihe dị ka afọ asatọ, afọ iri na anọ ma ọ bụkwanụ karịa. Afọ ụmụaka na-anọ ahụ́ ha amalite ịgbanwe anaghị abụ otu.

IHE M GA-EME!

Ka m na-aghọ dimkpa, àgwà m kwesịrị imezi karịchaa bụ ․․․․․

Ka mmekọrịta mụ na Chineke ka mma, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere o ji esiri mmadụ ike idi mgbanwe ọ na-enwe n’ahụ́ ya nakwa n’àgwà ya?

Olee ihe ị chọpụtara kacha esi ike n’oge ahụ?

Gịnị mere ịhụnanya ị hụrụ Chineke nwere ike iji na-ajụ oyi mgbe ị na-eto eto, ma gịnị ka ị ga-eme ka nke ahụ ghara ime?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 61]

“E nwere ọtụtụ nsogbu ndị na-eto eto na-enwe, ị maghịkwa otú ahụ́ gị ga-emecha dịrị. Ma ka ị na-eto, mgbanwe ndị ahụ ga-amara gị ahụ́.”—Annette

 Igbe dị na peeji nke 63 na 64]

Olee Otú M Ga-esi Agwa Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Okwu Gbasara Mmekọahụ?

“Ọ bụrụ na mụ enwee ihe m chọrọ ịma gbasara mmekọahụ, agaghị m ajụ ndị mụrụ m.”—Beth.

“Obi agaghị aka m ikwu ụdị ihe ahụ.”—Dennis.

Ọ bụrụ na ị dị ka Beth ma ọ bụ Dennis, ị nọ ná nsogbu. Ị chọrọ ịma banyere mmekọahụ, ma ndị ga-agwa gị eziokwu banyere ya nwere ike ịbụ ndị ị na-achọghị ịjụ, ya bụ, ndị mụrụ gị! Ọtụtụ ihe na-echu gị ụra:

Gịnị ka ndị mụrụ m ga-eche banyere m?

“Achọghị m ka ha lewe m anya ọjọọ n’ihi ajụjụ m jụrụ ha.”—Jessica.

“Ha chọrọ ka ị bụrụ nwata mgbe niile n’amaghị ihe ọ bụla gbasara mmekọahụ, ụbọchị i mepere ọnụ gwa ha okwu banyere mmekọahụ, ha asị na i mebiwala.”—Beth.

Olee ihe ha ga-eme?

“Ụjọ na-atụ m na papa m na mama m agaghị echere ka m kwuchaa tupu ha abawara m mba.”—Gloria.

“Papa m na mama m anaghị ezo ọnụ, n’ihi ya, anaghị m achọ ime ihe ga-eme ka ha gbarụọ ihu. N’eziokwu, m kwuwe ụdị ihe ahụ, papa m nwere ike na-eche otú ọ ga-esi agụrụ m Baịbụl.”—Pam.

Hà ga-aghọtahie ihe mere m ji jụọ ha?

“Iwe nwere ike iwe ha, ha ajụwa m ajụjụ ndị dị ka, ‘Ọ̀ dịla onye gwara gị ka gị na ya nwee mmekọahụ?’ ma ọ bụ ‘Ndị ọgbọ gị hà na-agwa gị ka i nwee mmekọahụ?’ Ma o nwere ike ịbụ naanị na ị na-ajụ ka ị mara.”—Lisa.

“M kwuwe okwu kwute nwa okorobịa, ụjọ abịa papa m. Ya agwawazie m banyere mmekọahụ. M ga na-ekwu n’obi m, sị, ‘Papa, ihe m kwuru bụ naanị na ọ mara mma. Ekwughị m na m chọrọ ịlụ ya ma ọ bụ na mụ na ya ga-enwe mmekọahụ!’”—Stacey.

 Obi nwere ike ịdị gị ụtọ ịmara na o nwere ike ịbụ na ihere na-eme ndị mụrụ gị ịkọrọ gị banyere mmekọahụ otú ahụ ihere na-eme gị ịkọrọ ha! O nwere ike ịbụ ihe mere otu nchọpụta e mere ji gosi na ihe dị ka mmadụ asaa n’ime ndị nne na nna iri kwuru na ha agwala ụmụ ha ihe banyere mmekọahụ, ma naanị ihe dị ka ụmụaka anọ n’ime ụmụaka iri chetara na a gwara ha ụdị ihe ahụ.

N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ndị mụrụ gị achọghị ịgwa gị banyere mmekọahụ. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ na ndị mụrụ ha agwaghị ha ụdị ihe ahụ! N’agbanyeghị ihe kpatara ya, esirila ha ọnwụ. Ma eleghị anya, ọ bụrụ na kaa obi chọpụta otú ị ga-esi jụọ ha ya, ọ ga-abara gị na ha uru. Olee otú ị ga-esi ajụ ha?

Otú Ị Ga-esi Ajụ Ha Ya

Ndị mụrụ gị nwere amamihe dị ukwuu banyere mmekọahụ, nweekwa ọtụtụ ndụmọdụ ha ga-enye gị banyere ya. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịma otú ị ga-esi ekwulite ya. Lee ihe ị ga-eme:

1 Gwa ha hoo haa na o nwere ihe ị chọrọ ịgwa ha nke na-esiri gị ike okwukwu. “Ọ na-esiri m ike ịjụ unu ihe a n’ihi na ụjọ na-atụ m na unu nwere ike iche na . . . ”

2 Gwazie papa gị ma ọ bụ mama gị ihe mere i ji bịakwute ya. “Ma o nwere ihe m chọrọ ịjụ, ọ kaara mụ mma ka ị zaa ya karịa onye ọzọ ịza ya.”

3 Jụzie ya ihe ị chọrọ ịjụ ya. “Ihe m chọrọ ịjụ bụ . . . ”

4 Mgbe unu kwuchara, kwuo ihe ga-eme ka unu nwee ike ikwurịta ya n’oge ọzọ. “Ọ bụrụ na m nwee ajụjụ ọzọ, m̀ nwere ike ịjụ gị ya?”

Ọ bụrụgodị na ị ma na ha ga-asị ee, ịnụ mgbe ha sịrị ya ga-eme ka i nwee ike ịjụ ha ajụjụ n’oge ọzọ, meekwa ka ahụ́ rukwuo gị ala mgbe ọzọ ị chọrọ ịjụ ha ihe ọ bụla. N’ihi ya, megodị ihe ndị a e kwuru! I nwere ike ikweta ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ Trina kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe mụ na mama m na-ekwu banyere ya, echetara m na m nọ na-eche ihe medịrị m ji jụwa ya ajụwa. Ma, ugbu a, obi dị m ụtọ na mama m kọwaara m ya n’ezoghị ọnụ. Ihe ahụ ọ gwara m chebere m!”

[Foto dị na peeji nke 59]

Ịbụ nwata ma mechaa ghọọ dimkpa yiri ịkwaga n’ebe ọhụrụ—ma ọ ga-emecha mara gị ahụ́